< Ezekieli 46 >
1 Bwana Yahwe asema hivi: Lango la uzio wa ndani, linaloelekea mashariki, litafungwa kwa mda wa siku sita za kazi, lakini katika siku za Sabato litakuwa wazi, na katika siku ya mwezi mpya litafunguliwa.
“‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ọnụ ụzọ ama nke ogige ime, nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ ga-abụ ihe e mechiri emechi nʼụbọchị isii niile unu na-arụ ọrụ. Ma a ga-emeghe ya nʼụbọchị izuike, na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ.
2 Mwana wa mfalme ataingia kwa kutumia lango la njia ya nyuma ya varanda upande wa nje, na atasimama mbele ya muhimili wa mwimo wa lango la ndani wakati makuhani wakiwa wakitengeza sadaka ya kuteketezwa na sadaka ya amani. Kisha ataabudu kwenye kizingiti cha lango la ndani na kutoka nje, lakini lango halitakuwa linafungwa hadi jioni.
Nwa eze ga-esitekwa na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama bata, guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ndị nchụaja ga-edozikwa aja nsure ọkụ ya, na aja udo ya. Ọ ga-anọkwa nʼụlọ mbata kpọọ isiala nke ofufe ya, sitekwa nʼebe ahụ pụọ. Ma a gaghị emechi ọnụ ụzọ ahụ tutu ruo anyasị.
3 Watu wa nchi pia wataabudu mbele ya Yahwe kwenye hili lango la kuingilia katika siku ya Sabato na siku mpya za mwezi.
Nʼihu ọnụ ụzọ ama ka ndị ala a ga-anọ fee Onyenwe anyị ofufe nʼụbọchị izuike na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ.
4 Sadaka ya kuteketezwa ambayo mwana wa mfalme aitoayo kwa Yahwe katika siku ya Sabato itakuwa wanakondoo sita wasiokuwa na dosari na kondoo dume asiyekuwa na dosari.
Ihe nwa eze ahụ ga-eji chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ nʼụbọchị izuike na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ ga-abụ ụmụ ebule isii, na otu ebule, ndị na-enweghị ntụpọ.
5 Sadaka ya unga pamoja na kondoo dume itakuwa efa moja, na sadaka ya unga pamoja na wanakondoo kiasi awezacho kutoa, na hini moja ya mafuta pamoja na kila efa ya unga.
Ọ ga-eweta ihe e ji achụ aja mkpụrụ ọka, nke bụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu ebule. Ọ ga-ewetakwa lita mmanụ oliv asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ahụ, tinyere onyinye ụmụ atụrụ dịka o si masị ya.
6 Katika siku ya mwezi mpya atatoa ng'ombe mchanga asiyekuwa na dosari kutoka kuchungwa, wanakondoo sita, na kondoo asyekuwa na dosari.
Nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ, ọ ga-eweta otu nwa oke ehi, ụmụ atụrụ isii na otu ebule, ha niile ọ dịghị nke ga-enwe ntụpọ ọbụla.
7 Atatengeneza sadaka ya unga ya efa moja kwa ajili ya ng'ombe na efa moja kwa ajili ya kondoo, na kwa kiasi awezacho kukitoa kwa ajili ya wanakondoo, na hini ya mafuta kwa kila efa ya unga.
Ọ ga-ewetakwa otu oke ehi na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ, maka aja mkpụrụ ọka. Ọ ga-enye ebule ahụ na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ. Ọ ga-enyekwa ụmụ atụrụ ndị ahụ na ụtụ ọka dịka o si masị ya inye ha, tinyere iri lita ọka abụọ na abụọ, nke ọ ga-eweta maka lita mmanụ oliv asaa.
8 Wakati mwana wa mfalme atakapokuwa anaingia kwa njia ya lango lenye varanda, ataondoka kwa njia hiyo hiyo.
Mgbe nwa eze ga-abata nʼụlọ ahụ, ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, ebe ahụ kwa ka ọ ga-esikwa pụọ.
9 Lakini wakati watu wa nchi watakakuja kwa Yahwe katika sikukuu zilizoteuliwa, kila mmoja kuingia kupitia kwenye lango la kaskazini kuabudu ataondoka kupitia lango la kusini; na kila atakayeingillia kupitia lango la kusini atatoka kupitia lango la kaskazini. Hakuna atakayerudia kwa lile lango aliloingilia, kwa kuwa atatoka nje moja kwa moja.
“‘Ma mgbe ndị ala ahụ ga-abata nʼihu Onyenwe anyị nʼoge mmemme dị nsọ, onye ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu bata aghaghị ịpụ site nʼọnụ ụzọ nke dị na ndịda. Ndị si na ndịda bata ga-esitekwa nʼụzọ nke ugwu pụọ. Ọ dịghị onye ga-esi nʼụzọ o si bata laghachi, kama ha ga-esi ụzọ nke chere ebe ha si bata ihu pụọ.
10 Mwana wa mfalme atakuwa kati yao; watakapoingia, ataingia ndani, na watakapoondoka, atatoka nao.
Nwa eze ga-anọ nʼetiti ha, ọ bụrụ na ha abanye, ọ ga-eso ha banye, ọ bụrụkwa na ha apụwa, ọ ga-esokwa ha pụọ.
11 Kwenye sikukuu hizo, sadaka ya unga itakuwa efa moja ya unga kwa ng'ombe mmoja na efa moja kwa kondoo dume, na chochote atakacho kitoa pamoja na wanakondoo, na hini moja ya mafuta kwa kila efa.
Nʼoge mmemme ndị ahụ pụrụ iche, na mmemme ndị akara aka, ihe a ga-eji nye onyinye mkpụrụ ọka ga-abụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu oke ehi, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ na otu ebule, tinyere ụmụ atụrụ nke ọnụọgụgụ ya ga-abụ dịka o si masị ya, tinyere lita mmanụ asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ọbụla.
12 Wakati mwana wa mfalme atakapotoa sadaka atakayojisikia kutoa, labda sadaka ya kuteketezwa au sadaka ya amani kwa Yahwe, lango la kuelekea mashariki litafunguliwa kwa ajili yake. Atatoa sadaka yake ya kuteketezwa au sadaka ya amani kama afanyavyo siku ya Sabato. Kisha atatoka nje, na baada ya kutoka lango litafungwa.
“‘Mgbe ọbụla onyeisi chọrọ inye onyinye afọ ofufu, maka ịchụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ maọbụ aja udo, a ga-emeghere ya ọnụ ụzọ ime nke dị nʼọwụwa anyanwụ ka o si nʼebe ahụ bata. Ọ ga-enye onyinye ya dịka e si enye ya nʼụbọchị izuike. Emesịa, ọ ga-atụgharịa pụọ. A ga-emechikwa ụzọ ahụ mgbe ọ pụchara.
13 Kwa kuongeza, utatoa mwanakondoo asiyekuwa na dosari mwenye umri wa mwaka mmoja kama sadaka ya kuteketezwa kwa Yahwe kila siku; utafanya hivi kila asubuhi.
“‘Ọ bụ nwa atụrụ gbara otu afọ nke na-enweghị ntụpọ ka ị ga-eweta ụbọchị niile maka ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ọ bụ kwa ụtụtụ, kwa ụtụtụ ka ị ga-eweta ya.
14 Utatoa sadaka ya unga pamoja nayo kila asubuhi, efa sita na sehemu ya tatu ya hini ya mafuta kuchanganya na sadaka ya unga kwa ajili ya Yahwe, kulingana na sheria ilivyo.
Ị ga-ewetakwa onyinye mkpụrụ ọka kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ tinyere ya, ihe niile ga-emejupụta ya bụ lita ụtụ ọka isii, na lita mmanụ abụọ e ji agwakọta ya. Iche onyinye mkpụrụ ọka a nʼihu Onyenwe anyị bụ ụkpụrụ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
15 Watandaa mwanakondoo, sadaka ya kuteketezwa, na mafuta kila asubuhi, sadaka ya kuteketezwa ya kudumu.
Ya mere, ha ga-edozi nwa atụrụ na ụtụ ọka na mmanụ oliv ahụ, kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ, maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa mgbe niile.
16 Bwana Yahwe asema hivi: Kama mwana wa mfalme akitoa zawadi kwa mmoja wa watoto wake, imekuwa urithi wake. Itakuwa mali ya mtoto wake, imekuwa urithi.
“‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ọ bụrụ na onyeisi enye onye ọbụla nʼime ụmụ ya ndị ikom onyinye site nʼihe nketa ya, ihe ahụ ga-abụ nke ya, bụrụkwa nke mkpụrụ ya, ọ ga-abụ oke ha site nʼihe nketa ruo ebighị ebi.
17 Lakini kama akimpatia zawadi kutoka urithi wake kwa mmoja wa watumishi wake, kisha itakuwa ya huyo mtumishi mpaka mwaka wa uhuru, na kisha itarudi kwa mwana wa mfalme. Urithi wake yamkini ukawa kwa ajili ya watoto wake.
Ọ bụrụkwanụ na o kenye otu nʼime ndị ohu ya ala site nʼihe nketa ya, ala ahụ ga-abụ nke ohu ahụ tutu ruo nʼafọ inwere onwe, nke bụ afọ asaa ọbụla. Mgbe ahụ, ohu ahụ ga-enwere onwe ya, ma ala ahụ ga-aghọkwa nke nwa eze ahụ. Ihe nketa ya bụ nke dịịrị naanị ụmụ ya, nke ha ka ọ bụ.
18 Mwana wa mfalme hatawaondolea urithi wa watu kutoka kwenye mali zao wenyewe; ataandaa kwa ajili ya watoto wake mali ili kwamba watu wangu wasitawanyike, kila mtu kutoka mali kwenye yake mwenyewe.”
Nwa eze ahụ agaghị ewere ala ọbụla site nʼihe nketa ndị mmadụ nʼaka ike, si otu a chụpụ ha site nʼala ha. Ala ọbụla ọ na-enye ụmụ ya ga-abụrịrị ihe nketa sitere nʼala nke aka ya. Ka a ghara ime ka ọ bụladị otu nʼime ndị m bụrụ onye e kewapụrụ site nʼihe nketa ha.’”
19 Kisha yule mtu akaniletea kwenye lango la kutokea hata kwenye vyumba vitakatifu kwa ajili ya makuhani, vilivyokuwa vimeelekea kaskazini na tazama! Kulikuwa na sehemu mbele magharibi.
Mgbe nke a gasịrị, o duuru m site nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama kpọbata m nʼọnụụlọ ndị ahụ dị nsọ, nke chere ihu nʼugwu, nke bụ ihe nketa ndị nchụaja. O gosiri m otu ebe dị na nsọtụ akụkụ ọdịda anyanwụ.
20 Akanambia, “Hii ndio sehemu ambayo makuhani watakapo chemshia sadaka ya hatia na sadaka ya dhambi na walipookea sadaka ya unga. Wasilete sadaka nje ya uzio, kwa kuwa watu watatakaswa.”
Ọ sịrị m, “Ebe a ka ndị nchụaja ga-anọ sie anụ aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Ebe a ka ha ga-anọkwa ghee onyinye mkpụrụ ọka, ka a ghara iwebata ha na mpụta ogige a nakwa ido ndị mmadụ nsọ.”
21 Kisha akanileta kwenye uzio wa nje akaniongoza kuzunguka pembe nne za uzio, nikaona kwamba katika kila pembe ya uzio kulikuwa na uwanja.
Mgbe ahụ, o mere ka m pụta ọzọ nʼogige ezi. O duuru m gaa nʼakụkụ anọ nke ogige ahụ. Ahụrụ m na e nwere ogige nke dị nʼakụkụ ọbụla.
22 Katika hizo pembe nne za nje ya uzio kulikuwa na nzio nne ndogo, dhiraa arobaini urefu na thelathini upana. Ukubwa ule ule kwa nzio zote nne.
Nʼakụkụ anọ nke ogige ndị a, ogige ndị ọzọ dị nʼime ha. Ha ruru mita iri abụọ na atọ nʼogologo, ebe obosara ha rukwara mita iri na asaa nʼọkara. Ogige anọ ndị a ha nʼotu.
23 Kulikuwa na safu zilizokuwa zimetengenezwa kwa mawe kuzizunguka zote nne, na meko ya kupikia ilikuwa chini ya safu ya jiwe.
Nʼime ụlọ ahụ, gburugburu ya, e nwere ahịrị e ji nkume doo, nke nwere ekwu dị nʼokpuru ahịrị nkume ahụ.
24 Yule mtu akanambia, “Hizi ndizo sehemu ambazo watumishi watachemshia dhabihu za watu.”
Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ụlọ ebe ndị niile na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu ahụ ga-anọ na-esi ihe aja niile ndị mmadụ webatara.”