< Ezekieli 29 >
1 Katika siku ya kumi, katika mwezi wa kumi siku ya kumi na moja ya mwezi, neno la Yahwe likanijia, kusema,
Nʼafọ nke iri, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri na abụọ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 “Mwanadamu, weka uso wako juu ya Farao, mfalme wa Misri; toa unabii juu yake na juu ya Israeli yote.
“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼIjipt buo amụma megide Fero bụ eze Ijipt, na ala Ijipt niile.
3 Nena na sema, 'Bwana Yahwe asema hivi: Tazama! Ni juu yako, Farao, mfalme wa Misri. Wewe joka kubwa ambaye ujifichaye kati ya mto, husema, “Mto wangu ni wangu mwenyewe. Nimeufanya kwa ajili yangu mwenyewe.”
Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “‘Lee, mụ onwe m na-emegide gị, Fero eze Ijipt, gị onye bụ ogologo anụ ọjọọ ahụ na-amakpu nʼetiti mmiri iyi. Nʼihi na ị sịrị, “Ọ bụ m nwe Naịl, ọ bụkwa mụ onwe m mere ya nye onwe m.”
4 Kwa kuwa nitaweka kalabu katika taya zako, nasamaki za mto wako zitashikamana na magamba yako; nitakuinua juu kutoka kati ya mto wako karibu na samaki zote za mto walioshikamana na maganda yako.
Ma aga m etinye nko nʼagba gị, mee ka azụ niile nke iyi gị niile rapara nʼakpịrịkpa gị. Aga m adọpụta gị site nʼetiti iyi gị niile, mee ka azụ niile rapara nʼakpịrịkpa gị.
5 Nitakutupa chini kwenye jangwa, wewe pamoja na samaki wako wote kutoka kwenye mto wako. Utaanguka kwenye shamba la wazi; hutakusanya wala kuinua. Nitakupatia kama chakula kwa viumbe hai vya dunia na kwenye ndege wa angani.
Aga m ahapụ gị na azụ niile nke osimiri iyi gị nʼọzara, ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ nʼala ubi, a gaghị eli unu eli maọbụ tụtụọ unu, nʼihi na emeela m ka unu bụrụ nri nye anụ ọhịa niile, na nnụnụ niile.
6 Kisha wote wakaao Misri watajua kwamba mimi Yahwe, kwa sababu wamekuwa mwanzi wa kutegemewa hata kwenye nyumba ya Israeli.
Mgbe ahụ, ndị niile bi nʼIjipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. “‘Ị dịrịla ka mkpanaka achara nʼebe ụlọ Izrel nọ.
7 Wakati watakapokushika kwa mkono wao, ulivunjika na kurarua wazi mabega yao; na watakapojifunza juu yako, ulivunjika, na kusababisha miguu yao kutokuwa imara.
Mgbe ha jidere gị nʼaka, ị nyajiri dọwaa ha ubu ha. Mgbe ha dabeere na gị, ị gbajiri mee ka ha ghara inwekwa ike iguzosi ike nʼụkwụ ha.
8 Kwa hiyo Bwana Yahwe asema hivi: Tazama! nitaleta upanga juu yako. Nitawakatilia mbali wote mwanadamu na mnyama mbali nawe.
“‘Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, aga m eme ka mma agha bịakwasị gị, aga m ebipụkwa mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime gị.
9 Hivyo nchi ya Misri itakuwa ukiwa na jangwa. Ndipo watakapojua kwamba mimi ni Yahwe, kwa sababu jitu la kutisha liliseama, “Huu mto ni wangu, kwa kuwa nimeufanya mimi.”
Ala Ijipt ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu; ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. “‘Nʼihi na ị sịrị, “Osimiri Naịl bụ nke m. Ọ bụ m kere ya.”
10 Kwa hiyo, tazama! Ni juu yako na juu ya mto wako, hivyo nitaitoa nchi ya Misri juu ya ukiwa na jangwa, na utakuwa nchi yenye jangwa kutoka Migdoli hata Sewene na mipaka ya Kushi.
Nʼihi ya, aga m edo onwe m megide gị, megidekwa osimiri gị. Aga m ala Ijipt niile nʼiyi site na Migdol ruo Aswan, ruokwa nʼoke ala ha na ndị Kush.
11 Hakutakuwa na mguu wa mtu kupitia, na hakuna mguu wa wanyama pori watakao upitia. Haitakuwa makao kwa miaka arobaini.
Ọ dịghị ụkwụ anụmanụ maọbụ mmadụ ga-agafe nʼime ya, agaghị ebikwa nʼime ya ruo mgbe iri afọ anọ gasịrị.
12 Kwa kuwa nitaifanya nchi ya Misri kuwa ukiwa kati ya nchi zilizoharibiwa, na miji yake kati ya miji isiyotumika itakuwa ukiwa kwa miaka arobaini; kisha nitaitawanya Misri miongoni mwa mataifa, nitawatapanya kati ya nchi mbali mbali.
Aga m emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mkpọmkpọ ala niile, obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu iri afọ anọ nʼetiti obodo ndị e mere ka ha laa nʼiyi. Aga m achụsasị ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile.
13 Kwa kuwa Bwana Yahwe asema hivi: Mwisho wa miaka arobaini nitaikusanya Misri kutoka kwa watu miongoni mwao wale waliokuwa wametawanyika.
“‘Ọzọkwa, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼọgwụgwụ iri afọ anọ ahụ, aga m achịkọtakwa ndị Ijipt site nʼebe niile ha gbasara.
14 Nitawarudisha wageni wa Misri na kuwarudisha hata mkoa wa Pathrosi, hata kwenye nchi ya asili yao. Kisha huko watakuwa ufalme wa chini.
Aga m emekwa ka ndị ya niile laghachi nʼala Patros, ala ebe a mụrụ ha. Ma Ijipt agaghị abụkwa alaeze a maara nke ọma ọzọ.
15 Utakuwa chini ya falme, na hautajiinua tena juu ya mataifa. Nitawapunguza hivyo hawatatawala tena juu ya mataifa.
Ọ ga-abụ alaeze dị nnọọ ala karịa alaeze niile. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ọ ga-eweli onwe ya elu karịa mba ọzọ niile. Aga m emekwa ka ha dị nta, nke ha agaghị inwe ike achịkwa mba niile ọzọ.
16 Wamisri hawatakuwa sababu kwa ajili ya imani kwa ajili ya nyumba ya Israeli. Badala yake, watakuwa kumbusho la uovu ambao Israeli umeufanya walipogeukia Misri kwa ajili ya msaada. Kisha watajua kwamba mimi ni Bwana Yahwe.”'
Ijipt agaghị abụkwara ụlọ Izrel ihe ntụkwasị obi, kama ọ ga-abụrụ ha ihe iji cheta mmehie ha mere mgbe ha lere anya enyemaka site nʼaka ya. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụOnyenwe anyị.’”
17 Kisha ikawa katika mwaka wa ishirini na saba siku ya kwanza ya mwezi, lile neno la Yahwe likanijia, kusema,
Ọ ruo, nʼiri afọ abụọ na asaa, nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke mbụ, ka okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
18 “Mwanadamu, Nebukadreza mfalme wa Babeli amelinda jeshi lake kufanya kazi ngumu juu ya Tiro. Kila kichwa kilitiwa upara, na kila bega lilifanywa mali ghafi. Kisha yeye na jeshi lake hawakupokea malipo kutoka Tiro kwa kazi ngumu aliyokuwa ameimaliza dhidi yake.
“Nwa nke mmadụ, Nebukadneza bụ eze Babilọn mere ka ndị agha ya lụsoo Taịa ọgụ nʼebe ọ dị ukwuu. Isi niile ọbụla ka e mere ka ọ kwọchasịa, ubu niile kwa echihịara echihịa. Ma ya na ndị agha ya anataghị ụgwọ ọrụ ọbụla, nʼagha ahụ o buru megide Taịa.
19 Kwa hiyo Bwana Mungu asema hivi, 'Tazama! ninawapatia Nebukadreza nchi ya Misri mfalme wa Babeli, na atachukua utajiri wake, kuziteka nyara milki zake, na kuchukua yote atakayoyakuta huko; nayo yatakuwa mshahara wa jeshi lake.
Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu sị: Lee, ana m aga inye Nebukadneza eze Babilọn ala Ijipt. Ọ ga-akwakọrọ akụnụba ya, ọ ga-azacha ma bukọrọkwa ihe niile nke dị nʼala ahụ. Ha ga-abụkwa ụgwọ ọrụ nke ndị agha ya.
20 Nimempatia nchi ya Misri kama mshahara kwa ajili ya kazi waliyonifanyia-hivi ndivyo Bwana Yahwe asemavyo.
Enyefeela m ala Ijipt nʼaka ya, ka ọ bụrụ ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ ya, nʼihi na ya na ndị agha ya rụụrụ m ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
21 siku hiyo nitachipusha pembe kwa ajili ya nyumba ya Israeli, na nitakufanya uzungumze kati yao, ili kwamba wajue yakwamba mimi ni Yahwe.”'
“Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka otu mpi puputara ụlọ Izrel. Aga m asaghekwa ọnụ gị nʼetiti ha. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”