< Ezekieli 21 >

1 Kisha neno la Yahwe likanijia, kusema,
Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 “Mwanadamu, weka uso wako kuelekea Yerusalemu, na neno juu ya patakatifu; tabiri juu ya nchi ya Israeli.
“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ Jerusalem, buo amụma megide ụlọnsọ ukwu ahụ. Bukwaa amụma megide ala Izrel
3 Sema juu ya nchi ya Israeli, 'Yahwe asema hivi: Tazama! Ni juu yako! Nitautoa upanga wangu kutoka kwenye ala yake na kuwakatilia mbali wote yaani mtu mwenye haki na mtu mwovu kutoka kwako!
sị ala Izrel otu a, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Mụ onwe m na-emegide gị. Aga m esite nʼọbọ mịpụta mma agha m, site na gị gbuchapụ ma onye ezi omume na onye ajọ omume.
4 Ili niwakatilie mbali wote, mwenye haki na mwovu kutoka kwako, upanga wangu utatoka kwenye ala yake juu ya wote wenye mwili kutoka kusini hata kaskazini.
Nʼihi na m na-aga igbuchapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume, mma agha m ga-esite nʼọbọ ya pụta megide onye ọbụla site nʼugwu ruo na ndịda.
5 Kisha wote wenye mwili watajua yakwamba mimi, Yahwe, nimeutoa upanga wangu kutoka kwenye ala yake. Hautarudi tena!'
Mgbe ahụ, mmadụ niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị amịpụtala mma agha m site nʼọbọ ya, ọ gaghị amịghachi baa nʼọbọ ọzọ.’
6 Kwa hiyo, mwanadamu, gumia kama kuvunjika kwa viuno vyako! Katika uchungu gumia mbele ya macho yao!
“Nʼihi ya, sụọ ude, nwa nke mmadụ, sụọ ude nʼihu ha nʼọnọdụ oke mwute na obi mgbawa.
7 Kisha itatokea kwamba watakuuliza, 'Kwa sababu gani unalia?' Kisha utasema, 'Kwa sababu ya habari inayokuja, kwa kuwa kila moyo utakuwa dhaifu, na kila mkono utasita! Kila roho itazimia, na kila goti litatiririrka kama maji. Tazama! Inakuja na itakuwa kama hivi! -hivi ndivyo Bwana Yahwe asemavyo.”'
Mgbe ha jụrụ gị, ‘Gịnị kpatara i ji asụ ude?’ Ị ga-asị, ‘Nʼihi ozi nke na-abịa. Obi niile ga-agbaze site nʼegwu, aka niile ga-akụdakwa; mmụọ niile ga-ada mba, ikpere niile ga-ede mmiri site nʼamịrị.’ Ọ na-abịa, ọ ghaghị imezu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
8 Kisha neno la Yahwe likanijia, kusema,
Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
9 “Mwanadamu, tabiri na sema, 'Bwana asema hivi: sema: Upanga! Upanga! Utachongwa na kusuguliwa!
“Nwa nke mmadụ buo amụma sị, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “‘Lee, mma agha, lee, mma agha, a mụọla ya, hichakwaa ya.
10 Utanolewa ili kushiriki katika machinjio makubwa! Utasuguliwa ili uwe kama mng'ao wa radi! Je! Tufanye furaha katika fimbo ya mwana wa mfalme? Upanga ujao huchukia kila hiyo fimbo!
Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị, hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma. “‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya.
11 Hivyo upanga utatolewa kwa ajili ya kusuguliwa, na kisha kushikika kwa mkono! Upanga umechongwa na umesuguliwa na utatolewa kwenye mkono wa yule auaye!'
“‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ, ka e jidekwa ya nʼaka. A mụọla ya, hichazie ya. E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi.
12 Ita msaada na omboleza, mwanadamu! Kwa kuwa upanga umekuja juu ya watu wangu! Uko juu ya wakuu wote wa Israeli. Wametolewa dhidi ya upanga pamoja na watu wangu. Kwa hiyo, piga paja lako!
Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike, nʼihi na ọ bụ megide ndị m ọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile. A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha, ha na ndị m. Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.
13 Kwa kuwa kuna kujaribiwa, lakini itakuwaje kama fimbo ya kifalme haitakuwepo tena? -hivi ndivyo Bwana Yahwe asemavyo.
“‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’
14 Basi wewe, mwanadamu, tabiri, na piga makofi, kwa kuwa upanga utakushambulia hata mara tatu! Upanga kwa wale watakaochinjwa! Utakuwa upanga kwa ajili ya kuchinjia, ukiwatoboa pande zote!
“Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ. Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ, ka mma agha gbuo ugboro abụọ e, ọ bụladị ugboro atọ. Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu, nke e debere maka oke ogbugbu nke ga-abịachibido ha gburugburu.
15 Ili kuyeyusha mioyo yao na kuongeza kuanguka kwao, nimeweka machinjio ya upanga juu ya malango! Ole! Umeundwa kama mng'ao wa radi, umetengwa kwa ajili ya kuua!
Ka obi ha gbazee site nʼegwu, ka ndị na-ada ada hie nne, nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niile maka oke ogbugbu. Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma, etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu.
16 Wewe, upanga! Nyooka upande wa kuume! Nyooka upande wa kushoto! Nenda popote ulipoelekeza uso wako.
Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla, ma ọ nọ gị nʼaka nri ma ọ nọ gị nʼaka ekpe.
17 Kwa kuwa pia nitapiga mikono yangu miwili kwa pamoja (makofi), na kisha nitaleta ghadhabu yangu kwa waliobakia! Mimi, Yahwe, nimesema hivi!”
Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m, ime ka iwe m jụrụ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”
18 Neno la Yahwe likanijia tena, kusema,
Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
19 “Sasa wewe, mwanadamu, teua njia mbili kwa ajili ya upanga wa mfalme wa Babeli upate kuja. Njia hizo mbili zitaanza katika nchi moja, na kibao cha barabarani kitamwonyesha mmoja wao kama kuuelekea mji.
“Nwa nke mmadụ mee ụzọ abụọ nke mma agha eze Babilọn ga-eso. Ka ụzọ abụọ ndị a malite nʼotu obodo. Dee ihe ngosi manye ha nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ.
20 Onyesha njia moja kwa ajili ya jeshi la Wababeli kuja Raba, mji wa Waamoni. Onyesha nyingine kuelekea jeshi la Yuda na mji wa Yerusalemu, ambayo imeimarishwa.
Mee ka otu nʼime ụzọ ndị ahụ bụrụ ebe mma agha ga-esi bịa megide Raba nke Amọn, ka nke ọzọ megide Juda na Jerusalem, bụ ebe e wusiri ike.
21 Kwa kuwa mfalme wa Babeli atasimama kwenye makutano ya barabara, kwenye njia panda, ili kufanya uganga. Alitingisha mishale na kuuliza mwelekeo kutoka kwa sanamu na atalichunguza ini.
Nʼihi na eze Babilọn ga-abịa guzo nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ, nʼisi ụzọ abụọ ahụ ịchọ ihe ama. Ọ ga-esite nʼịgba àkụ nke ife nza, jụọ ase site nʼaka arụsị ya niile, nyochakwaa umeju ahụ.
22 Katika mkono wake wa kuume kutakuwa na dalili kuhusu Yerusalemu, kuweka mitambo ya kubomolea juu ya hiyo, kufungua kinywa chake kupanga kuchinja, kutoa sauti ya vita, kuweka mitambo ya kubomolea juu ya malango, kujenga ngazi, na kusimamisha wima minara ya boma.
Nʼụzọ dị nʼaka nri, ka ihe ịjụ ase banyere Jerusalem ga-esi bịa. Nʼebe ahụ ka ọ ga-ewu ihe niile ha ji etida mgbidi obodo ahụ. Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ nye iwu maka igbuchapụ ndị niile, na iwu ido ihe e ji etipu mgbidi nʼọnụ ụzọ ama niile, na iwu a ga-eji wuo nkwasa agha na mgbidi e ji ebuso ya agha.
23 Itaonekana kuwa ishara isiyofaa katika macho ya wale walio katika Yerusalemu, wale walioapa kiapo kwa Wababeli! Lakini mfalme atawashtaki kwa kuvunja sheria ya mkataba ili kuwabariki!
Ọ ga-adị ha dịka ọjụjụ ase nke na-abaghị uru, nye ndị ahụ ṅụrụ ha iyi, ma ọ ga-echetara ha ihe ọjọọ ha mere, dọkpụrụ ha nʼike.
24 Kwa hiyo Bwana Yahwe asema hivi: Kwa sababu umeuleta uovu wako kwenye kumbukumbu zangu, makosa yenu yatafunuliwa! Dhambi zenu zitaonekana katika matendo yenu yote! Kwa sababu hii utamkumbusha kila mtu mtakamatwa kwa mkono wa adui yenu!
“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru. ‘Ebe ọ bụ na unu esitela na nnupu isi unu mee ka e cheta ajọ omume unu, si otu a na-ekpughe mmehie unu nʼihe niile unu na-eme. Ebe ọ bụ na unu emeela ihe dị otu a, a ghaghị ịdọta unu nʼagha.
25 Kama wewe, mchafu na mtawala mwovu wa Israeli, ambaye siku ya hukumu imekuja, na ambaye mda wa kufanya uovu umekoma,
“‘Gị onye rụrụ arụ, onye na-emebi iwu, gị nwa eze nʼIzrel, gị onye ụbọchị ahụhụ ya rurula,
26 Bwana Yahwe asema hivi kwako: Toa kilemba na vua taji! Mambo hayatakuwa tena kama yalivyokuwa! Kiinue kilicho chini na kiinue kilichoinuka!
ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, yipụ okpueze gị, ya na akwa ị na-atụghị nʼisi. Ihe agaghị adịkwa dịka o si adị na mbụ. A ga-ebuli ndị dị ala, wedata ndị dị elu.
27 Uharibifu! Uharibifu! Nitaiharibu! Haitakuwa tena hadi atakapokuja yeye ambaye ameteuliwa kutekeleza hukumu.
Mbibi, mbibi. Aga m eme ka ọ ghọọ ihe e bibiri ebibi. A gaghị eweghachikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe onye ahụ o ruuru nʼizi ezi bịara. Ya ka m ga-enyefe ya nʼaka.’
28 Basi wewe, mwanadamu, tabiri na sema, 'Bwana Yahwe asema hivi hawa ni watu wa Amoni kuhusiana na ujio wa aibu yao: Upanga, upanga umechirwa! Umenolewa kwa ajili ya kuchinja, hivyo utakuwa kama kimuli muli cha radi!
“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha: “‘Lee mma agha, lee mma agha, nke a mịpụtara maka oke ogbugbu. E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa, ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe.
29 Wakati manabii wameona maono ya uongo juu yako, wakati watakapofanya matambiko kuuijia kwa uongo juu yako, huu upanga utaanguka chini juu ya shingo za mwovu ambao wako karibu kuuawa, ambao siku ya ghadhabu imekuja na ambao mda wa uovu unakaribia kuisha.
Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu, na a jụtakwala ase ụgha banyere unu, a ga-etinye ya nʼolu ndị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu, bụ ndị ụbọchị ha rurula, ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara.
30 Rudisha upanga kwenye gala yake. Katika mahali ulipoumbwa, katika nchi ya chimbuko lako, nitakuhukumu!
“‘Mịghachinụ ya nʼọbọ ya. Nʼebe ahụ e kere unu nʼala nna nna unu ha, Aga m ekpe unu ikpe.
31 Nitamwaga hasira yangu juu yako! Nitapuliza upepo wa moto wa ghadhabu juu yako na kukuweka kwenye mkono wa watu wakatili, watu wajuao kuangamiza!
Aga m awụkwasị unu ọnụma m, kukwasịkwa unu ikuku nke oke iwe m. Aga m ewere unu nyefee nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị bụ ọka na ịla mmadụ nʼiyi.
32 Utakuwa kuni kwa ajili ya moto! Damu yako itakuwa kati ya nchi. Hutakumbukwa tena, kwa kuwa mimi, Yahwe nimesema hivi!”'
Unu ga-aghọkwa mmanụ a na-awụnye nʼọkụ. A ga-awụsịkwa ọbara unu nʼala unu. Ọ dịkwaghị onye ga-echeta unu ọzọ, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.’”

< Ezekieli 21 >