< Torati 2 >

1 Kisha tuligeuka na kuanza safari kuelekea jangwani kwa njia ya Bahari ya Mianzi, kama Yahwe alivyosema nami, tulienda kuzunguka mlima wa Seir kwa siku nyingi.
Anyị laghachiri azụ chee ihu nʼọzara nʼụzọ gawara Osimiri Uhie, dịka Onyenwe anyị gwara m. Ọtụtụ afọ ka anyị nọ na-awagharị gburugburu ugwu Sia.
2 Yahwe alizungumza nami, kusema,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m,
3 Mmeuzungunga mlima huu kwa muda mrefu; geukeni kaskazini.
“Unu agbaala ala ugwu ugwu a gburugburu ogologo oge, cheenụ ihu nʼakụkụ ugwu.
4 Waamuru watu, kusema, “Mtapita kupitia mpaka wa ndugu zenu, wazao wa Esau, ambao wanaishi Seir; watawaogopa ninyi. Kwa hiyo muwe makini
Nye ụmụ Izrel iwu ndị a: ‘Unu ga-aga site nʼala ụmụnna unu ndị Edọm gafee. Ndị Edọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, onye biri na Sia. Ha ga-atụ egwu mgbe ha nụrụ na unu ga-esi nʼala ha gafee, ma kpachapụnụ anya.
5 msipigane nao, kwa kuwa sitawapa nchi yoyote yao, hapana, hakuna hata vya kutosheleza unyao wa mguu kukanyanga, kwa kuwa nimekwisha mpa Esau Mlima wa Seir kama miliki.
Unu akpasukwala ha ka ha lụsoo unu ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ọbụla sitere nʼala ha, ọ bụladị ebe ga-ezuru unu ịzọkwasị ụkwụ unu. Enyela m Ịsọ ala niile nke ugwu Sia dịka nke aka ya.
6 Mtanunua chakula kutoka kwao kwa pesa, ili kwamba muweze kula, pia mtanunua maji kutoka kwao kwa pesa, ili kwamba muweze kunywa. Kwa kuwa
Jirinụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nri ọbụla unu riri, jirikwanụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nʼihi mmiri ọbụla unu ṅụrụ.’”
7 Yahwe Mungu wenu amewabariki katika kazi za mikono yenu, amejua kutembea kwenu kupitia jangwa hili kuu. Kwa hii miaka arobaini Yahwe Mungu wenu amekuwa pamoja nanyi, na hamjapungukiwa chochote.
Onyenwe anyị Chineke unu agọziela unu nʼihe ọbụla bụ akaọrụ unu. O cheela nzọ ụkwụ unu nche iri afọ anọ ndị a niile unu wagharịrị nʼọzara ukwuu a. Onyenwe anyị Chineke unu anọnyerela unu, ọ dịkwaghị ihe kọrọ unu.
8 Basi tulipita karibu na ndugu zetu, wa wazao wa Esau, ambao wanaishi Seir, mbali na barabara la Arabah, kutoka Elathi, na kutoka Ezioni Geber. Na tuligeuka na kupita karibu na jangwa la Moabu.
Ya mere, anyị sitere nʼala ụmụnna anyị bụ ụmụ Ịsọ, ndị bi na Sia gafee. Anyị hapụkwara ụzọ Araba nke si Elat na Eziọn Geba, tụgharịa gawa elu elu ụzọ ọzara Moab.
9 Yahweh aliniambia mimi,'Usiisumbue Moabu, na usipigane nao katika vita. Kwa kuwa sitakupa nchi yake kwa miliki yako, kwa sababu nimewapa Ar wazao wa Lot, kuwa miliki yao'.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị dọrọ anyị aka na ntị sị, “Unu esogbula maọbụ lụso ndị Moab ọgụ nʼihi na unu enweghị oke nʼala ha, nʼihi na enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala Ar ka ọ bụrụ ihe nketa nke ha.”
10 (Hapo awali waliishi Waemi, watu kama wakuu, wengi, na warefu kama Waanaki;
(Ndị biri nʼebe ahụ na mgbe gara aga bụ ndị Emim, agbụrụ ha gbara dimkpa dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ. Ha toro ogologo dịka ndị Anak.
11 hawa pia wanafikiriwa kuwa Rephaimu, kama Waanaki, lakini Wamoabi huwaita Waemi.
A na-eche na ha bụ ndị Refaim, dịka ndị Anak, ma ndị Moab na-akpọ ha ndị Emim.
12 Wahori pia waliishi hapo awali Seiri, lakini wazao wa Esau waliwafuata. Waliwaharibu kutoka mbele yao na kuishi katika eneo lao, kama Israeli ilivyofanya kwa nchi ya umiliki wake ambayo Yahwe aliwapa.)
Ma mgbe gara aga ọ bụ ndị Hor bi na Sia, ma ndị Edọm, ụmụ Ịsọ, chụpụrụ ha. Ha bibiri ndị Hor bichikwaa ala ha, dịka ụmụ Izrel si bichie nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha dịka ihe nketa.)
13 “Sasa inuka na uende kwenye kijito cha Zeredi”. Kwa hiyo tulienda kwenye kijito cha Zeredi.
Onyenwe anyị gwara anyị okwu sị, “Ugbu a bilienụ, gafee Ndagwurugwu Zered.” Anyị bilikwara gafee.
14 Sasa tangu siku ambapo tulikuja kutoka Kadesh Barnea mpaka tukavuka kijito cha Zeredi, ilikuwa miaka thelathini na nane. Ilikuwa kwa wakati huo kizazi chote cha watu waliofaa kupigana walikuwa wamekwisha ondoka kwa watu, kama Yahwe alivyokuwa ameapa kwao.
Iri afọ atọ na asatọ gasịrị, site na mgbe anyị hapụrụ Kadesh Banea ruo mgbe anyị gafere Ndagwurugwu Zered! Nʼoge a, ọgbọ ndị ikom ahụ niile na-alụ agha anwụchaala site nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị ṅụrụ ha nʼiyi.
15 Zaidi ya yote, mkono wa Yahwe ulikuwa kinyume na kizazi hicho ili kuweza kuwaangamiza kutoka kwa watu mpaka walipoondoka.
E, aka Onyenwe anyị dị megide ha, ruo mgbe o mere ka ha niile nwụchaa site nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ.
16 Basi ilitokea, wakati watu wote waliofaa kwa kupigana walikuwa wamekufa, na kutoweka miongoni mwa watu,
Mgbe onye nke ikpeazụ nʼime ndị niile a tozuru ije agha nwụchara,
17 kwamba Yahwe alizungumza nami, kusema,
Onyenwe anyị sịrị m,
18 Leo mtavuka Ar, mpaka wa Moabu.
“Taa, ụmụ Izrel ga-esi na Ar gafee oke ala ndị Moab.
19 Wakati mtakapofika karibu na mkabala wa watu wa Ammoni, msiwasumbue au kupigana nao, kwa kuwa sitawapa nchi yoyote ya watu wa Ammoni kama miliki, kwa sababu nimekwisha wapa wazao wa Lutu kama miliki”.
Mgbe unu bara nʼala ndị Amọn, unu esogbula ha, unu alụsola ha ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ndị Amọn. Enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala ahụ dịka ihe onwunwe ha.”
20 (Hiyo tena ilifikiriwa kuwa nchi ya Rephaimu. Warephaimu waliishi hapo awali-lakini Wammonites wanawaita Zamzummim,
Ndị bi nʼebe a na mbụ bụ ndị Refaim, ma ụmụ Amọn na-akpọ ha ndị Zamzum.
21 watu kama wakuu, wengi, na warefu kama Anakim. Lakini Yahwe aliwaharibu mbele ya Wammonites na waliwafuata na kuishi katika maeneo yao.
Ha bụ agbụrụ dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, siekwa ike nke ukwuu, ha toro ogologo dịka ụmụ Anak. Onyenwe anyị sitere nʼaka ndị Amọn laa ha nʼiyi, bụ ndị chụpụrụ ha ma bichie nʼobodo ha.
22 Yahwe huyu pia alifanya kwa watu wa Esau ambao wanaishi Seiri, wakati alipowangamiza Wahori kutoka mbele yao, na wazao wa Esau waliwafuata na waliishi katika maeneno yao mpaka leo.
Onyenwe anyị mekwara otu ihe ahụ nye ndị agbụrụ Ịsọ bụ ndị bi nʼugwu Sia mgbe ọ lara ndị Hor bụ ụzọ biri nʼebe ahụ nʼiyi. Ha chụpụrụ ha, bichie ala ha ruo taa.
23 Na Waavi, walioishi katika vijiji vya mbali ya Gaza, Wakaftori, ambao wanatokana na Kaftori, waliwangamiza na kuishi katika maeneo yao.)
Ebe ọzọkwa Onyenwe anyị mere ihe dị otu a bụ mgbe o mere ka ndị Kafto laa ndị Avim nʼiyi. Ha bichiri obodo nta niile ndị Avim nwere nke dị gburugburu ebe ahụ rukwaa Gaza.
24 Sasa inuka, nenda njia yako na uvuke bonde la Arnoni, tazama, nimekupa mkononi mwako Sihoni ya Amorite, mfalme wa Heshboni, na nchi yake. Anza kuimiliki na pigana naye katika vita.
Emesịa, Onyenwe anyị sịrị, “Gafeenụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, baakwanụ nʼalaeze Saịhọn, onye Amọrị, eze obodo Heshbọn. Lụsonụ ya agha, bichiekwanụ nʼala ya nʼihi na enyefeela m ya bụ eze na ala ya nʼaka unu.
25 Leo nitaanza kuweka woga na hofu yenu kwa watu ambao wako chini ya anga lote, watasikia habari kuhusu ninyi na watatemeka na kuwa na shida kwa sababu yenu'.
Site taa gaa nʼihu, aga m etinye egwu na ụjọ nʼobi ndị niile bi nʼokpuru mbara eluigwe. Ha ga-anụ akụkọ unu tụọ oke egwu, maakwa jijiji nʼihi unu.”
26 Nilituma wajumbe toka jangwa la Kedemothi kuelekea Sihoni, mfalme wa Heshbon, pamoja na maneno ya amani, kusema,
Esitere m nʼọzara Kedemot zipụ ndị ozi, ka ha jekwuru Saịhọn, eze Heshbọn, zie ya ozi na anyị chọrọ udo, sị,
27 Hebu nipite katika nchi yako; nitapita kwenye barabara kuu, sitageuka mkono wa kulia wala kushoto.
“Kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-anọ. Anyị agaghị atụgharị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.
28 Mtaniuzia mimi chakula kwa pesa, ili kwamba niweze kula, nipe maji kwa pesa, ili kwamba niweze kunywa, peke niruhusu kupitia kwa miguu yangu,
Renye anyị ihe oriri anyị ga-eri na mmiri anyị ga-aṅụ nʼọnụ ahịa ọlaọcha. Naanị kweere ka anyị gabiga nʼụkwụ ala,
29 kama wazao wa Esau wanaoishi Seiri, na Moabu wanaoishi Ari, walifanya kwangu, mpaka nivuke Yordani ndani ya nchi ambayo Yahwe Mungu wetu anatupa sisi'.
dịka ụmụ Ịsọ, bụ ndị bi na Sia, nakwa ndị Moab bi nʼobodo Ar meere anyị, ruo mgbe anyị gafere Jọdan banye nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.”
30 Lakini Sihon, mfalme wa Heshbon, asingeturuhusu kupitia kwake; kwa kuwa Yahwe Mungu wenu ameifanya ngumu akili yake na kufanya moyo wake kuwa ukaidi, ili kwamba aweze kumshinda kwa nguvu zake, ambayo amekwisha kufanya leo.
Ma Saịhọn, eze Heshbọn, ekweghị ka anyị si nʼala ya gafee. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu mere ka mmụọ ya sie ike, meekwa ka o mesie obi ya ike, ka o si otu a nyefee ya nʼaka unu dịka ọ mere ugbu a.
31 Yahwe alisema kwangu, “tazama, Nimeanza kumuokoa Sihoni na nchi yake mbele yako; kuanza kuimiliki, ili kusudi muweze kumiliki nchi yake.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m sị, “Lee, amalitela m iwere Saịhọn na obodo a nyefee unu nʼaka. Ngwanụ, malitenụ ibuso ya agha! Merienụ ya, nwetakwanụ ala ya.”
32 Kisha Sihon alikuja dhidi yetu, yeye na watu wote wake, kupigana huko Jahazi.
Mgbe Saịhọn na ndị agha ya niile pụtara izute anyị nʼagha nʼebe a na-akpọ Jehaz,
33 Yahwe Mungu wetu alimtoa kwetu na tulimshinda, tulimpiga mpaka kufa, watoto wake, na watu wake wote.
Onyenwe anyị Chineke anyị nyefere ya nʼaka anyị. Anyị gburu ya, gbukwaa ụmụ ya ndị ikom niile, na ndị agha ya niile.
34 Tulichukua miji yake yote kwa wakati huo na kuharibu kabisa kila mji- wanaume na wanawake na watoto wadogo; hatukuacha aliyenusurika.
Nʼoge ahụ, anyị meriri obodo ya niile, bibiekwa ha niile kpamkpam, ma ndị ikom, ma ndị inyom, ma ụmụntakịrị. Anyị ahapụghị mmadụ onye ndụ.
35 Ng'ombe peke tulichukua kama mateka kwa ajili yetu, sambamba na mateka ya miji tuliochukua.
Ma ihe ndị anyị bukọọrọ bụ naanị anụ ụlọ, na ngwongwo ndị ọzọ dị iche iche anyị si nʼobodo ndị anyị meriri kwata.
36 Kutoka Aroer, ambayo iko kwenye ukingo wa bonde la Arnon, na kutoka kwenye mji ambao uko bondeni, yote kwa njia ya kuelekea Galeadi, hapakuwa na mji uliokuwa mrefu kwetu. Yahwe Mungu wetu alitupa ushindi dhidi ya maadui zetu mbele yetu.
Anyị lụgburu ndị niile bi nʼobodo dị site nʼAroea ruo nʼọnụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, na site nʼetiti ndagwurugwu ahụ ruo Gilead. O nweghị obodo ọbụla rara anyị ahụ imeri, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke nyefere ha niile nʼaka anyị.
37 Ilikuwa nchi ya wazao wa Ammoni peke yake ambayo hamkuingia, sambamba na sehemu zote za mto Jabboki, na miji ya nchi ya milima- popote pale Yahwe Mungu wetu ametukataza sisi kwenda.
Ma dịka usoro iwu Onyenwe anyị Chineke anyị si dị, anyị abanyeghị ala ndị Amọn ọbụla maọbụ ruokwa nʼala dị nʼakụkụ iyi Jabọk nso, maọbụ nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼugwu.

< Torati 2 >