< Torati 15 >
1 Kila mwisho wa kila miaka saba, mnapaswa kufuta madeni.
Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, ị ga-akagbu ụgwọ niile mmadụ ji gị.
2 Hii ni tabia ya ukombozi. Kila mkopeshaji atafuta kile alichompa jirani yake, hata dai kutoka kwa jirani yake au ndugu yake kwa sababu ufutaji wa madeni wa Yahwe umetangazwa.
Otu a ka a ga-esi mee ya: Onye ọbụla e ji ụgwọ ga-akagbu ụgwọ niile onye Izrel ibe ya ji ya. Ọ gaghị elekwa anya na onye agbataobi ya maọbụ nwanna ya ga-akwụ ya ụgwọ ahụ, nʼihi na oge a na-ekwusa mgbaghara ụgwọ Onyenwe anyị eruola.
3 Kutoka kwa mgeni mnaweza kudai; lakini kwa chochote chenu kilicho na ndugu yenu mnapaswa mkitoe.
Mgbaghara a erughị nʼebe ndị ọbịa nọ, ma ị ghaghị ịkagbu ụgwọ ọbụla nwanna gị ji gị.
4 Hata hivyo, pasiwepo maskini miongoni mwenu (kwa kuwa Yahwe kwa hakika atawabariki kwenye nchi ambayo anawapa kama urithi kumiliki)
Otu ọ dị, o kwesighị ka ndị ogbenye dịrị nʼetiti gị, nʼihi nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị ka inweta dịka ihe nketa gị, ọ ga-agọzi gị nke ukwuu,
5 kama peke yenu mnasikiliza kwa bidii sauti ya Yahwe Mungu wenu, kuzishika amri zote ambazo anawaamuru leo.
ma ọ bụrụ na i rube isi nye Onyenwe anyị Chineke gị, ma lezie anya debe iwu ndị a niile m na-enye gị taa.
6 Kwa kuwa Yahwe Mungu wenu atawabariki, kama alivyowaahidia; mtakopesha mataifa mengi, lakini hamtaazima; mtaongoza juu ya mataifa mengi, lakini hayatawaongoza ninyi.
Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị dịka o kwere na nkwa. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ego, ị gaghị anọ nʼụkọ! Ị ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị gị.
7 Kama kuna mtu maskini miongoni mwenu, moja wa ndugu zenu, ndani ya malango yenu yoyote kwenye nchi yenu ambayo Yahwe Mungu wenu anawapa, msifanye migumu mioyo yenu wala kufunga mkono wenu toka kwa ndugu yenu,
Ma mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye gị, a sị na e nwee onye ogbenye nʼetiti gị, nke bụ onye Izrel ibe gị, ị gaghị emechi obi gị maọbụ kechie aka gị megide ya,
8 Lakini mnapaswa hakika kufungua mkono wenu kwake na hakika mkopeshe yeye vya kutosha hitaji lake.
ị ghaghị ịgbazinye ya ihe dị ka o si chọọ.
9 Muwe makini kutokuwa na wazo ovu au potovu katika moyo wenu, kusema, “Mwaka wa saba, mwaka wa ukombozi u karibu; ili kwamba msiwe wachoyo kuhusiana na ndugu zenu maskini na haumpi chochote; anaweza kumlilia Yahwe kuhusu nyie, na itakuwa dhambi yenu.
Lezie anya ka ị ghara inwe ụdị echiche ọjọọ a nʼobi gị sị, “Afọ mgbaghara ụgwọ na-abịa nso,” nʼihi ya, i kechie obi gị jụ ibinye nwanna gị nọ na mkpa ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na onye ahụ nọ na mkpa akwaa akwa kpọkuo Onyenwe anyị, a ga-agụ gị dịka onye ikpe mmehie mara.
10 Mnapaswa kwa hakika mmpe, na moyo wenu hampaswi kuhuzunika wakati mnampa, kwa sababu kurudishiwa kwa Yahwe huyu Mungu wenu atawabariki katika kazi zenu zote na katika chochote mnaweka mkono wenu.
Ị ghaghị inye ha site nʼafọ ofufu, meekwa nke a na-enweghị obi ilu, mgbe ahụ, nʼihi nke a, Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-agọzi gị nʼọrụ gị niile nakwa ihe niile nke ị tinyere aka na ya.
11 Kwa kuwa maskini kamwe hatakoma kuishi katika nchi, kwa hiyo nakuamuru wewe na kusema, “Unapaswa kwa hakika ufungue mkono wako kwa ndugu yako, kwa mhitaji wako, na kwa maskini wako katika nchi yako.
A ghaghị inwe ndị ogbenye nʼetiti unu, ọ bụ ya mere iwu a jiri dị mkpa. Gbasapụ aka nʼebe nwanna gị na nʼebe ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa nọ.
12 Kama ndugu yako, ni mwebrania wa kiume au mwebrania wa kike, ameuzwa kwako na anakutumikia kwa miaka saba, basi katika mwaka wa saba unapaswa umwache aende zake huru.
Ọ bụrụ na onye Hibru ibe gị, ndị nwoke maọbụ ndị nwanyị, eresi gị onwe ha, gbakwaara gị odibo afọ isii, nʼafọ nke asaa, ị ghaghị ịhapụ ha ka ha nwere onwe ha.
13 Unapomwacha aende zake huru, usimwache aende mkono mtupu.
Mgbe ọ hapụrụ ụlọ gị, ezipụkwala ya nʼaka efu!
14 Unapaswa kwa ukarimu hutoe kwake kutoka mifugo yako, kutoka pura iliyo chini, na kinu chako cha mvinyo. Kama Yahwe Mungu wako alivyokubariki, unapaswa umpe yeye.
Ị ga-esite nʼigwe anụ ụlọ gị, na nʼebe ịzọcha ọka gị, na nʼebe ịzọcha vaịnị gị, nye ya onyinye pụrụ iche iji sị ya laa nʼudo. Nye ya onyinye a dịka Onyenwe anyị Chineke gị si gọzie gị.
15 Unapaswa kukumbuka kwamba ulikuwa mtumwa kwenye nchi ya Misri, na kwamba Yahwe Mungu wako alikukomboa; kwa hiyo ninakuamuru leo kufanya hivi.
Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt ma Onyenwe anyị bụ Chineke gị gbapụtara gị. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a taa.
16 Itakuwa kwamba kama atasema kwako, “Sitaenda mbali yako; kwa sababu anakupenda na nyumba yako, na kwa sababu ni mzuri kwako,
Ma ọ bụrụ na ohu gị asị gị, “Achọghị m ịhapụ gị,” nʼihi na ọ hụrụ gị na ndị ụlọ gị nʼanya, hụkwa na ihe na-agara gị na ya nke ọma, mgbe gị na ya nọ.
17 basi unapaswa kuchukua uma na msukumo kupitia sikio lake kwenye mlango, na atakuwa mtumwa wako milele. Na pia kwa mtumwa wako wa kike utafanya vilevile.
Were agịga kpọpuo ntị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ gị. Ọ ga-abụkwara gị ohu ogologo ndụ ya niile. Otu aka ahụ kwa ka ị ga-eme ohu gị nwanyị.
18 Isionekane kuwa vigumu kwako kumwachia aende zake huru, kwa sababu amekutumikia kwa miaka sita na amekupa mara mbili udhamani wa mtu aliyeajiriwa. Yahwe Mungu wako atakubariki katika yote unayofanya.
Enwela obi mwute mgbe ọbụla ị na-ahapụ ohu gị ka o nwere onwe ya, nʼihi na ị ga-echeta na ọ rụụrụ gị ọrụ afọ isii, ihe i mefukwara erughị ọkara ihe ị gaara eji goo ndị ọrụ. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzikwa gị nʼihe niile ị na-eme.
19 Wazao wote wa kwanza wa kiume katika wanyama na mifugo wako unapaswa uwatenge kwa Yahwe Mungu wako. Hautafanya kazi na mzao wa kwanza wa wanyama wako wala kumnyoa mzao wa kwanza wa mfugo wako.
Nwa oke ehi ọbụla maọbụ nwa atụrụ ọbụla maọbụ nwa ewu ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼime igwe anụ ụlọ gị ka ị ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị, ejila nwa mbụ nke ehi gị e buru ụzọ mụọ arụ ọrụ ubi, akpachakwala ajị nwa ewu maọbụ nwa atụrụ ọbụla e buru ụzọ mụọ dị nʼime igwe ewu na atụrụ gị.
20 Unapaswa umle mzaliwa wa kwanza mbele ya Yahwe Mungu wako kila mwaka katika eneo ambalo Yahwe atachagua, wewe na nyumba yako.
Gị na ezinaụlọ gị ga-eri anụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị afọ ọbụla nʼebe ọ họpụtara.
21 Kama ina kasoro yoyote- kwa mfano, kama ni kilema au kipofu, au ana kasoro yoyote- haupaswi kumtoa dhabihu kwa Yahwe Mungu wako.
Ma ọ bụrụ na nwa anụ ọbụla e buru ụzọ mụọ nwere nkwarụ, dịka ngwụrọ maọbụ ìsì maọbụ nkwarụ ọbụla nke jọrọ njọ, ị gaghị eji ya achụ aja nye Onyenwe anyị Chineke gị.
22 Utamla ndani ya malango yako; mtu asiye najisi na aliye najisi ni sawa unapaswa kula, kama ungekula paa au kulungu.
Kama, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ gị nʼime ụlọ gị. Onye ọbụla, ma ndị dị ọcha ma onye rụrụ arụ nʼoge ahụ ga-eri ya, dịka onye ọbụla pụrụ iri anụ ele maọbụ anụ mgbada.
23 Pekee haupaswi kunywa damu yake; unapaswa kuimwanga damu yake juu ya ardhi kama maji.
Ma erila ọbara ya. Wụsa ya nʼala dịka mmiri.