< 2 Samweli 7 >

1 Ikawa mfalme alipokuwa amekwisha kukaa katika nyumba yake, na baada ya Yahwe kuwa amemstarehesha kutokana na adui zake wate waliomzunguka,
O ruo mgbe eze nọsara ahụ nʼụlọeze ya, mgbe Onyenwe anyị mekwara ka o site nʼaka ndị iro ya nọ gburugburu zuru ike,
2 mfalme akamwambia nabii Nathani, “Tazama, mimi ninaishi katika nyumba ya mierezi, lakini sanduku la Mungu lipo hemani.
ọ sịrị Netan, bụ onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼime ụlọ ikwu.”
3 Basi Nathani akamwambia mfalme, “Nenda, fanya lililo moyoni mwako, kwa maana Yahwe yupo nawe.”
Netan zaghachiri eze sị, “Ihe ọbụla dị gị nʼobi gaa nʼihu mee ya, nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere gị.”
4 Lakini usiku usiku uleule neno la Yahwe lilimjia Nathani kusema,
Ma nʼabalị ahụ, okwu Onyenwe anyị rutere Netan ntị, na-asị,
5 “Nenda na umwambie mtumishi wangu Daudi, 'Hivi ndivyo asemavyo Yahwe: Je utanijengea nyumba ya kuishi?”
“Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ gị ga-ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi?
6 Kwa maana sijawai kuishi katika nyumba tangu siku ile nilipowaleta wana wa Israeli kutoka Misri hata leo; badala yake nimekuwa nikitembea katika hema, hema la kukutania.
Nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta ndị Izrel ruo taa. Kama ana m ejegharị site otu ebe gaa ebe ọzọ, were ụlọ ikwu mere ebe obibi m.
7 Mahali pote ambapo nimekuwa nikihama miongoni mwa wana wote wa Israeli, Je niliwai kusema lolote na viongozi wa Israeli niliowaweka kuwachunga watu wangu Israeli, kusema, “Kwa nini hamjanijengea nyumba ya mierezi?”
Nʼebe ọbụla m na-ejegharị nʼetiti ndị Izrel niile, ọ dị mgbe m sịrị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị ha, ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m Izrel, sị, “Gịnị mere unu ewubereghị m ụlọ sida?”’
8 Sasa basi, mwambie Daudi, mtumishi wangu, “Hiki ndicho asemacho Yahwe wa majeshi: 'Nilikutwaa kutoka machungani, kutoka katika kuwafuata kondoo, ili uwe mtawala juu ya watu wangu Israeli.
“Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị. Mee gị onye na-achị ndị m Izrel.
9 Nimekuwa pamoja nawe popote ulipokwenda na nimewakatilia mbali adui zako wote mbele yako. Na nitakutengenezea jina kubwa, kama jina la mojawapo ya wakuu walio juu ya nchi.
Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa.
10 Nitatenga mahali kwa ajili ya watu wangu Israeli nami nitawapanda pale, ili kwamba waweze kuishi mahali pao wenyewe na wasisumbuliwe tena. Waovu hawatawatesa tena, kama walivyofanya mwanzo.
Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha; ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ,
11 Kama walivyofanya tangu siku ile nilipoamuru waamuzi juu ya watu wangu Israeli. Nami nitakustarehesha kutokana na adui zako wote. Zaidi ya hayo, Mimi, Yahwe, nakutamkia kwamba nitakutengenezea nyumba.
dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m enyekwa gị ezumike site nʼebe ndị iro gị niile nọ. “‘Onyenwe anyị na-ekwupụtara gị, na Onyenwe anyị ya onwe ya, ga-eguzobere gị ụlọ.
12 Siku zako zitakapokwisha na ukalala pamoja na baba zako, nitainua mzao baada yako, atokaye katika mwili wako mwenyewe, nitauimalisha ufalme wake.
Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe i ga-esoro nna nna gị ha dinaa nʼọnwụ, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, onye bụ anụ ahụ na ọbara gị, aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike.
13 Naye atajenga nyumba kwa jina langu, nami nitakiimalisha kiti chake cha enzi daima.
Ọ bụ ya ga-ewuru m ụlọ. Aga m eme ka ocheeze nke alaeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
14 Nitakuwa baba kwake, naye atakuwa mwanangu. Atakapotenda dhambi, nitamwadhibu kwa fimbo ya wanadamu na kwa mapigo ya wana wa watu.
Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna. Ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Ọ bụrụ na o jehie, aga m eji mkpanaka mmadụ taa ya ahụhụ. Werekwa ihe otiti si nʼaka ndị mmadụ dụọ ya ọdụ.
15 Lakini uaminifu wa agano langu hautamwondokea, kama nilivyouondoa kutoka kwa Sauli, niliyemwondoa mbele yako.
Ma agaghị ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m si wezuga ya site nʼebe Sọl nọ, bụ onye m wezugara site nʼihu gị.
16 Nyumba yako na ufalme wako utathibitiswa mbele yako daima. Kiti chako cha enzi kitakuwa imara daima.”
Ụlọ gị na alaeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nʼihu m. A ga-eme ka ocheeze gị bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’”
17 Nathani akamwambia Daudi na kumtaarifu maneno haya yote, na akamwambia kuhusu ono lote.
Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị.
18 Kisha mfalme Daudi akaingia ndani na kuketi mbele ya Yahwe; akasema, “Mimi ni nani, Yahwe Mungu, na familia yangu ni nini hata umenileta hapa nilipo?
Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu Onyenwe anyị, sị: “Onye ka m bụ, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a?
19 Na hili lilikuwa jambo dogo mbele yako, Bwana Yahwe. Hata ukasema kuhusu familia ya mtumishi wako wakati mkuu ujao, nawe umenionesha vizazi vijavyo, Bwana Yahwe!
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị. Ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, nke a bụkwa ụkpụrụ metụtara mmadụ efu.
20 Mimi Daudi, niseme nini zaidi kwako? Umemweshimu mtumishi wako, Bwana Yahwe.
“Ma gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị? O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma.
21 Kwa ajili ya neno lako, na kwa ajili ya kutimiza kusudi lako mwenyewe, umefanya jambo kubwa namna hii na kulidhihirisha kwa mtumishi wako.
Nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ohu gị mata ha.
22 Kwa hiyo wewe ni mkuu, Bwana Yahwe. Kwa maana hakuna mwingine aliye kama wewe, na hakuna Mungu mwingine badala yako, kama jinsi ambayo tumesikia kwa masikio yetu wenyewe.
“Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, lee ka i si dị ukwuu! Ọ dịghị onye dịka gị. Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị.
23 Kwani kuna taifa lipi lililo kama watu wako Israeli, taifa moja juu ya nchi ambalo wewe, Mungu, ulikwenda na kuwakomboa kwa ajili yako wewe mwenyewe? Ulifanya hivi ili kwamba wawe watu kwa ajili yako mwenyewe, kujifanyia jina kwa ajili yako mwenyewe, na kufanya matendo makuu na ya kuogofya kwa ajili ya nchi yako. Uliyaondoa mataifa na miungu yao kutoka mbele ya watu wako, uliowakomboa kutoka Misri.
Olee ndị dịka ndị gị, bụ Izrel, bụ otu mba nʼelu ụwa nke Chineke gara ịgbapụta dịka otu ndị nye onwe ya, na iji mere onwe ya aha, rụọkwa ọrụ ịtụnanya dị egwu dịkwa ukwuu nʼihi ha, site nʼịchụpụ mba dị iche iche na chi niile ha site nʼihu ndị gị, bụ ndị ị gbapụtara site nʼIjipt?
24 Umeiimarisha Israel kama watu wako daima, na wewe, Yahwe, kuwa Mungu wao.
I meela ka ndị gị Izrel guzosie ike, dịka ndị nke gị ruo mgbe ebighị ebi. Ma gị onwe gị kwa, Onyenwe anyị, abụrụla Chineke ha.
25 Basi sasa, Yahwe Mungu, ahadi uliyofanya kuhusu mtumishi wako na familia yake iwe imara daima. Ufanye kame uilivyo sema.
“Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke, debe nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya ka ọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị
26 Na jina lako liwe kuu daima, ili watu waseme, 'Yahwe wa majeshi ni Mungu wa Israeli,' wakati nyumba yangu, Daudi, mtumishi wako itakapokaa imara mbele zako daima.
Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-asị, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke na-achị Izrel’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị bụ Devid guzosie ike nʼanya gị.
27 Kwa maana wewe, Yahwe wa majeshi, Mungu wa Israeli, umedhihirisha kwa mtumishi wako kwamba utamjengea nyumba. Ndiyo maana mimi, mtumishi wako, nimepata ujasiri kuomba kwako.
“O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel, nʼihi na ị kpugheerela ohu gị ihe a, na-asị, ‘Aga m ewuru gị ụlọ.’ Ya mere, ohu gị ji nwee obi ike ikpere gị ekpere a.
28 Sasa, Bwana Yahwe, wewe ni Mungu, na maneno yako ni amini, na umefanya ahadi hii njema kwa mtumishi wako.
O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, ị bụ Chineke nʼezie. Okwu gị kwesiri ntụkwasị obi. I kweekwala ohu gị nkwa ihe ọma ndị a.
29 Sasa basi, na ikupendeze kuibariki nyumba ya mtumishi wako, ili iendelee mbele yako daima. Kwa maana wewe, Bwana Yahwe, umeyasema mambo haya, na kwa ahadi yako nyumba ya mtumishi wako itabarikiwa daima.
Ugbu a biko, ka ọ masị gị ịgọzi ụlọ ohu gị, ka ọ dịgide nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na gị, o Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola ya, sitekwa na ngọzị gị, ụlọ ohu gị ga-abụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.”

< 2 Samweli 7 >