< 2 Samweli 10 >

1 Ikawa baadaye mfalme wa watu wa Amoni akafa, na Hanuni mwanaye akawa mfalme mahali pake.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze ndị Amọn nwụrụ. Hanọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2 Daudi akasema, “Nitaonesha fadhiri Hanuni mwana wa Nahashi, kwa kuwa baba yake alinifadhiri.” Hivyo Daudi akatuma watumishi wake kumfariji Hanuni kwa habari ya baba yake. Watumishi wake wakaingia katika nchi ya watu wa Amoni.
Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere dịka nna ya si gosi m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya. Mgbe ndị ikom Devid rutere nʼala ndị Amọn,
3 Lakini viongozi wa watu wa Amoni wakamwambia Hanuni bwana wao, “Je unathani kwa hakika Daudi anamweshimu baba yako hata ametuma watu kukutia moyo? Daudi hajawatuma watumishi wake kwako ili kuuangalia mji, kuupeleleza, ili kuupindua?
ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na Devid eziteghị ha ịbịakwute gị, naanị ka ha bịa mee nledo nʼobodo a, nyochapụta ya ma kwatuo ya?”
4 Hivyo Hanuni akawachukuwa watumishi wa Daudi, akawanyoa nusu ya ndevu zao, akachana mavazi yao hadi kwenye matako, naye akawaacha waende zao.
Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ otu mpaghara afụọnụ nwoke ọbụla, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha.
5 Daudi alipoelezwa kuhusu hili, akatuma watu kwenda kuwalaki, kwa kuwa walikuwa wamefedheheshwa sana. Mfalme akawambia, “Kaeni Yeriko mpaka ndevu zenu zitakapoota, ndipo mrudi.”
Mgbe a gwara Devid ihe mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha gaa zute ndị ikom ahụ, nʼihi na e mere ha ihe ihere nʼebe ọ dị ukwuu. Eze sịrị, “Nọdụnụ na Jeriko ruo mgbe afụọnụ unu tolitere, mgbe ahụ unu ga-alọta.”
6 Watu wa Amoni walipoona kwamba wamenuka kwa Daudi, wakatuma wajumbe na kuwaajiri Washami wa Bethi Rehobu na Soba, askari elfu ishirini waendao kwa mguu, na mfalme wa Maaka pamoja na watu elfu, na watu wa Tobu elfu kumi na mbili.
Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, ha gara goo iri puku ndị agha abụọ ji ụkwụ eje site nʼAram, Bet-Rehob nakwa Zoba. Ha gokwara eze Maaka ya na puku ndị ikom, tinyekwara iri puku ndị ikom na puku abụọ ọzọ site nʼala Tob.
7 Daudi aliposikia, akamtuma Yoabu na jeshi lote la askari.
Mgbe Devid nụrụ nke a, o zipụrụ Joab na ndị agha ya niile bụ dike na dimkpa nʼagha.
8 Waamoni wakatoka na wakafanya mistari ya vita katika maingilio ya lango la mji wao, wakati Washami wa Soba na wale wa Rehobu, na watu wa Tobu na Maaka, wakasimama peke yao uwandani.
Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha. Ma ndị Aram, ndị si Zoba na Rehob, na ndị ikom Tob na Maaka, nọpụrụ onwe ha na mbara ala.
9 Yoabu alipoona mistari ya vita ikimkabili pote mbele na nyuma, alichagua baadhi ya waisraeli wajuao kupigana vizuri na akawapanga dhidi ya Washami.
Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram.
10 Na sehemu iliyosalia ya jeshi, akawaweka chini ya Abishai nduguye, naye akawaweka katika mistari ya vita dhidi ya jeshi la Amoni.
O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, zipụkwa ha izute ndị Amọn nʼagha.
11 Yoabu akasema, “ikiwa Washami watakuwa na nguvu zaidi juu yangu, kisha wewe, Abishai, lazima uniokoe. Lakini ikiwa jeshi la Amoni litakuwa na nguvu zaidi juu yako, nitakuja kukuokoa.
Joab sịrị, “Ọ bụrụ na ndị agha Aram akarịa m ike, pụta bịa nyere m aka; ma ọ bụrụkwanụ na ndị Amọn akarịa gị ike, aga m apụta bịa napụta gị.
12 Iweni na nguvu, nasi tujioneshe kuwa wenye nguvu kwa ajili ya watu wetu na miji ya Mungu wetu, kwa maana Yahwe atatenda yapendezayo kwa ajili ya kusudi lake.
Nwee obi ike, ka anyị lụọ ọgụ a dịka ndị dị ike, nʼihi ndị anyị, na obodo niile nke Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị meekwa ihe dị mma nʼanya ya.”
13 Hivyo Yoabu na askari wa jeshi lake wakasonga mbele katika vita dhidi ya Washami, waliolazimika kukimbia mbele ya jeshi la Israeli.
Mgbe ahụ, Joab na ndị agha so ya bịara nso ibuso ndị Aram agha, ha sitere nʼihu ha gbapụ ọsọ.
14 Jeshi la Amoni lilipoona kwamba Washami wamekimbia, nao pia wakakimbia kutoka kwa Abishai wakarudi ndani ya mji. Ndipo Yoabu akarudi kutoka kwa watu wa Amoni na akarejea Yerusalemu.
Mgbe ndị Amọn hụrụ ka ndị Aram na-agbapụ ọsọ, ha onwe ha gbakwara ọsọ nʼihu Abishai, gbaba nʼime obodo. Ya mere, Joab sitere nʼịlụso ndị Amọn agha lọghachi, bịa na Jerusalem.
15 Washami walipoona kwamba wameshindwa na Israeli, walijikusanya pamoja tena.
Mgbe ndị Aram hụrụ na ndị Izrel tigburu ha; ha lara, chịkọtaa onwe ha ọnụ.
16 Kisha Hadareza akatuma kuleta vikosi vya Washami ng'ambo ya Mto Frati. Wakaja Helamu pamoja na Shobaki, mkuu wa jeshi la Hadareza juu yao.
Hadadeza mere ka a kpọta ndị Aram site nʼofe ọzọ nke Osimiri Yufretis. Ha gara Hilam, ha na ọchịagha ndị agha Hadadeza, a na-akpọ Shobak, onye na-edu ha.
17 Daudi alipoambiwa, aliwakusanya Israeli wote pamoja, akavuka Yordani, na akafika Helamu. Washami wakajipanga katika mistari ya vita dhidi ya Daudi na wakapigana naye.
Mgbe a gwara Devid banyere nke a, ọ chịkọtara ndị Izrel niile, gafee Jọdan, jeruo Hilam. Ndị Aram doro usoro agha ha izute Devid, lụsokwaa ya agha.
18 Washami wakakimbia mbele ya Israeli. Daudi akaua askari mia saba wa magari na askari wa farasi elfu arobaini. Shobaki mkuu wa jeshi lao alijeruhiwa na akafa huko.
Ma ha sitere nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, Devid gburu narị ndị ikom asaa na-anya ụgbọ agha nke ịnyịnya na-adọkpụ. Gbukwaa iri puku ndị agha anọ na-eji ụkwụ eje. O tidara Shobak, bụ ọchịagha ndị agha ha, ọ nwụọ nʼebe ahụ.
19 Wafalme wote waliokuwa watumishi wa Hadareza walipoona kuwa wameshindwa na Israeli, walifanya amani na Israeli na wakawa watumishi wao. Hivyo washami wakaogopa kuwasaidia watu wa Amoni tena.
Mgbe ndị eze niile nọ nʼokpuru ọchịchị Hadadeza hụrụ na Izrel etigbuola ha, ha mere ka ha na ndị Izrel dịrị nʼudo, bụrụkwa ndị nọ nʼokpuru ha. Ya mere, ndị Aram tụrụ egwu inyere ụmụ Amọn aka ọzọ.

< 2 Samweli 10 >