< 2 Wafalme 23 >

1 Hivyo mfalme akawatuma wajumbe waliokuwa wamemzunguka wazee wote wa Yuda na wa Yerusalemu.
Mgbe ahụ, eze zigara ozi kpọkọta ndị okenye Juda na Jerusalem.
2 Kisha mfalme akapanda hadi kwenye nyumba ya Yahwe, na watu wote wa Yuda na wenyeji wote wa Yerusalemu pamoja naye, na makuhani, manabii, na watu wote, kuanzia mdogo hadi mkubwa. Kisha akasoma katika masikioni kwao maneno yote ya kitabu cha agano ambalo lililokuwa limepatikana kwenye nyumba ya Yahwe.
Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị amụma niile, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.
3 Mfalme akasimama karibu na nguzo na kufanya agano mbele ya Yahwe, kutembea pamoja na Yahwe na kukumbuka maagizo yake, kanuni zake, na sheria zake, kwa moyo wake wote na kwa roho yake yote, kuthibitisha maneno ya hili agano ambalo lililokuwa limeandikwa kwenye hiki kitabu. Hivyo watu wote wakakubaliana kusimama kwenye agano
Eze guzoro nʼakụkụ ogidi, kwee nkwa nʼihu Onyenwe anyị, ịgbaso Onyenwe anyị, na iji obi ya niile, na mkpụrụobi ya niile, debe ihe niile o nyere nʼiwu, nʼihe ama ya niile na ụkpụrụ ya niile. O si otu a mee ka okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ e dere nʼakwụkwọ guzosie ike. Mgbe ahụ, ndị mmadụ niile kwekwara nkwa idebe ọgbụgba ndụ ahụ.
4 Mfalme akamwamuru Hilkia yule kuhani mkuu, makuhani chini yake, na walinzi wa lango watoe kwenye hekalu vyombo vilivyokuwa vimetengenezwa kwa ajili ya Baali na Ashera, na kwa ajili ya nyota zote za mbinguni. Akivichoma moto Yerusalimu kwenye mashamba ya bonde la Kidroni na kubeba majivu yake kwenda Betheli.
Eze nyere Hilkaya onyeisi nchụaja na ndị nchụaja na-esote nʼọkwa, na ndị na-eche ọnụ ụzọ mbata, iwu ka ha site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị kwapụtasịa ngwongwo niile e mere nye Baal, na Ashera, na usuu ihe niile nke mbara eluigwe. O sunyere ha niile ọkụ nʼazụ Jerusalem, nʼọhịa dị na Ndagwurugwu Kidrọn, buru ntụ ha bulaa Betel.
5 Akawaondoa makuhani waliokuwa wanaabudu miungu ambao wafalme wa Yuda waliwachagua ili kwa ajili ya kufukiza ubani katika mahali pa juu kwenye miji ya Yuda na sehemu zinazoizunguka Yerusalemu-wale waliokuwa wanchoma ubani kwa Baali, kwa juana kwa mwezi, kwa sayari, na kwa nyota zote za mbinguni.
Ọ chụdara ndị nchụaja arụsị ndị ahụ niile, bụ ndị eze Juda họpụtara isure ihe na-esi isi ụtọ nʼelu ebe dị elu nke obodo Juda nakwa ebe dị ọkụ. Nʼihi na ndị nchụaja ndị a achụọla aja, surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu niile dị nʼobodo dị iche iche na Juda, nakwa ndị dị gburugburu Jerusalem. Ha bụ ndị surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, na anyanwụ, ọnwa na kpakpando, nyekwa usuu niile nke mbara eluigwe.
6 Akaiondoa Ashera kutoka kwenye hekalu la Yahwe, nje ya Yerusalemu hata bonde la Kidroni na kuichoma hapo. Akaipiga kwenye mavumbi na kuiyatupa yale mavumbi kwenye makaburi ya watu wa kawaida.
O sikwa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ ogidi chi Ashera, wezuga ya nʼazụ Jerusalem, na Ndagwurugwu Kidrọn. Ebe ahụ ka ọ nọ suo ya ọkụ, supịa ya ka ọ ghọọ ntụ, fesaa ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu.
7 Akavisafisha vyumba vya makahaba ambao walikuwa kwenye hekalu la Yahwe, ambako wanawake waliposhonea nguo kwa ajili ya Ashera
Ọ kwadakwara ụlọ obibi ụmụ ndị ikom na-agba akwụna dị nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼebe ndị inyom na-anọ na-akpara Ashera akwa.
8 Yosia akawaleta makuhani wote nje ya miji ya Yuda na kupanajisi mahali pa juu ambako makuhani walipokuwa wakichomea ubani, kutoka Geba hata Bersheba. Akapaharibu mahala pa juu kwenye malango ambayo yaliyokuwa ya kuingilia kwenda kwenye lango la Yoshua (liwali wa mji), upande wa kushoto wa lango la mji.
O mere ka ndị nchụaja niile site nʼobodo Juda niile bịa, o merụkwara ebe ịchụ aja niile nke dị elu, site na Geba ruo Bịasheba, ebe ndị nchụaja ndị a nọrọ suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ọ kwatụrụ ọnụ ụzọ ama nke dị nʼebe ọnụ ụzọ ama Joshua, onye bụ gọvanọ obodo, nke dị nʼakụkụ aka ekpe nke ọnụ ụzọ ama obodo.
9 Ingawa makuhani wa mahali pa juu hawakuruhusiwa kuhudumu kwenye madhabahu ya Yahwe katika Yerusalemu, wakala mikate isiyotiwa chachu miongoni mwa ndugu zao.
Ma e kweghị ka ndị nchụaja ahụ jee ozi nʼụlọnsọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ma o nyere ha ike iso ndị nchụaja ndị ọzọ rie achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
10 Yosia akainajisi Tofethi, ambayo ipo kwenye bonde la Ben Hinomu, ili kwamba mtu yeyote asimuweke mtoto wake wa kiume au binti yake kwenye moto kama sadaka kwa Molaki.
Josaya merụrụ Tofet, laa ya nʼiyi. Tofet bụ ebe ịchụ aja dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. O mere nke a igbochi mmadụ ọbụla iji nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị chụọrọ chi Molek aja nsure ọkụ.
11 Akawachukua farasi ambao wafalme wa Yuda waliokuwa wametolewa kwa ajili ya jua. Walikuwa kwenye eneo la lango la uingilia kwenye hekalu la Yahwe, karibu na chumba cha Nathani Meleki, msimamizi mkuu wa nyumba ya mfalme. Yosia akayachoma yale magari ya farasi ya jua
O sitere nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị wepụ ịnyịnya ndị ahụ ndị eze Juda doro nsọ nye anyanwụ. Ịnyịnya ndị a dị nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị nʼebe dị nso nʼụlọ onyeozi aha ya bụ Netan-Melek. Josaya kpọrọ ụgbọ agha ndị a niile e doro nsọ nye anyanwụ ọkụ.
12 Yosia mfalme akayaharibu madhabahu yaliyokuwa kwenye dari ya juu ya chumba cha Ahazi, ambacho wafalme wa Yuda walikitengeneza, na madhabahu ambayo Manase aliyatengeneza kwenye behewa mbili za nyumba ya Yahwe. Yosia akazivunga vipande vipande na kuvitupa kwenye bonde la Kidroni.
Josaya kwadara ebe ịchụ aja niile nke ndị eze Juda wukwasịrị nʼelu ụlọeze, nʼelu elu ụlọ Ehaz. Ọ kwadakwara ebe ịchụ aja niile nke Manase wuru nʼime ogige abụọ nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, kporo ha kpofuo nʼime Ndagwurugwu Kidrọn.
13 Mfalme akapaangamiza mahali pa juu magharibi mwa Yerusalemu, kusini mwa mlima wa uharibifu ambapo Sulemani mfalme wa Israeli alipajenga kwa ajili ya Ashtorithi, chukizo la Wamoabu; sanamu za karaha za Wasidoni; kwa Kemoshi, sanamu za karaha wa Moabu; na kwa Moleki, sanamu wa karaha wa watu wa Amoni.
Eze merụkwara ebe ịchụ aja niile dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo Jerusalem nʼakụkụ ndịda nke Ugwu Mbibi, nke Solomọn eze Izrel wuru nye chi Ashtọret, ihe arụ ndị Saịdọn, na chi Kemosh, ihe arụ ndị Moab, na chi Molek, ihe arụ ụmụ Amọn.
14 Akazivunja nguzo za jiwe kuwa vipande vipande na kuziangusha chini nguzo za Ashera na kuzijaza zile sehemu kwa mifupa ya watu.
Josaya kwadakwara ogidi nkume niile, gbutuo ihe arụsị Ashera niile, werekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ wụsa nʼelu ala ahụ niile.
15 Yosia pia akaiteketeza kabisa madhabahu iliyokuwa Betheli na mahali pa juu ambako Yeroboamu mwana wa Nebati (ambaye aliwafanya Waisraeli kuasi) aliijenga. Pia aliichoma moto ile madhabahu na mahali pa juu na kupapiga hadi pakawa vumbi. Pia akaichoma moto nguzo ya Ashera.
Josaya kwadakwara ogidi niile dị na Betel, nke Jeroboam nwa Nebat wuru mgbe o dubara ndị Izrel na mmehie. Ọ kwadara ebe ịchụ aja dị nʼebe ahụ, kụjisie nkume e doro nʼebe ahụ, gwerie ha dịka ntụ. Ọ kpọkwara arụsị Ashera ọkụ.
16 Yosia alipotazama kwenye lile eneo, akagundua kwamba yale makaburi yalikuwa juu ya mlima. Akawatuma watu kuichukua mifupa kutoka kwenye yale makaburi; kisha akaichoma kwenye madhabahu, akainajisi. Hii ilitokana na neno la Yahwe ambalo mtu wa Mungu aliliongea, yule mtu aliyekuwa ameongea haya mambo kabla.
Josaya legharịkwara anya gburugburu hụ ọtụtụ ili dị nʼelu ugwu. O ziri ndị ohu ya ka ha gaa chịpụtasịa ọkpụkpụ dị nʼili ahụ niile, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja imerụ ya, dịka okwu Onyenwe anyị si dị, nke onye nke Chineke kwupụtara mgbe o buru amụma banyere ihe ndị a.
17 Kisha akasema, “Ni ukumbusho wa nani ule ninao uona?” Mtu wa ule mji akamwambia, “Lile ni kaburi la mtu wa Mungu ambaye alikuja kutoka Yuda na kuongea kuhusu haya mambo ambayo ameyafanya dhidi ya madhabahu ya Betheli.”
Josaya jụrụ ndị guzo nʼebe ahụ ajụjụ sị, “Ọ bụ ili onye bụ nke a?” Ndị ikom obodo ahụ zara sị, “Ọ bụ ili onye nke Chineke ahụ si Juda bịa buo amụma megide ebe ịchụ aja Betel. O buru amụma na ihe ndị a ị na-eme ebe ịchụ aja a ga-emezu.”
18 Hivyo Yosia akasema, “Mwacheni. Mtu asihamishe mifupa yake.” Hivyo wakaacha mifupa yake, pamoja na mifupa ya nabii ambaye alikuja kutoka Samaria.
Mgbe ahụ, Josaya zara sị ha, “Hapụnụ ya ka o guzoro onwe ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịchịpụta ọkpụkpụ ya.” Ha hapụrụ ọkpụkpụ ya, hapụkwa ọkpụkpụ onye amụma ahụ si Sameria bịa.
19 Kisha Yosia akahamisha nyumba zote za mahali pa juu ambazo zilikuwa katika mji wa Samaria, ambazo wafalme wa Israeli walizokuwa wamezitengeneza, na ambazo zilizokuwa zimemgadhabisha Yahwe kwa hasira.
Dịka o mere na Betel, otu a ka Josaya wepụrụ ma merụkwaa ebe ịchụ aja niile dị nʼebe niile dị elu nke ndị eze Izrel wuru nʼobodo niile nke Sameria, bụ ebe ịchụ aja kpasuru Onyenwe anyị iwe.
20 Aliwafanyia kile ambacho kilikuwa kimefanyika katika Betheli. Aliwachinja makuhani wote wa mahali pa juu ya madhabahu na aliichoma mifupa ya watu juu yao. Kisha akarudi Yerusalemu.
O gburu ndị nchụaja chi ndị a niile nʼelu ebe ịchụ aja ha, suo ọkpụkpụ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ha. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, ọ laghachiri na Jerusalem.
21 Kisha mfalme akawaamuru watu wote, akisema, “Itunzeni Pasaka ya Yahwe Mungu wenu, kama ilivyoandikwa kwenye hiki kitabu cha agano.”
Eze nyere ndị Juda niile iwu sị ha, “Meerenụ Onyenwe anyị Chineke unu Mmemme Ngabiga, dịka e dere ya nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ a.”
22 Hiyo Pasaka haijawahi kufanyika tangu siku za waamuzi ambao waliiongoza Israeli, wala katika siku zote za wafalme wa Israeli au Yuda.
O nwebeghị mgbe e mere ụdị Mmemme Ngabiga dịka nke a nʼoge ọbụla, site nʼụbọchị ndị ikpe bụ ndị duru Izrel maọbụ nʼụbọchị ndị eze Izrel na eze niile chịrị Juda, ọ dịghị nke yiri Mmemme Ngabiga a.
23 Lakini katika mwaka wa kumi na nane wa Mfalme Yosia hii Pasaka ya Yahwe ilisheherekewa katika Yerusalemu.
Ma ọ bụ nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị eze Josaya, nʼime Jerusalem ka a nọ mee Mmemme Ngabiga a nye Onyenwe anyị.
24 Yosia pia akawafukuza wale ambao waliokuwa wameongea na wafu au na roho. Pia aliifukuza miungu ya sananmu, sanamu, na vitu vyote ambavyo ni chukizo vilivyokuwa vinaonekana katika nchi ya Yuda na katika Yerusalemu, hivyo kwa kuthibitisha yale maneno ya sheria ambayo iliyokuwa imeandikwa kwenye kitabu cha Hilkia yule kuhani aliyekuwa amepatikana kwenye nyumba ya Yahwe.
Ọzọkwa, Josaya gara nʼihu kpochapụ ndị niile na-ajụta mmụọ ọjọọ ase, na ndị dibịa afa, na arụsị ezinaụlọ dị iche iche, na arụsị a pịrị apị, na ihe arụ niile nke a hụrụ nʼime Juda na Jerusalem niile. O mere nke a ka e mezuo ihe niile e dere nʼime akwụkwọ ahụ Hilkaya onye nchụaja chọtara nʼụlọ Onyenwe anyị.
25 Kabla ya Yosia, hapakuwa na mfalme kama yeye, aliyekuwa amemwelekea yahwe kwa moyo wake wote, roho yake yote, na nguvu zake zote, ambaye alifuata sheria zote za Musa. Hapakuwa na mfalme kama Yosia aliyeinuka baada ya yeye.
Ọ dịghị eze ọzọ nʼime ndị niile buru ya ụzọ chịa nke dịka Josaya, onye chigharịkwutere Onyenwe anyị. Onye ji obi ya niile, na mmụọ ya niile na ike ya niile debe iwu niile e nyere Mosis. Ọ dịkwaghị eze ọzọ dịka ya, onye biliri mgbe ọ nwụsịrị.
26 Walakini, Yahwe hakugeuka kutoka kwenye ukali wa hasira yake, ambayo ilikuwa dhidi ya Yuda kwa waabudu wapagani wote pamoja ambao Manase aliokuwa amemgadhibisha.
Ma ihe ndị a emeghị ka iwe ọkụ Onyenwe anyị na-ewe megide Juda dajụọ, bụ iwe a kpasuru ya nʼihi ihe ọjọọ niile nke Manase mere.
27 Hivyo Yahwe akasema, “Pia nitaiondoa Yuda usoni kwangu, kama nilivyoiondoa Israeli, na nitautupilia mbali huu mji ambao nilio uchagua, Yerusalemu, na ile nyumba ambayo niliyokuwa nimesema, 'Jina langu litakuwa humo.”'
Ya mere, Onyenwe anyị sịrị, “Aga m ekpochapụ Juda niile site nʼihu m, dịka m si kpochapụ Izrel niile. Aga m ajụkwa obodo ahụ m họpụtara, bụ Jerusalem, jụkwa ụlọnsọ ukwu a nke m kwuru banyere ya sị, ‘Nʼime ya ka Aha m ga-adị.’”
28 Kama kwa mambo mengine yanayo muhusu Yosia, kila kitu alichofanya, je vimeandikwa kwenye kitabu cha matukio ya wafalme wa Yuda?
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Josaya na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
29 Katika siku zake, Farao Neko, mfalme wa Misri, alienda kupigana dhidi ya mfalme wa Ashuru huko mto Frati. Mfalme Yosia akaenda kuonana na Neco katika mapigano, na Neko akamuua huko Megido.
Nʼoge Josaya bụ eze, Fero Neko, eze Ijipt, gbagoro gaa nʼakụkụ osimiri Yufretis inyere eze Asịrịa aka. Eze Josaya pụkwara izute ya nʼagha, ma Neko zutere ya nʼagha, gbuo ya na Megido.
30 Watumishi wa Yosia wakambeba kwenye gari la farasi akiwa amekufa kutoka Migido, kumleta Yerusalemu, na kumzika katika kaburi lake mwenyewe. Kisha watu wa nchi wakamchukua Yehoahazi mwana wa Yosia, wakamtia mafuta, na kumfanya kuwa mfalme katika mahali pake.
Ndị na-ejere Josaya ozi sị na Megido buru ozu ya nʼime ụgbọ agha bulata ya na Jerusalem, lie ya nʼili nke aka ya. Ndị ala ahụ kpọọrọ Jehoahaz nwa nwoke Josaya, tee ya mmanụ, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya.
31 Yehoahazi alikuwa na umri wa miaka ishirini na tatu alipoanza kutawala, na alitawala miezi mitatu katika Yerusalemu. Mama yake alikuwa akiitwa Hamutali; alikuwa binti wa Yeremia wa Libana.
Jehoahaz gbara iri afọ abụọ na atọ mgbe o bidoro ịchị, ma ọ chịrị na Jerusalem ọnwa atọ. Aha nne ya bụ Hamutal, nwa Jeremaya onye Libna.
32 Yehoahazi alifanya yaliyo maovu usoni kwa Yahwe, kama kila kitu ambacho babu zake walichokifanya.
O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ndị eze buru ya ụzọ.
33 Farao Neko akamfunga gerezani huko Ribla katika nchi ya Hamathi, hivyo asiweze kutawala katika Yerusalemu. Kisha Neko akaitoza Yuda talanta mia moja za fedha na talanta moja ya dhahabu.
Ma Fero Neko keere ya agbụ na Ribla nʼala Hamat, ime ka ọ ghara ịchịkwa na Jerusalem. Neko kwagidere ndị Juda ka ha tụọrọ ya ụtụ narị talenti ọlaọcha, na otu talenti ọlaedo.
34 Farao Neko akamfanya Eliakimu mwana wa Yosia mfalme katika mahali pa Yosia baba yake, na kubadilisha jina lake kuwa Yehoyakimu. Lakini akamchukua mfalme Yehoahazi kwenda Misri, na Yehoahazi akafia huko.
Fero Neko mere Eliakịm nwa nwoke Josaya, eze, nʼọnọdụ Josaya bụ nna ya. Ọ gụgharịrị aha Eliakịm ka ọ bụrụ Jehoiakim. Ma o duuru Jehoahaz gaa Ijipt, ebe ọ nọ nwụọ.
35 Yehoyakimu akalipa fedha na dhahabu kwa Farao. Ili akutane na amri ya Farao, Yehoyakimu akaitoza nchi na kulazimisha kila mtu miongoni mwa watu wa nchi wamlipe fedha na dhahabu kulingana na makadirio yao.
Jehoiakim kwụrụ Fero Neko ọlaọcha na ọlaedo ahụ ọ nara nʼaka ya. Ka o nwee ike mee nke a, o kere ụtụ nʼala ahụ, werekwa ike nara ndị ala ahụ ọlaọcha na ọlaedo, dịka mkpebi ha si dị banyere ihe onye ahụ ga-akwụ.
36 Yehoyakimu alikuwa na umri wa miaka ishirini na tano alipoanza kutawala, na alitawala miaka kumi na moja katika Yerusalemu. Mama yake alikuwa akiitwa Zebida; alikuwa binti wa Pedaia wa Ruma.
Jehoiakim gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zebida nwa Pedaya, onye Ruma.
37 Yehoyakimu akafanya yale yaliyo maovu usoni kwa Yahwe, kama waliyoyafanya babu zake.
O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, dịka ihe niile nna ya ha ndị bu ya ụzọ mere.

< 2 Wafalme 23 >