< 1 Samweli 25 >

1 Basi Samweli akafariki. Waisraeli wote wakakusanyika pamoja na kumwomboleza, na wakamzika nyumbani kwake huko Rama. Kisha Daudi akainuka na akashuka hadi jangwa la Parani.
Emesịa Samuel nwụrụ. Izrel niile chịkọtara onwe ha ọnụ zukọta ruo ụjụ nʼihi ọnwụ ya. Ha liri ya nʼụlọ ya dị na Rema. Emesịa, Devid gara nʼọzara Paran biri nʼebe ahụ.
2 Kulikuwa na mtu mmoja huko Maoni, na mali zake zilikuwa huko Karmali. Mtu huyo alikuwa tajiri sana. Alikuwa na kondoo elfu tatu na mbuzi elfu moja. Naye alikuwa akiwakata manyoya kondoo wake huko Karmeli.
Otu nwoke dị, onye obodo Maon, onye ikwu Kaleb, nke nwere akụnụba. O nwere igwe atụrụ dị puku atọ, na otu puku ewu, ndị ọ nọ nʼubi nʼoge a na-akpụchapụ ajị ha nʼobodo Kamel.
3 Na mtu huyo aliitwa Nabali, na jina la mke wake aliitwa Abigaili. Mwanamke huyo alikuwa mwenye busara na mzuri kwa sura. Lakini mwanaume alikwa mkaidi na mwovu katika mambo yake. Alikuwa wa uzao wa nyumba ya Kalebu.
Aha nwoke a bụ Nebal. Nwunye ya kwa, onye bụ nwanyị mara mma, na onye nwere akọnuche, ka a na-akpọ Abigel. Nwoke a nwere omume ọjọọ; ọ kwara obi nʼazụ, afọ takwara ya mmiri.
4 Daudi akasikia akiwa jangwani kwamba Nabali alikuwa akiwakata manyoya kondoo wake.
Mgbe Devid nọ nʼọzara nụ na Nebal na-akpụcha ajị igwe ewu na atụrụ ya,
5 Hivyo Daudi aliwatuma kwake vijana kumi. Akawaambia wale vijana, “Pandeni kwanda Karmeli, mwendeeni Nabali, na mkamsalimie kwa jina langu.
o zipụrụ ndị ikom iri sị ha. “Jekwurunụ Nebal nʼobodo Kamel, jụọ ya otu ihe si aga nʼaha m.
6 Mtamwambia, 'Uishi katika baraka, Uwe na amani na nyumba yako iwe na amani, na wote ulionao wawe na amani.
Sịnụ ya, ndụ gị, ndụ ogologo, udo na ahụ ike nye gị na ezinaụlọ gị, udo na ahụ ike nye ihe niile i nwere.
7 Nasikia kwamba unao wakata manyoya. Wachungaji wako walikuwa pamoja nasi, na hatukuwafanyia ubaya, na muda wote wakiwa Karmeli hawakupotelewa kitu chochote.
“‘Anụla m na ị na-akpacha ajị igwe ewu na atụrụ gị. Oge ndị ọzụzụ atụrụ gị nọ nʼetiti anyị, anyị emejọghị ha, o nweghị ihe ọbụla funarịrị ha oge ahụ niile ha nọrọ nʼobodo Kamel.
8 Waulize vijana wako, nao watakuambia. Basi vijana wangu wapate kibali machoni pako, maana tumefika siku ya sherehe. Tafadhali utoe cho chote ulicho nacho mkononi kwa watumishi wako na kwa Daudi mwanao.'”
Jụọkwa ndị ikom gị, ha ga-agwa gị ma ihe m kwuru ọ bụ eziokwu. Ya mere gosi ụmụ okorobịa ndị a ihuọma, ebe ọ bụ na ha na-abịakwute gị nʼoge mmemme. Biko, nyetụ ndị ohu gị ndị a, na mụ bụ Devid nwa gị, ihe ọbụla aka gị ruru.’”
9 Vijana wa Daudi walipofika, walimwambia Nabali yote haya kwa niaba ya Daudi na kisha wakasubiri.
Ụmụ okorobịa Devid zipụrụ bịarutere zie Nebal ozi Devid ziri ha. Ha nọgidekwara chere ka onye ha ọsịsa.
10 Nabali akawajibu watumishi wa Daudi, “Daudi ni nani? Na ni nani mwana wa Yese? Siku hizi wapo watumishi wengi wanaotoroka bwana zao.
Ma Nebal jụrụ ha sị, “Onye bụ Devid? Onye bụkwa nwa Jesi a? Ọtụtụ ndị ohu dị taa bụ ndị na-esi nʼaka nna ha ukwu na-agbapụ.
11 Je, nichukue mkate wangu na maji yangu na nyama yangu ambayo nimewachinjia wakata manyoya wangu, na niwape watu wanaotoka nisikokujua?”
M ga-ewere achịcha m, na mmiri m, na anụ m gburu nʼihi ndị na-akpachara m ajị anụ nye ndị m na-amaghị ebe ha sị pụta?”
12 Hivyo vijana wa Daudi waligeuka na kurudi, nakumwambia kila kitu kilichosemwa.
Ndị ikom Devid tụgharịrị azụ laghachi ebe ha si bịa. Mgbe ha bịarutere, ha kọrọ akụkọ banyere okwu niile Nebal kwuru.
13 Daudi akawaambia watu wake, “Kila mtu ajifunge upanga wake.” Kila mtu akajifunga upanga wake. Daudi naye pia akajifunga upanga wake. Yapata kama watu mia nne wakafuatana na Daudi, na wengine mia mbili walibaki kulinda mizigo yao.
Devid sịrị ndị ikom ya, “Onye ọbụla nyara mma agha!” Ha mere ihe o kwuru. Devid nʼonwe ya nyanyekwara mma agha nke ya. Ihe dị ka narị ndị ikom anọ sooro Devid pụọ, ebe narị mmadụ abụọ ndị ọzọ nọdụrụ na-eche ụlọ ha nche.
14 Lakini kijana mmojawapo alimwambia Abigaili, mke wa Nabali akasema, “Daudi aliwatuma wajumbe kutoka jangwani waje wamsalimu bwana wetu, na yeye akawatukana.
Ma otu nʼime ndị ikom Nebal gara kọọrọ Abigel, nwunye Nebal sị ya, “Lee, Devid esitela nʼọzara zite ndị ozi ka ha nye onyenwe anyị ekele ya, ma ọ kparịrị ha, baakwara ha mba.
15 Bado watu hawa walitutendea mema. Hatukudhurika na hatukupoteza chochote wakati wote tulipotembea nao tulipokuwa mbugani.
Ma ndị ikom ndị a mesoro anyị mmeso ọma, ha emejọghị anyị. Oge ahụ niile anyị nọ ha nso nʼọhịa ọ dịghị ihe funarịrị anyị.
16 Walikuwa ukuta wetu usiku na mchana, wakati wote tulikuwa pamoja nao tukichunga kondoo.
Ehihie na abalị, ha bụụrụ anyị mgbidi, ichebe anyị na atụrụ anyị, mgbe ha na-akpa nri nʼakụkụ ebe ha nọ.
17 Kwa hiyo tambua hili na zingatia utafanya nini, maana ubaya unamvizia bwana wetu, na utakuwa juu ya nyumba yake yote. Yeye ni mtu asiyefaa na hakuna awezaye kushauriana naye.”
Ọ dị mma ka ị mata ma marakwa ihe ị ga-eme ngwangwa; nʼihi nsogbu dị njọ nke na-aga ịdịrị nna anyị ukwu na ezinaụlọ ya niile. Nʼihi ọ bụ nwoke jọgburu onwe ya, na ọ dịghị onye pụrụ ịgwa ya okwu.”
18 Ndipo Abigaili akaharakisha na akachukuwa mikate mia mbili, chupa mbili za divai, kondoo watano waliokwisha andaliwa, vipimo vitano vya bisi, vishada mia moja vya zabibu, na mikate mia mbili ya tini na akavipakia juu ya punda.
Abigel mere ngwangwa chịkọta narị ogbe achịcha abụọ, karama akpụkpọ mmanya abụọ, atụrụ ise e doziri edozi, otu bushel ọka e ghere eghe, otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị achịcha fiig abụọ, bukwasị ihe ndị a niile nʼelu ịnyịnya ibu.
19 Akamwambia kijana wake, “Tangulia mbele yangu, nami nitakuja nyuma yako.” Lakini hakumwambia mmewe Nabali.
Ọ sịrị ụmụ okorobịa na-ejere ya ozi, “Na-aganụ nʼihu, ana m abịa nʼazụ.” Ma ọ gwaghị di ya Nebal ihe ọ na-aga ime.
20 Alipokuwa akienda juu ya punda wake na kutelemka penye kificho cha mlima, Daudi na watu wake walishuka chini wakimwelekea Abigaili, naye akakutana nao.
Mgbe ọ nọ nʼelu ịnyịnya ibu na-agbada ụzọ nke ugwu ahụ ọ hụrụ Devid na ndị agha ya ka ha na-abịa. O zutere ha
21 Basi Daudi alikuwa amesema, “Hakika nimelinda bure vyote alivyonavyo mtu huyu huko nyikani, na vyote alivyonavyo hakuna kilichopotea, pamoja na hayo amenilipa mabaya badala ya mema.
ma Devid nọrịị na-ekwu na-asị, “Ọ bụ nʼefu ka anyị nyeere nwoke a aka. Anyị chebere igwe ewu na atụrụ ya nʼọzara; ọ dịkwaghị otu furu efu, ọ dịkwaghị otu nke e zuru ezu, ma o jirila ajọ omume kwụghachi m ihe ọma m meere ya.
22 Mungu na anitendee hivyo mimi, Daudi, pia iwe zaidi, iwapo nitamwacha hata mtu mmoja wa kwake akiwa hai ifikapo kesho asubuhi.
Ka Chineke mesoo Devid mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ahapụ otu mkpụrụ nwoke ndụ nʼetiti ihe niile o nwere na-eku ume, mgbe chi echi bọrọ.”
23 Abigaili alipomwona Daudi, aliharakisha na kushuka chini ya punda wake, akalala kifudifudi na kujiinamisha hadi chini.
Mgbe Abigel hụrụ Devid, o mere ngwangwa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịda, kpuo ihu nʼala, kpọọ isiala nye Devid.
24 Akamwangukia miguuni pake na kusema, “Juu yangu tu, bwana wangu, na uwe uovu. Tafadhali acha mjakazi wako aseme nawe, tena uyasikilize maneno ya mjakazi wako.
Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, sị, “Ka ajọ omume ahụ dịkwasị nʼisi ohu gị, onyenwe m. Biko, kwere ka ohu gị gwa gị okwu, gekwaa ntị nʼihe ohu gị nwere ikwu.
25 Nakusihi bwana wangu usimjali mtu huyu asiyefaa, Nabali, kwa maana kama jina lake lilivyo, ndivyo alivyo. Jina lake ni Nabali, na upumbavu uko pamoja naye. Lakini mimi mjakazi wako sikuwaona vijana wa bwana wangu, uliowatuma.
Nebal bụ nwoke nwere obi ọjọọ, biko ka onyenwe m ghara ịgụ ihe ọbụla o kwuru nʼihe. Ọ bụ onye nzuzu, dịka aha ya na-egosi. Aha ya pụtara nzuzu, nzuzu na-esokwa ya. Ma ahụghị m ndị ozi ahụ i zitere, nʼezie ohu gị ahụghị ndị ikom onyenwe m zitere.
26 Sasa basi, bwana wangu, kama BWANA aishivyo, na kama unavyoishi, kwa kuwa BWANA amekuondoa kutoka kumwaga damu, na kuacha kulipiza kisasi kwa mkono mwenyewe, basi adui zako, na wale ambao wanatafuta kumfanyia uovu bwana wangu, wawe kama Nabali
Ugbu a, onyenwe m, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ ma gị onwe gị na-adịkwa ndụ, ebe ọ bụ na Onyenwe anyị gbochiri gị ka ị ghara ịba nʼikpe ọmụma nke igbu mmadụ, na iji aka gị bọrọ onwe gị ọbọ, ka ndụ ndị iro gị na ndị niile na-achọ ime onyenwe m ihe ọjọọ, dịka Nebal.
27 Na sasa zawadi hii ambayo mjakazi wako ameileta kwa bwana wangu, na wapewe vijana ambao wanamfuata bwana wangu.
Ma kwerekwa ka onyinye a, nke ohu gị nwanyị wetaara nna m ukwu, bụrụ nke a ga-enye ndị ikom na-eso gị.
28 Tafadhali ulisamehe kosa la mjakazi wako, maana BWANA hakika atamfanyia bwana wangu nyumba imara, kwa sababu bwana wangu anapigana vita vya BWANA; na uovu hautaonekana ndani yako maadamu unaishi.
“Biko, gbaghara njehie ohu gị nwanyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị aghaghị imere onyenwe m alaeze nke ga-adịgide, nʼihi na ọ bụ agha Onyenwe anyị ka ị na-alụ, agaghị ahụta ajọ omume nʼime gị ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
29 Na ingawa watu wangeinuka na kukuandama ili wakuue, bado uhai wa bwana wangu utafungwa katika furushi la walio hai na BWANA Mungu wako; na atayatupa maisha ya adui zako mbali, kama vile kutoka katika mfuko wa kombeo.
Ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ ị na-achụ gị ịnapụ gị ndụ gị, ma ndụ onyenwe m ga-abụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị ga-ekechi na ngwungwu ndị dị ndụ. Ma ndụ ndị iro gị ka ọ ga-atụfu dịka nkume esi nʼakpa e ji efe ebe.
30 Na itakuwa, BWANA atakapokuwa amemtimizia bwana wangu mambo yote mazuri ambayo amekuahidi, na alivyokufanya kiongozi juu ya Israeli,
Mgbe Onyenwe anyị mezuru nye onyenwe m ihe ọma niile nke o kwere na nkwa, meekwa ya onyendu ndị Izrel,
31 jambo hili halitakuwa huzuni kwako, wala chukizo moyoni kwa bwana wangu, kwa sababu hukumwaga damu bila sababu, na hujajilipizia kisasi. Na BWANA akikuletea mafanikio, umkumbuke mjakazi wako.”
onyenwe m agaghị enwe akọnuche nke ga na-esogbu ya nʼihi na o ji aka ya bọọrọ onwe ya ọbọ, maọbụ nke iwufu ọbara. Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị mere ka ihe gaara onyenwe m nke ọma, chetakwa ohu gị nwanyị.”
32 Ndipo Daudi akamwambia Abigaili, “BWANA, Mungu wa Israeli, abarikiwe, aliyekutuma uonane na mimi leo.
Devid zara Abigel sị ya, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel onye zitere gị taa ka ị bịa zute m.
33 Na hekima yako ibarikiwe, nawe umebarikiwa, kwa sababu leo umenizuia nisiwe na hatia ya kumwaga damu, na kutojilipizia kisasi kwa mkono wangu mwenyewe.
Ka ngọzị dịrị gị nʼihi ezi uche gị, na nʼihi na i gbochiri m iwufu ọbara taa, gbochiekwa m iji aka m bọrọ onwe m ọbọ.
34 Kwa kweli, kama BWANA, Mungu wa Israeli, aishivyo, ambaye amenizuia nisikuumize, kama usinge harakisha kuja ukutane nami, kwa hakika kesho asubuhi asinge salia hata mtoto mmoja wa kiume kwa Nabali.”
Ma ọ bụghị otu a, dịka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel na-adị ndụ, bụ onye jidere m site nʼimerụ gị ahụ, ọ bụrụ na ị pụtaghị ngwa izute m, ọ dịghị otu nwoke gaara adị ndụ nʼụlọ Nebal nʼìhè ụtụtụ echi.”
35 Kwa hiyo Daudi akavipokea kutoka mkononi mwake vile alivyokuwa amemletea; akamwambia, “Nenda kwa amani hadi nyumbani kwako; tazama, nimeisikiliza sauti yako na nimekubali.”
Devid naara ya ihe ndị ahụ niile o wetara sị ya, “Laghachi nʼụlọ gị nʼudo. Anụla m ihe i kwuru ma meekwa ihe ị rịọrọ.”
36 Abigaili akarudi kwa Nabali; tazama, alikuwa akifanya sherehe katika mji wake, kama sherehe ya mfalme; na moyo wa Nabali ulifurahi ndani yake, kwa sababu alikwa amelewa sana. Kwa hiyo hakumwambia chochote kabisa hadi kulipopambazuka
Mgbe Abigel batara nʼụlọ, o jekwuru Nebal ebe ọ nọ nʼoriri ọ kpọrọ, oriri dịka oriri a na-enwe nʼụlọeze. Ọ ṅụọkwala mmanya ṅụbigakwa ya oke; nʼihi ya ọ gwaghị ya ihe ọbụla tutu ruo nʼụtụtụ.
37 Ikawa asubuhi, divai ilipokuwa imemtoka Nabali, basi mkewe akamwambia mambo hayo; moyo wake ukafa ndani yake, na akawa kama jiwe.
Nʼụtụtụ, mgbe mmanya pụrụ Nebal nʼanya, nwunye ya gwara ya ihe ndị a niile. Nke a mere ka obi ya nwụọ, ka ọ tọgbọrọ dịka nkume.
38 Ikawa baada ya siku kumi BWANA alimpiga Nabali naye akafa.
Mgbe abalị iri gafere, Onyenwe anyị tiri Nebal ihe otiti, nke mere ka ọ nwụọ.
39 Naye Daudi aliposikia kwamba Nabali amekufa, akasema, “BWANA abarikiwe, aliyenichukulia hatua ya shutuma yangu kutoka mkono wa Nabali, na kumzuia mtumishi wake asifanye maovu. Na amemrudishia Nabali tendo la uovu juu ya kichwa chake mwenyewe.” Ndipo Daudi akawatuma watu wakaongee na Abigaili, ili amchukue awe mke wake.
Mgbe Devid nụrụ na Nebal anwụọla, ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye kpechitere m okwu m megide Nebal nʼihi nlelị anya o leliri m. O gbochiela ohu ya site nʼime ihe ezighị ezi, ma kwụghachi Nebal ụgwọ mmehie ya.” Mgbe ahụ Devid zigara ndị ozi ka ha gaa jụọ Abigel ma ọ ga-ekwe ị ghọọ nwunye ya.
40 Watumishi wake Daudi walipofika kwa Abigaili huko Karmeli, wakaongea naye na kusema, “Daudi ametutuma kwako tukuchukue hadi kwake uwe mke wake.”
Ndị ozi Devid bịakwutere Abigel na Kamel zie ya ozi sị, “Devid zitere anyị bịakwute gị ịlụta gị ka ị ghọọ nwunye ya.”
41 Abigaili aliinuka, akainamisha uso chini, na akasema, “Tazama, mjakazi wako ni mtumwa aoshaye miguu ya watumishi wa bwana wangu.”
Abigel kpuru ihu nʼala sị ya, “Lee ohu gị nwanyị, ejikeere m ijere gị ozi, na ịsacha ụkwụ ndị na-ejere onyenwe m ozi.”
42 Akaharakisha na kuamka, akapanda punda akiwa na vijakazi wake watano waliofuatana naye; akawafuata wajumbe wa Daudi, na akawa mke wake.
Abigel mere ngwangwa jikere, kpọrọ ụmụ agbọghọ ise na-ejere ya ozi, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, soro ndị ahụ Devid zitere lakwuru Devid. Otu a ka Abigel sị ghọọ nwunye Devid.
43 Daudi pia alimchukua Ahinoamu wa Yezreeli akamwoa; wote wawili wakawa wake zake.
Devid lụkwara nwanyị ọzọ aha ya bụ Ahinoam, onye Jezril. Ha abụọ bụkwa ndị nwunye ya.
44 Wakati huo Sauli alikuwa amempa Palti, mwana wa Laishi mtu wa Galimu, Mikali, binti yake, aliyekuwa mke wa Daudi.
Nʼoge a, Sọl ewerela nwa ya nwanyị Mikal, onye bụ nwunye Devid kpọnye Palti, nwa Laish, onye obodo Galim, dịka nwunye.

< 1 Samweli 25 >