< 1 Samweli 16 >
1 BWANA akamwambia Samweli, “Utamlilia Sauli kwa muda gani, ikiwa nimemkataa asiwe mfalme juu ya Israeli? Ijaze pembe yako mafuta na uende. Nitakutuma kwa Yese akaaye Bethlehemu, maana nimejichagulia mfalme katika wanawe.
Emesịa Onyenwe anyị sịrị Samuel, “Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide na-eru ụjụ nʼihi Sọl, ebe ọ bụ na m ajụla ya dịka eze ndị Izrel? Ugbu a, gbajuo mmanụ na mpi gị, bilie ije. Ana m eziga gị ka ijekwuru Jesi onye Betlehem, ahọrọla m otu onye ga-abụ eze site nʼetiti ụmụ ya ndị ikom.”
2 Samweli akasema, “Jinsi gani nitaenda? Kama Sauli akisikia jambo hili, ataniua.” BWANA akasema, “chukua mtamba na useme, 'Nimekuja kutoa dhabihu kwa BWANA.'
Ma Samuel zara sị, “Oleekwanụ otu m ga-esi gaa nʼebe ahụ? Ọ bụrụ na Sọl anụ ya, ọ ga-egbu m.” Onyenwe anyị sịrị, “Were nwaagbọghọ ehi, jiri ya nʼaka, sị, ‘Abịara m ịchụrụ Onyenwe anyị aja.’
3 Umwite Yese aje kwenye dhabihu, nami nitakuonesha kile utakachofanya. Utamtia mafuta kwa ajili yangu yule nitakaye kuambia.”
Ị ga-akpọ Jesi ka ọ bịa soro nʼọchụchụ aja ahụ. Mgbe ahụ, aga m egosi gị ihe ị ga-eme. Ị ga-etekwara m ya mmanụ, bụ onye m nke ga-egosi gị.”
4 Samweli akafanya kama BWANA alivyosema na akaenda Bethlehemu. Wazee wa mji walikuwa wakitetemeka walipokuja kuonana naye na wakasema, “Je, umekuja kwa amani?”
Samuel mere ihe Onyenwe anyị kwuru. Mgbe o rutere na Betlehem, ndị okenye obodo ahụ ji ịma jijiji pụta izute ya. Ha jụrụ ya sị “Ọ dịkwa mma? Udo ọ dịkwa?”
5 Naye akasema, “kwa amani; Nimekuja kutoa dhabihu kwa BWANA. Jitoeni wenyewe kwa BWANA kwa ajili ya dhabihu na muandamane nami,” Na akamweka wakfu Yese na watoto wake kwa BWANA, na baadaye aliwaita wote kwenye dhabihu.
Ma Samuel zara ha sị “E, udo dị, Abịara m ịchụrụ Onyenwe anyị aja. Doonụ onwe unu nsọ bịa soro m gaa ịchụ aja ahụ.” O dokwara Jesi na ụmụ ya ndị ikom nsọ, gwakwa ha ka ha soro gaa.
6 Walipofika, akamwangalia Eliabu na akajisemea mwenyewe kwamba mtiwa mafuta wa BWANA hakika amesimama mbele yake.
Mgbe ha ruru, Samuel hụrụ Eliab kwuo nʼobi ya sị, “Nʼezie, onye nke Onyenwe anyị tere mmanụ na-eguzo nʼihu Onyenwe anyị.”
7 Lakini BWANA akamwambia Samweli, “Usimwangalie sura yake ya nje, au kimo cha umbo lake; kwa sababu nimemkataa. Maana BWANA haangalii kama mtu aangaliavyo; mtu hutazama sura ya nje, bali BWANA huutazama moyo.”
Ma Onyenwe anyị zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. Onyenwe anyị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele anya nʼobi.”
8 Kisha Yese akamwita Abinadabu akamwambia apite mbele ya Samweli. Na Samweli akasema, “Hata huyu BWANA hakumchagua.”
Jesi kpọrọ Abinadab ka ọ gafee nʼihu Samuel. Ma Samuel sịrị, “Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”
9 Kisha Yese akmwambia Shama apite karibu. Na Samweli akasema, “Hata huyu BWANA hakumchagua.”
Jesi mere ka Shama bịa gafee, ma Samuel sịrị, “Mba Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”
10 Yese akawaleta watoto wake saba wakapita mbele ya Samweli. Na Samweli akamwambia Yese, “Hakuna hata mmoja aliyechaguliwa na BWANA kati ya hawa.”
Ụmụ ndị ikom Jesi asaa si otu a gafee nʼihu Samuel, ma Samuel sịrị ya, “Onyenwe anyị ahọrọghị ndị a.”
11 Kisha Samweli akamuulia Yese, “Je, watoto wako wote wako hapa?” Naye akajibu, “Yupo mdogo kabisa lakini anachunga kondoo.” Samweli akamwambia Yese, “Tuma watu wakamwite; maana hatutakaa chini hadi atakapofika hapa.”
Ọ jụrụ Jesi sị, “Ndị a ọ gwụchaala ụmụ ndị ikom ị mụtara?” Jesi zara sị “O fọdụrụ ọdụdụ nwa m, ma ọ nọ nʼọhịa na-azụ atụrụ.” Samuel sịrị, “Ziga ozi kpọlata ya, anyị agaghị anọdụ ala tutu ruo mgbe ọ bịara.”
12 Yese akawatuma watu wakamleta. Naye kijana huyu alikuwa mwekundu na mwenye macho mazuri na mwenye muonekano mzuri. BWANA akasema, “Amka, umtie mafuta; maana huyu ndiye.”
Ọ zigara ozi ka akpọọ ya, mee ka ọ bịa. O nwere ụcha ahụ pụrụ iche, nwee anya mara mma, dịkwa mma ile anya. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Samuel okwu sị ya, “Ọ bụ onye a, bilie tee ya mmanụ.”
13 Ndipo Samweli akachukua pembe yenye mafuta na kumtia mafuta katikati ya kaka zake. Roho wa BWANA akamwijia Daudi kwa nguvu tangu siku hiyo na kuendelea. Kisha Samweli akanyanyuka na kwenda Rama.
Ya mere, Samuel weere mpi ahụ mmanụ dị tee ya nʼihu ụmụnne ya. Site nʼụbọchị ahụ Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Devid nʼebe ọ dị ukwuu. Emesịa, Samuel laghachiri na Rema.
14 Basi Roho wa BWANA akamwacha Sauli, badala yake roho ya ubaya kutoka kwa BWANA ikamsumbua.
Ugbu a, Mmụọ Onyenwe anyị esitela nʼime Sọl pụọ, Onyenwe anyị zitekwara mmụọ ọjọọ nke bịara na-esogbu Sọl.
15 Watumishi wa Sauli wakamwambia, “Tazama, roho ya ubaya kutoka kwa Mungu inakusumbua.
Ndị na-ejere Sọl ozi gwara ya okwu sị, “Lee, mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa na-enye gị nsogbu.
16 Haya bwana wetu hebu sasa amuru watumishi wako walio mbele yako wamtafute mtu mwenye ujuzi wa kupiga kinubi. Basi ikwa roho wa ubaya kutoka kwa Mungu yuko juu yako, atakipiga kinubi nawe utajisikia vizuri.”
Biko, ka onyenwe anyị nye ndị ohu ya nọ nʼebe a ike, ka ha gaa chọta onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ ga-akpọ ụbọ akwara mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa bịakwasịrị gị, ime ka ahụ dị gị mma.”
17 Sauli akawaambia watumishi wake, “Mnitafutie mtu anayeweza kupiga vizuri na mmlete kwangu.”
Sọl kwenyere sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ chọta ma kpọtara m nwoke na-akpọ ụbọ akwara nke ọma.”
18 Ndipo kijana mmoja kati yao akajibu, na kusema, “Nimemuona mtoto wa Yese Mbethtelehemu, aliye mjuzi katika kupiga, ni mwenye nguvu, mtu jasiri, mtu wa vita, mwenye busara aongeapo, mtu mzuri kwa uso; na BWANA yuko pamoja naye.”
Otu onye nʼime ndị na-eje ozi kwuru sị, “Lee, ahụla m otu nʼime ụmụ ndị ikom Jesi, onye Betlehem, onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ bụ dike na ọka nʼagha. Ọ bụ onye na-ekwu okwu nke ọma, na nwoke mara mma ile anya. Onyenwe anyị nọnyekwara ya.”
19 Hivyo Sauli akawatuma wajumbe kwa Yese, na kusema, “Nitumie mtoto wako Daudi, anayewatunza kondoo.” 1 Samweli! 6: 20-21
Sọl zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Jesi sị ya, “Zitere m nwa gị nwoke Devid, onye na-azụrụ gị atụrụ.”
20 Yese akamchukua punda aliyebeba mikate, na kiriba cha divai, na mwana-mbuzi, na akamtuma kwa Sauli pamoja na vitu hivyo.
Ya mere Jesi zipụrụ Devid ka o jekwuru Sọl. O mekwara ka Devid duru otu ịnyịnya ibu nke o bukwasịrị achịcha, na otu karama akpụkpọ mmanya, na otu nwa ewu, onyinye a na-enye Sọl.
21 Ndipo Daudi akafika kwa Sauli na kuanza kazi yake. Sauli alimpenda sana Daudi, na akawa mbeba silaha wake.
Devid bịakwutere Sọl, banye nʼọrụ ijere ya ozi. Sọl hụrụ ya nʼanya nke ukwuu, nʼihi ya, Devid ghọrọ otu nʼime ndị na-ebu ihe agha Sọl.
22 Sauli akawatuma wajumbe kwa Yese, akisema, “Mruhusu Daudi awe mbele yangu, maana amepata kibali machoni pangu.”
Mgbe ahụ, Sọl ziri Jesi ozi sị ya, “Biko, kwere ka Devid bụrụ otu nʼime ndị agha m, nʼihi na ihe ya na-atọ m ụtọ.”
23 Wakati wowote roho ya usumbufu kutoka kwa Mungu ikiwapo juu ya Sauli, Daudi alichukuwa kinubi na kukipiga. Hivyo Sauli angeburudishwa na kupona, na huyo roho wa usumbufu angemtoka.
Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ si nʼebe Chineke nọ bịa malitere inye Sọl nsogbu, Devid na-akpọ ụbọ akwara ya. Ahụ Sọl na-adajụkwa, mmụọ ọjọọ ahụ na-esitekwa nʼebe ọ nọ wezuga onwe ya.