< 1 Wafalme 20 >

1 Beni Hadadi mfalme wa Shamu akakusanya jeshi lake lote pamoja. Kulikuwa na wafalme thelathini na mbili wasaidizi pamoja naye, na magari na farasi. Akapanda, akaihusuru Samaria na kupigana nayo.
Ugbu a, Ben-Hadad, bụ eze ndị Aram, chịkọtara ndị agha ya niile. Iri ndị eze atọ na abụọ sonyere ya, ha na ịnyịnya ha na ụgbọ agha ha. Ọ rịgooro nọchibido obodo Sameria buso ya agha.
2 Akatuma wajumbe katika mji kwa Ahabu mfalme wa Israeli, akamwambia, “Beni Hadadi anasema hivi:
Mgbe ahụ, eze ndị Siria zigaara Ehab, eze Izrel ozi nʼime obodo sị ya, “otu a ka Ben-Hadad sịrị,
3 Fedha zako na dhahabu zako ni zangu. Pia wake zako na watoto, wale wazuri, sasa ni wangu.”
‘Ọlaọcha na ọlaedo gị, nkem ka ha bụ, ndị nwunye gị na ụmụ gị, bụ ndị dị mma karịsịa nke m ka ha bụ.’”
4 Mfalme wa Israeli akajibu akasema, “Na iwe kama unavyosema, bwana wangu, mfalme. Mimi pamoja na vile nilivyo navyo ni mali yako.”
Ehab eze Izrel, zighachiri ozi sị, “Ọ dị mma, onyenwe m, mụ onwe m, na ihe niile m nwere bụ nke gị.”
5 Wale wajumbe wakaja tena wakasema, “Beni Hadadi anasema hivi, 'Nilituma neno kwako nikisema kwamba lazima ukabidhi kwangu fedha zako, dhahabu zako, wake zako na watoto wako.
Ngwangwa ndị ozi Ben-Hadad bịaghachiri zie Ehab ozi ọzọ sị ya, “Otu a ka Ben-Hadad sịrị, ‘Ọ bụ ezie na m ziteere gị ozi, sị, ọlaọcha gị na ọlaedo gị na ndị nwunye gị na ụmụ gị ka ị ga-enye m.
6 Lakini kesho nitatuma watumishi wangu kwako wakati kama huu, nao wataichunguza nyumba yako na nyumba za watumishi wako. Nao watatia mikononi mwao na kukichukua kila wakipendacho machoni mwao.'”
Ma ugbu a, nʼoge dị ka nke a, echi, aga m ezite ndị ozi m ka ha bịa nyochaa ụlọ gị niile na ụlọ ndị ozi gị niile. Ihe ọbụla dị oke ọnụahịa nʼanya gị ka ha ga-ewere.’”
7 Ndipo mfalme wa Israeli akawaita wazee wote wa nchi pamoja akawaambia, ''Hebu angalieni jinsi huyu mtu anavyotafuta matatizo. Amenitumia ujumbe kwamba anataka kuchukua wake zangu, watoto wangu, fedha na dhahabu zangu, nami sijamkatalia.”
Eze Izrel kpọrọ ndị okenye niile nke ala ahụ, sị ha, “Leenụ ugbu a, hụkwanụ otu nwoke a si achọ nsogbu. Mgbe o zitere m ozi inye ya ndị nwunye m, na ụmụ, na ọlaọcha m na ọlaedo m, ekwenyere m ya inye ya ihe ndị a.”
8 Wazee wote na watu wote wakamwambia Ahabu, “Usimsikilize wala kukubaliana na matakwa yake.”
Ndị okenye na ndị Izrel zara sị ya, “Aṅala ya ntị! Enyela ya ihe ọbụla.”
9 Ahabu akawaambia wajumbe wa Beni Hadadi, “Mwambieni bwana wangu mfalme kwamba, 'Ninakubaliana na kila kitu ambacho kwanza uliwatuma watumishi wako kufanya kwangu, lakini sikubaliani na matakwa yako haya ya pili.'” Wale watumishi wa Beni Hadadi wakaondoka wakampelekea mrejesho Beni Hadadi.
Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị ozi Ben-Hadad, “Gwanụ onyenwe m, bụ eze, ‘M bụ odibo gị jikeere ime ihe niile ị buru ụzọ kwuo na m ga-enye gị. Ma ekwenyeghị m nʼozi nke ugboro abụọ a.’” Ndị ozi ahụ laghachiri kọọrọ Ben-Hadad ihe niile Ehab kwuru.
10 Naye Beni Hadadi akatuma tena majibu yake kwa Ahabu, akaisema, “basi miungu inifanyie hivyo na zaidi, kama hata mavumbi ya Samaria yatawatosheleza watu watu wote wanaonifuata kuchukua kila mmoja angalau konzi mkononi mwake.”
Ma Ben-Hadad zigakwaara Ehab ozi ọzọ sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na aja Sameria ga-afọdụ inye onye ọbụla nʼetiti ndị ikom m otu njuaka.”
11 Naye mfalme wa Israeli akamjibu akisema, “Mwabieni Beni Hadadi, 'Hakuna abebaye silaha yake, atakayejivuna kama wakati wa kuishusha.”'
Ma eze Izrel zaghachiri, “Gwa ya, ‘Onye na-ebu agha na-anya isi naanị mgbe a lụchara agha, ọ bụghị tupu a lụọ agha.’”
12 Beni Hadadi aliusikia ujumbe huu wakati alipokuwa akinywa, yeye na wafalme walikuwa pamoja naye waliokuwa kwenye mahema yao. Beni Hadadi akayaamuru majaeshi yake, “Jipangeni katika sehemu zenu kwa ajili ya vita.” Kwa hiyo wakajiandaa kivita ili kuuvamia mji.
Ben-Hadad nụrụ ozi Ehab ziri mgbe ya na ndị eze ndị ọzọ ahụ nọ na-aṅụ mmanya nʼụlọ ikwu ha manyere nʼọgbọ agha ahụ. Ben-Hadad nyere ndị agha ya iwu sị ha, “Jikerenụ, buso ndị Izrel agha.” Ya mere, ha kwadoro ibuso obodo ahụ agha.
13 Tazama, nabii akaja kwa Ahabu mfalme wa Israeli akasema, “BWANA asema, 'Je umeliona hili jeshi kubwa? Tazama, nitaliweka katika mkono wako leo, nawe utatambua kuwa mimi ni BWANA.'”
Nʼoge a, otu onye amụma bịakwutere Ehab, bụ eze Izrel sị, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị hụrụ oke igwe ndị agha a? Aga m enyefe ha nʼaka gị taa, mgbe ahụ ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
14 Naye Ahabu akajibu, ''kwa nani? BWANA akamjibu akasema, “kwa kuwatumia viijana wanaotumikia maliwali wa wilaya.” kisha Ahabu akasema, “Ni nani atakayepewa hiyo vita?' BWANA akamwambia, “wewe.”
Ma Ehab jụrụ sị, “Onye ga-eme nke a?” Onye amụma zara, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụ ụmụ okorobịa bụ ndịisi agha nọ nʼokpuru ndị ọchịagha na-achị akụkụ ala Izrel.’” Ehab jụkwara ọzọ, “Onye ga-amalite agha a?” Onye amụma ahụ zara, “Gị onwe gị.”
15 Ndipo Ahabu alipowataarifu wale vijna wanaowatumikia maliwali wa wilaya. Idadi yao ilikuwa 232. Baada yao aliwahesabu wanajeshi wote, jeshi lote la Israeli; idadi yao ilikuwa elfu saba.
Mgbe ahụ, Ehab kpọkọtara ụmụ okorobịa bụ ndịisi agha si nʼakụkụ obodo ya. Ọnụọgụgụ ha dị narị abụọ na iri atọ na mmadụ abụọ. Ọnụọgụgụ ndị agha Izrel ndị ọzọ dị puku asaa.
16 Nao wakatoka wakati wa adhuhuri. Naye Beni Hadadi alikuwa akinywa na kulewa hemani mwake, yeye na wale wafalme wadogo thelathini na mbili waliokuwa wakimsaidia.
Nʼetiti ehihie, mgbe Ben-Hadad na iri ndị eze atọ na abụọ ahụ, bụ ndị ahụ bịara inyere ya aka nọ na-aṅụ mmanya, na-aṅụbiga ya oke,
17 Wale maakida vijana waliokuwa wakiwasaidia maliwali wa wilaya walitangulia kwanza. Kisha Beni Hadadi alitaarifiwa na wanaskauti aliokuwa amewatuma kwamaba, “kuna watu wanakuja kutoka Samaria.”
ụmụ okorobịa, bụ ndị agha, ndị nọ nʼokpuru ndị ọchịagha na-achị akụkụ ala Izrel buru ụzọ pụọ ibu agha. Ma Ben-Hadad, nʼonwe ya ezipụlarị ndị nledo, ndị lọghachiri bịa gwa ya sị, “Ndị agha si Sameria na-abịa.”
18 Beni Hadadi akasema, “wawe wamekuja kwa amani au kwa vita, wakamteni wakiwa hai.”
Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ha abịa nʼihi udo, jidenụ ha na ndụ; ọ bụrụ na ha bịara maka ibu agha, jidenụ ha na ndụ!”
19 Kwa hiyo wale vijvana wanaowatumikia maliwali wa wilaya wakaenda mjini na jeshi likawafuata kwa nyuma.
Ma ụmụ okorobịa ndị ọchịchị a bụ ndị nọ nʼokpuru ndịisi, na-achị akụkụ ala ahụ sitere nʼobodo zọlie ije ebe ndị agha so ha nʼazụ, pụọ ibu agha.
20 Kila mmoja akaua adui wake na wale washami wakakimbia. Israeli ikawashinda. Beni Hadadi mfalme wa Shamu akatoroka kwa farasi pamoja na wapanda farasi.
Onye ọbụla nʼime ha gburu onye agha Siria ọbụla lụsoro ya ọgụ. Nke a mere ka ndị agha Siria gbapụ ọsọ, ndị agha Izrel chụsokwara ha. Ma Ben-Hadad, eze Aram, na ndị agha na-agba ịnyịnya, sitekwara nʼihu ọgbọ agha ahụ gbapụkwa ọsọ.
21 Kisha mfalme wa Israeli akaenda akawashambulia farasi na magari, na kuwaua washami kwa mauaji makubwa.
Ma eze ndị Izrel pụkwuru ya, nwude ọtụtụ ịnyịnya na ụgbọ agha, butere ndị Aram ọghọm dị ukwuu.
22 Yule nabii akaja kwa mfalme wa Israeli akamwambia, “Nenda, ukajiimarishe mwenyewe, uelewa na kupanga kile unachofanya, kwa sababu mwakani mfalme wa Shamu atapanda dhidi yako tena.”
Emesịa, onye amụma ahụ bịakwutere eze Izrel sị ya, “Mee onwe gị ka ị dị ike nke ọma, mara ihe e kwesiri ka e mee, nʼihi nʼetiti ọkọchị na udu mmiri nke afọ nʼabịa, eze Aram ga-abịa ibuso gị agha ọzọ.”
23 Wale watumishi wa mfalme wa Shamu wakamwambia, “Mungu wao ni mungu wa milimani. Hiyo ndiyo sababu walikuwa na nguvu kuliko tulivyokuwa. Lakini sasa hebu tupigane nao katika nchi tambarare, na kwa hakika tutakuwa na nguvu kuliko wao.
Ma otu ọ dị, ndịisi agha eze ndị Aram dụrụ ya ọdụ sị, “Chi ha bụ chi ugwu. Nʼihi ya ka ha ji dị ike karịa anyị. Ma ọ bụrụ na anyị ebuso ha agha nʼobosara ala dị larịị, anyị aghaghị ịdị ike karịa ha.
24 Na ufanye hivi: waondoe wafalme; mwondoe kila mmoja mahali pake ukaweke majemedari mahali pao.
Mee ihe a, wepụ ndị eze a niile site nʼebe ha nọ, jiri ndị na-achị ala gbanwee ha.
25 Kisha ujihesabie jeshi kama lile jeshi ulilopoteza, farasi kwa farasi na gari kwa gari, nasi tutapigana nao katika nchi tambarare. Kwa hakika tutakuwa na nguvu kuliko walivyo.” Kwa hiyo Beni Hadadi akausikiliza ushauri huo naye akafanya kama alivyoshauriwa.
Kpọkọtaakwa ndị agha ọzọ, ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka ndị agha i du gaa agha na mbụ. Nyekwa anyị ịnyịnya na ụgbọ agha ga-ezuru anyị. Anyị ga-apụkwa buso ndị Izrel agha nʼobosara ala dị larịị. Ọ dịkwaghị ihe ga-egbochi anyị imeri ha nʼoge a.” Ben-Hadad, eze Aram, kwenyere, meere ha dịka ha rịọrọ ya.
26 Baada ya mwanzo wa mwaka mpya, Beni Hadadi akawahesabu Washami na akapanda Afeki kupigana na Israeli.
Mgbe otu afọ gasịrị, Ben-Hadad chịkọtakwara ndị Aram niile duru ha gaa Afek ibuso Izrel agha.
27 Watu wa Israeli walikuwa wamehesabiwa na walikuwa wamejipanga kupigana nao. Watu wa Israeli wakafanya kambi mbele yao kama makundi mawili madogo ya mbuzi, lakini Washami wakaujaza upande wa nchi.
Mgbe a kpọkọtara ndị agha niile nọ nʼIzrel nye ha ngwa agha, ha pụrụ izute ha. Ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha na ncherita ihu ndị agha Siria, dịka igwe ewu nta abụọ, ebe ndị Aram jupụtara ala ahụ niile.
28 Ndipo mtu wa Mungu akaja karibu akaongea mfalme wa Israeli akamwambia, “BWANA anasema: 'Kwa kuwa Washami wamesema kuwa BWANA ni mungu wa milima, na wala si mungu wa mabondeni, nitaliweka hili jeshi kubwa mkononi mwako, nawe utajua kuwa mimi ni BWANA.'”
Onye nke Chineke bịara gwa eze ndị Izrel, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Nʼihi na ndị Aram na-eche na Onyenwe anyị bụ chi nke ugwu, na ọ bụghị chi ala ndagwurugwu, aga m arara igwe ndị agha a nyefee gị nʼaka, ka gị na ndị gị mata nʼeziokwu na m bụ Onyenwe anyị.’”
29 Kwa hiyo majeshi yakaweka kambi yakikabiliana kwa muda wa siku saba. Kisha siku ya saba vita vikaanza. Watu wa Israeli wakawaua Washami 100, 000 wanajeshi wa ardhini kwa siku moja.
Ọ bụ ụbọchị asaa ka ha mara ụlọ ikwu ha na ncherita ihu ibe ha. Ma nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị agha malitere ibu agha. Ndị Izrel merụrụ narị puku ndị agha Aram ahụ nʼotu ụbọchị.
30 Waliobaki wakakimbilia Afeki, mjini, na ule ukuta ukaanguka juu ya watu ishiriinina saba elfu waliobaki. Naye Beni Hadadi akakimbilia mjini. akaingia kwenye chumba cha ndani.
Ma ndị fọdụrụ nʼetiti ndị agha Aram gbapụrụ ọsọ gbalaga nʼobodo Afek. Ebe ahụ ka mgbidi obodo Afek nọ dagbuo iri puku ndị agha abụọ na asaa nʼime ha. Ma Ben-Hadad nʼonwe ya gbalagara, gbaba nʼime obodo ahụ, gaa zoo onwe ya nʼime ime otu ụlọ.
31 Wale watumishi wa Beni Hadadi wakamwambia, “Tazama sasa, tumesikia kwamba wale wafalme wa nyumba ya Israeli ni wenye rehema. Tafadhali hebu tuvaeni magaunia viunoni mwetu na kamba vichwani mwetu, na twendeni kwa mfalme wa Israeli. Labda atakuokoa roho yako.”
Mgbe ahụ, ndịisi agha ya bịakwutere ya sị ya, “Lee, anyị nụrụ na ndị eze Izrel bụ ndị obi ebere. Ka anyị yiri akwa mkpe nʼukwu anyị, kee ụdọ nʼolu anyị, gaa rịọọ eze Izrel. Ma eleghị anya ọ ga-edebe gị ndụ.”
32 Kwa hiyo wakavaa magunia viunoni mwao na kujifunga kamba vichwani mwao na kisha wakaenda kwa mfalme wa Israeli wakamwambia, “Mtumishi wako Beni Hadadi, anasema, 'tafadhali niachie uhai wangu.” Ahabu akawaambia, “Je, bado yuko hai? Yeye ni ndugu yangu.”
Ya mere, ha yikwasịrị onwe ha akwa mkpe, nyarakwa ụdọ nʼolu ha, jekwuru eze Izrel sị ya, “Ohu gị bụ Ben-Hadad na-asị, ‘Biko, kwee ka m dịrị ndụ.’” Eze jụrụ ha sị, “Ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ ugbu a? Nwanne m ka ọ bụ.”
33 Sasa wale watu walikuwa wakisikiliza ishara yeyote kutoka kwa Ahabu, kwa hiyo wakamjibu haraka, “Ndiyo ndugu yako Beni Hadadi bado yuko hai.” Ahabu akawaambia, “Nendeni mkamlete.” Ndipo Beni Hadadi alipokuja kwake, na Ahabu akamwacha aje kwenye gari lake.
Okwu a mere ka ndị ozi eze Aram nwee olileanya. Ha mere ngwangwa kwugharịakwa ihe ahụ o kwuru. Ha sịrị, “E, Nwanne gị bụ Ben-Hadad.” Mgbe ahụ, eze Ehab nyere ha iwu sị, “Gaanụ kpọpụta ya, dutekwanụ ya nʼebe a.” Mgbe Ben-Hadad bịara, Ehab mere ka ọ rigota nʼụgbọ agha nke ya.
34 Beni Hadadi akamwambia Ahabu, “Nitakurudishia miji yako ambayo baba yangu alichukua toka kwa baba yako, na unaweza kutengeneza masoko kwa ajili yako Dameski, kama baba yangu alivyofanya kule Samaria.” Ahabu akajibu, “Nitakuacha uende kwa agano hili.” Kwa hiyo Ahabu akafanya agano naye kisha akamwacha aende.
Mgbe ahụ, Ben-Hadad gwara Ehab sị, “Obodo niile nke nna m naara nna gị, ka m ga-enyeghachi gị. I nwere ike iwuru onwe gị ọdụ ahịa nʼama obodo Damaskọs dịka nna m wuru nʼime Sameria.” Ehab kwuru, “Ọ bụrụ na anyị agbaa ndụ, aga m eme ka i nwere onwe gị.” Ya mere, ha abụọ gbara ndụ. Ehab hapụkwara ya ka ọ laa nʼudo.
35 Mtu mmoja, mmoja wana wa wana wa manabii, akamwambia mmoja wa wale manabii wenzake kwa neno la BWANA, “Tafadhali nipige.” Lakini yule mtu akakataa kumpiga.
Emesịa, okwu Onyenwe anyị rutere otu onye nʼetiti ụmụ ndị amụma. Ọ gwara otu nwoke nʼime ụmụ ndị amụma ahụ nọ ya nso sị ya, “Jiri ngwa agha dị gị nʼaka tie m ihe.” Ma nwoke ahụ jụrụ ime ihe onye amụma ahụ kwuru.
36 Kisha yule nabii akamwambia nabii mwenzake, “Kwa sababu umekataa kutii sauti ya BWANA, mara tu utakaponiacha, simba atakuua.” na mara tu baad ya yule mtu kumwacha, simba akamkuta na kumwua.
Nʼihi nke a, onye amụma gwara nwoke ahụ okwu sị, “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ime ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, lee ihe ga-adakwasị gị. Mgbe i si nʼebe a na-ala nʼụlọ gị, ọdụm ga-ezute gị nʼụzọ dọgbuo gị.” Amụma a mezukwara, nʼihi na mgbe nwoke ahụ tụgharịrị si nʼebe ahụ na-ala, ọdụm lụsoro ya ọgụ nʼụzọ gbuo ya.
37 Kisha yule nabii akamkuta mtu mwingine akamwambia, “Tafadhali nipige.”Yule mtu akampiga na kumwumiza.
Onye amụma ahụ pụkwara chọta onye ọzọ sị ya, “Biko, tie m ihe.” Nwoke ahụ tiri ya ihe tihịa ya ahụ.
38 Kisha yule nabii akaondoka akaenda kumsubiri yule mfalme barabarani; naye alikuwa amejibadilisha kwa kilemba machoni pake.
Mgbe ahụ, onye amụma ahụ e tiri ihe jiri akwa kechie ihu ya, ka mmadụ ọbụla ghara ịmata onye ọ bụ. Ọ pụrụ gaa guzo nʼakụkụ ụzọ ebe eze Izrel ga-esi gafee.
39 Ikawa mfalme alipokuwa akipita, Yule nabii akamwita mfalme na kumwambia, “Mtumishi wako alienda katikati ya pigano, na askari akasimama akamleta adui kwangu akasema, 'Mwangalie mtu huyu. Na ikiwa kwa vyovyote atatoroka, basi maisha yako yatatolewa kwa ajili ya maisha yake vinginevyo utalipa kilo thelathini za fedha.
Mgbe eze na-agafe, onye amụma ahụ tiri mkpu sị, “Onyenwe m, biko gee m ntị. Lee, otu onye agha bịakwutere m mgbe m nọ nʼihu agha sị m, ‘Lee nwoke a a dọtara nʼagha; chee ya nche. Ekwekwala ka ọ gbanarị gị. Nʼihi na ọ bụrụ na o site nʼaka gị gbapụ, ị ga-anwụ, maọbụ i jiri otu talenti ọlaọcha gbara isi gị.’
40 Lakini kwa kuwa mtumishi wako alikuwa na mambo mengi akienda huku na kule, yule askari adui akatoroka.” Basi mfalme wa Israeli akamwambia, Hivyo ndivyo itakavyokuwa hukukmu yako - umejihukumu mwenyewe.”
Ma mgbe m nọ na-arụ ọrụ ọzọ, nwoke ahụ a dọtara nʼagha gbapụrụ. Ahụkwaghị m ya anya ọzọ.” Mgbe ahụ, eze Izrel zara sị ya, “I jirila ọnụ gị maa onwe gị ikpe. Ị ghaghị ịnata ahụhụ dịrị gị.”
41 Ndipo yule nabii alipoondoa haraka kile kilemba machoni pake, na mfalme wa Israeli alipotambua kuwa huyo alikuwa mmoja wa manabii.
Mgbe ahụ, onye amụma ahụ mere ngwangwa wepụ akwa ahụ o ji kechie anya ya abụọ. Eze Izrel matakwara na ọ bụ otu onye nʼime ndị amụma.
42 Yule nabii akamwambia mfalme, “BWANA anasema, 'Kwa sababu umemwachia aende mtu yule niliyekuwa nimemhukumu kifo, maisha yako yatachukua nafasi ya maisha yake.'”
Onye amụma ahụ gwara eze okwu sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ebe i mere ka nwoke a laa, bụ onye m nyere gị nʼaka ime ka ọ nwụọ, ugbu a, ị ghaghị ịnwụ nʼọnọdụ ya. A ga-alakwa ndị gị nʼiyi, nʼọnọdụ ndị nke ya.’”
43 Kwa hiyo mfalme wa Israeli akaenda nyumbani kwake akiwa na moyo mzito na mwenye hasira, akafika Samaria.
Nʼihi okwu a, eze Izrel ji iwe na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya dị na Sameria.

< 1 Wafalme 20 >