< 1 Wafalme 17 >

1 Eliyas Mtishibi, kutoka Tishibi ya Gileadi, akamwambia Ahabu, “Kama BWANA, Mungu wa Israeli aishivyo, ambaye ninasimama, hakutakuwa na umande wala mvua isiipokuwa kwa neno langu.”
Ugbu a, Ịlaịja onye Tishbe, onye si obodo Tishbe, nke dị nʼala Gilead, sịrị Ehab, “Eji m aha Onyenwe anyị Chineke Izrel dị ndụ, onye m na-efe na onye m na-ejere ozi na-agwa gị na igirigi agaghị ada, mmiri agaghị ezo ọzọ nʼafọ ndị a na-abịa karịa ma ọ bụghị naanị site nʼokwu ọnụ m!”
2 Kisha nenola BWANA, likammjia Eliya, likisema,
Okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja ntị, sị ya,
3 “Ondoka hapa uende mashariki; ukajifiche karibu na kijito cha Kerithi, mashariki mwa Yorodani.
“Si nʼebe a pụọ. Soro ụzọ ọwụwa anyanwụ, gaa zoo onwe gị nʼakụkụ iyi Kerit, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ya, nke bụ nʼihu Jọdan.
4 Nawe utakunywa maji ya kijito, na nimewaamuru kunguru kukulisha mahali hapo.”
Nọdụ nʼebe ahụ ṅụọ mmiri si nʼiyi ahụ, riekwa nri ọbụla ụmụ ugolọma ga-ebutere gị, nʼihi na enyela m ha iwu ka ha nye gị nri.”
5 Kwa hiyo Eliya akaenda kama neno la BWANA lilivyomwamuru. Akaenda kuishi karibu na kijito cha Kerithi, mashariki mwa Yorodani.
O mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọ gara nʼakụkụ iyi nta Kerit nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan nọrọ nʼebe ahụ.
6 Nao kunguru wakamletea mkate na nyama asubuhi, na mkate na nyama jioni, naye akanywa maji ya kijito kile.
Ugolọma na-ebutere ya achịcha na anụ, ụtụtụ na anyasị niile. Ọ na-aṅụkwa mmiri site nʼiyi ahụ.
7 Lakini baada ya muda kile kijito kikakauka kwa sababu hapakuwepo na mvua katika nchi.
Ma mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, mmiri ahụ tara, nʼihi na mmiri adịghị ezokwa nʼala ahụ.
8 Neno la BWANA likamjia, likisema,
Okwu Onyenwe anyị bịakwutere ya,
9 “Inuka, uende Sarepta, ambao ni mji wa Sidoni, na ukaishi huko. Tazama nimemmwamuru mjane kukulisha.”
“Bilie, jee Zarefat, obodo dị Saịdọn nso, biri nʼebe ahụ. O nwere otu nwanyị di ya nwụrụ, onye m nyere iwu ka o nye gị nri.”
10 Kwa hiyo akainuka na akaenda Sarepta, na alipofika kwenye lango la mji, kulikuwa na mjane akiokota kuni. Kwa hiyo akamwita na akamwambia, “Tafadhali niletee maji kidogo kwenye jagi ninywe.”
Ịlaịja biliri jee Zarefat. Mgbe o ruru ọnụ ụzọ ama e si abanye obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ nọ na-achịkọta nkụ. Ịlaịja kpọrọ ya oku sị ya, “Biko, kutere m ntakịrị mmiri nʼiko ka m ṅụọ.”
11 Naye alipokuwa akienda kuleta maji alimwita, akamwambia, “tafadhali uniletee na kipande cha mkate mkononi.”
Mgbe nwanyị ahụ na-aga ikute mmiri ahụ, Ịlaịja kpọrọ ya oku ọzọ sị ya, “Biko, wetara m otu iberibe achịcha ka m taa.”
12 Naye akamjibu, “Kama BWANA Mungu wako aishivyo, sina mkate wowote, bali konzi moja ya unga katika chombo na mafuta kidogo kwenye chupa. Tazama, ninaokota kuni mbili ili niende kupika kwa ajili yangu na mwanangu, ili tule, na tusubiri kufa.”
Ma nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke na-adị ndụ, enweghị m achịcha ọbụla nʼụlọ m. Naanị ihe m nwere bụ otu njuaka ụtụ ọka dị nʼite, na mmanụ ntakịrị dị na karama. Ugbu a, ana m achịkọta nkụ ka m baa ga siere onwe m siekwara nwa m nri, ka anyị rie, chere ọnwụ ga-abịa egburu anyị.”
13 Eliya akamwambia, “Usiogope. Nenda ukafanye kama usemavyo. lakini nitengenezee kwanza mimi na uniletee. Ndipo baadaye ujitenegenezee wewe na mwanao.
Ịlaịja sịrị ya, “Atụla egwu! Gaa mee dịka i kwuru. Ma naanị buru ụzọ meere m ogbe achịcha ntakịrị site nʼihe i nwere, wetara m ya. Emesịa, mee nke gị na nwa gị ga-eri.
14 Kwa kuwa BWANA, Mungu wa Israeli anasema 'Lile pipa la unga halitaisha, wala ile chupa ya mafuta kukoma kutoa mafuta, mpaka siku ile BWANA atakapotuma mvua duniani.”
Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Ụtụ ọka dị nʼite ahụ agaghị agwụ, mmanụ ahụ dị nʼite ahụ agakwaghị akọ tutu ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị ga-ezite mmiri ozuzo nʼala a.’”
15 Kwa hiyo yule mjane akafanya kama Eliya alivyomwelekeza, yeye, na Eliya, na mwanae wakala kwa siku nyingi.
Nwanyị ahụ mere dịka Ịlaịja kwuru. Sitekwa nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ihe oriri akọkwaghị Ịlaịja na nwanyị ahụ, na ezinaụlọ ya.
16 Lile pipa la Unga halikuisha, wala ile chupa ya mafuta haikukoma kutoa mafuta, kama vile neno la BWANA lilivyosema, kupitia kinywa cha Eliya.
Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma.
17 Baada ya hayo mambo, yule mwana wa yule mwanamke, yule mwanamke mwenye nyumba, aliugua. Ugonjwa wake ukazidi hata akaishiwa pumzi kabisa.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, nwa nwanyị ahụ nwe ụlọ rịara ọrịa. Ọrịa a bịara sie ike nke ukwuu na ume afọdụghị nʼime ya.
18 Kwa hiyo mama yake akamwambia Eliya, “Je, una nini nami, ewe mtu wa Mungu? Je, umekuja kwangu ili kunikumbusha dhambi zangu na kumwua mwanangu?”
Mgbe ahụ, nwanyị ahụ kwaara akwa bịakwute Ịlaịja sị ya, “Ewoo, onye nke Chineke, gịnị ka i nwere megide m? Ị bịara ka i chetara m mmehie m, na igbu nwa m nwoke?”
19 Naye Eliya akamjibu, “Nipe hapa mwanao.” Akambeba mtoto mikononi mwake na akampeleka mpaka chumbani alimokuwa akikaa, akamlaza yule mtoto kitanadani pake mwenyewe.
Ịlaịja zara sị ya, “Kunye m nwa gị nwoke.” Ịlaịja kuuru ya site nʼaka nne ya rigoo nʼụlọ elu ebe ya onwe ya na-edina, nibe ya nʼelu ihe ndina ya.
20 Akamlilia BWANA akisema, “BWANA Mungu wangu, kwa nini umeleta majanga kwa mjane ambaye mimi ninakaa, kwa kumwua mwanae?”
Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “Onyenwe anyị Chineke m, gịnị mere i ji wetara nwanyị a m bi nʼụlọ ya ihe mgbu site nʼikwe ka nwa nwoke ya nwụọ?”
21 Kisha Eliya akajinyosha mwenyewe juu ya mtoto mara tatu; akamlilia BWANA akisema, “BWANA Mungu wangu, Ninakuomba, tafadhali uhai wa mtoto huyu umrudie.”
Ịlaịja gbatịrị onwe ya nʼahụ nwantakịrị ahụ ugboro atọ, kpọkuo Onyenwe anyị, sị, “Biko, Onyenwe anyị Chineke m, kwere ka mkpụrụobi nwantakịrị a laghachikwute ya.”
22 BWANA akaisikiliza sauti ya Eliya; uhai wa mtoto ukamrudia, na akawa hai.
Onyenwe anyị nụrụ ekpere Ịlaịja, ndụ nwantakịrị ahụ laghachikwutere ya, ọ dịkwara ndụ ọzọ.
23 Eliya akamchukua mtoto na akamtoa toka chumbani kwake akamleta kwenye ile nyumba; akampatia mama yake yule mtoto na akasema, “Tazama, mwanao yuko hai.”
Mgbe ahụ, Ịlaịja kuuru ya si nʼụlọ elu ahụ rịdata, kunye ya nne ya, gwa ya okwu sị, “Lee, nwa gị dị ndụ!”
24 Yule mwanamke akamwambia Eliya, “Sasa natambua kuwa wewe ni mtu wa Mungu, na kwamba neno la BWANA kinywani mwako ni la kweli.”
Nwanyị ahụ sịrị Ịlaịja, “Ugbu a, amatala m na ị bụ onye nke chineke, na okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ gị apụta bụ eziokwu.”

< 1 Wafalme 17 >