< 1 Wakorintho 7 >
1 Kuhusu mambo mliyoniandikia: Kuna wakati ambapo ni vizuri mwanaume asilale na mke wake.
Ugbu a, okwu banyere ihe unu dere nʼakwụkwọ: “Ọ dị mma ka nwoke ghara ịmetụ nwanyị aka.”
2 Lakini kwa sababu ya majaribu mengi ya zinaa kila mwanaume awe na mkewe, na kila mwanamke awe na mmewe.
Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya.
3 Mume anapaswa kumpa mke haki yake ya ndoa, na vile vile mke naye kwa mmewe.
Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ.
4 Si mke aliye na mamlaka juu ya mwili wake, ni mme. Na vile vile, mme naye hana mamlaka juu ya mwili wake, bali mke anayo.
Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwunye ya na-achị ya.
5 Msinyimane mnapolala pamoja, isipokuwa mmekubaliana kwa muda maalum. Fanyeni hivyo ili kupata muda wa maombi. Kisha mnaweza kurudiana tena pamoja, Ili kwamba Shetani asije akawajaribu kwa kukosa kiasi.
Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.
6 Lakini nasema haya mambo kwa hiari na si kama amri.
Anaghị m enye nke a dị ka iwu, kama ọ bụ alo ka m na-atụnyere unu.
7 Natamani kila mmoja angekuwa kama mimi nilivyo. Lakini kila mmoja ana karama yake kutoka kwa Mungu. Huyu ana karama hii, na yule ana karama ile.
Asị m kwuo, aga m asị na ọ ga-aka mma ka mmadụ niile nọrọ dị ka m. Ma onye ọbụla nwere onyinye nke Chineke nyere ya. O nyere otu onye nke a, onye ọzọ nke ọzọ.
8 Kwa wasioolewa na wajane ninasema kwamba, ni vizuri kwao kama wakibaki bila kuolewa, kama nilivyo mimi.
Ma ana m agwa ndị na-anọghị nʼọnọdụ di na nwunye na ndị di ha nwụrụ anwụ, na ọ ka mma ka ha nọdụ na-alụghị di maọbụ nwunye, dịka m onwe m nọ.
9 Lakini kama hawawezi kujizuia, wanapaswa kuolewa. Kwa kuwa heri kwao kuolewa kuliko kuwaka tamaa.
Ma ọ bụrụ na ha apụghị ijide onwe ha, ha gaa chọrọ di maọbụ nwunye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di maọbụ nwunye, karịa mmadụ ịgba ara site nʼagụụ nke anụ ahụ.
10 Sasa kwa wale walioolewa nawapa amri, si mimi bali ni Bwana. “Mke asitengane na mme wake.”
Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwunye niile, enwere m iwu m na-enye unu. (O sighị nʼaka m, kama o si nʼaka Onyenwe anyị): O kwesighị ka nwanyị ọbụla hapụ di ya.
11 Lakini kama akijitenga kutoka kwa mmewe, abaki hivyo bila kuolewa au vinginevyo apatane na mmewe. Na “Mme asimpe talaka mke wake.”
A sịkwa na ọ hapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, maọbụ ya laghachikwuru di ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịgba nwunye ya alụkwaghị m.
12 Lakini kwa waliobaki, nasema- mimi, si Bwana- kwamba kama ndugu yeyote ana mke asiyeamini na anaridhika kuishi naye, hapaswi kumwacha.
Ma ana m agwa mmadụ ndị ọzọ (nke a abụghị iwu nke Onyenwe anyị nyere). Ọ bụrụ na nwanna alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dịka nwunye ya.
13 Kama mwanamke ana mme asiyeamini, na kama anaridhika kuishi naye, asimwache.
Ọ bụrụkwa na nwanyị kwere ekwe alụọ di nke na-ekweghị ekwe, ya agbarala di ya alụkwaghị m, ma ọ bụrụ na di ya chọrọ ịnọgide dịka di ya.
14 Kwa mme asiyeamini anatakaswa kwa sababu ya imani ya mkewe. Na mwanamke asiyeamini anatakaswa kwa sababu ya mmewe aaminiye. Vinginevyo watoto wenu wangekuwa si safi, lakini kwa kweli wametakaswa.
Nʼihi na edoola di ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na nwunye ya, otu a kwa a na-edokwa nwunye ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na di ya, bụ onye kwere ekwe. Ọ bụrụ na ọ dịghị otu a, ụmụ unu ga-abụ ndị na-adịghị ọcha. Ma otu ọ dị, ha dị nsọ.
15 Lakini mwenzi asiyeamini akiondoka na aende. Kwa namna hiyo, kaka au dada hafungwi na viapo vyao. Mungu ametuita tuishi kwa amani.
Ma ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe ekewapụ onwe ya, ya dịrị otu ahụ, nke a emeghị ka nwanna anyị nwoke maọbụ nwanna anyị nwanyị bụrụ ohu nʼọnọdụ dị otu a, nʼihi na Chineke kpọrọ anyị ka anyị bie ndụ udo.
16 Unajuaje kama mwanamke, huenda utamwokoa mmeo? Au unajuaje kama mwanaume, huenda utamwokoa mkeo?
Gị nwunye, ị mara maọbụ gị ga-azọpụta di gị? Ma, gị bụ di, si aṅa mara maọbụ gị ga-azọpụta nwunye gị?
17 Kila mmoja tu aishi maisha kama Bwana alivyowagawia, kila mmoja kama Mungu alivyowaita wao. Huu ni mwongozo wangu kwa makanisa yote.
Ka onye ọbụla bie ndụ ya dịka amara Onyenwe anyị nyere ya si dị, nakwa nʼọnọdụ nke Chineke kpọrọ ya. Nke a bụ iwu m na-enye nʼụlọ chọọchị niile.
18 Yupo aliyekuwa ametahiriwa alipoitwa kuamini? Asijaribu kuondoa alama ya tohara yake. Yupo yeyote aliyeitwa katika imani hajatahiriwa? Hapaswi kutahiriwa.
Akpọrọ onye ọbụla mgbe e biri ya ugwu? Ya achọla iwepụ akara obibi ugwu ya. Ka onye a na-ebighị ugwu tupu ọkpụkpọ ya hapụ inye onwe ya nsogbu ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu.
19 Kwa hili aidha ametahiriwa wala asiye tahiriwa hakuna matatizo. Chenye matatizo ni kutii amri za Mungu.
Nʼihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ihe kachasị mkpa bụ idebe iwu Chineke.
20 Kila mmoja abaki katika wito alivyokuwa alipoitwa na Mungu kuamini.
Ka onye ọbụla nọgide dịka ọ dị mgbe a kpọrọ ya.
21 Ulikuwa mtumwa wakati Mungu alipokuita? Usijali kuhusu hiyo. Lakini kama unaweza kuwa huru, fanya hivyo.
Ị bụ ohu mgbe a kpọrọ gị? Echegbula onwe gị nʼihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, were ohere ahụ mee ihe ugbu a.
22 Kwa mmoja aliyeitwa na Bwana kama mtumwa ni mtu huru katika Bwana. Kama vile, mmoja aliye huru alipoitwa kuamini ni mtumwa wa Kristo.
Nʼihi na onye ọbụla Onyenwe anyị Chineke kpọrọ mgbe o bụ ohu, aghọọla onye nweere onwe ya nʼime Onyenwe anyị. Otu aka ahụ, onye nwerela onwe ya mgbe Onyenwe anyị kpọrọ ya aghọọla ohu nke Kraịst.
23 Mmekwisha nunuliwa kwa thamani, hivyo msiwe watumwa wa wanadamu.
Akwụọla ụgwọ isi unu, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ.
24 Kaka na dada zangu, katika maisha yoyote kila mmoja wetu tulipoitwa kuamini, tubaki kama vile.
Ụmụnna m, nʼọnọdụ ọbụla mmadụ nọ mgbe a kpọrọ ya, ya nọgidesie ike nʼime Chineke.
25 Sasa, wale wote ambao hawajaoa kamwe, sina amri kutoka kwa Bwana. Lakini nawapa maoni yangu kama nilivyo. Kwa huruma za Bwana, zinazo aminika
Ihe banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Enweghị m iwu ọbụla site nʼaka Onyenwe anyị banyere ajụjụ a, ma aga m ekwu uche nke aka m dịka onye sitere nʼebere nke Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi.
26 Kwa hiyo, ninafikiri hivyo kwa sababu ya usumbufu, ni vyema mwanaume abaki kama alivyo.
Echere m na ọ ka mma ugbu a, nʼihi nsogbu nke na-abịanụ ka onye ọbụla nọdụrụ onwe ya dịka o siri nọrọ ugbu a.
27 Umefungwa kwa mwanamke na kiapo cha ndoa? Usitake uhuru kutoka kwa hiyo. Una uhuru kutoka kwa mke au hujaolewa? Usitafute mke.
Ị lụọla nwanyị? Achọla nkewa. Ọ bụ na ị lụbeghị nwanyị? Ejela ịchọ onye ị ga-alụ.
28 Lakini kama ukioa, hujafanya dhambi. Na kama mwanamke hajolewa akiolewa, hajafanya dhambi. Bado wale wanaoana wanapata masumbufu ya aina mbalimbali. Nami nataka niwaepushe hayo.
Ma ọ bụrụ na i kpebie nʼobi gị ịlụ nwunye, i meghị mmehie ọbụla; ọ bụrụkwa na nwaagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe ọtụtụ nsogbu nʼime ụwa. Ọ ga-amasị m igbochiri unu nsogbu ndị ahụ.
29 Lakini nasema hivi, kaka na dada zangu, muda ni mfupi. Tangu sasa na kuendelea, wale walio na wake waishi kama hawana.
Ihe unu kwesiri ịma, ụmụnna, bụ na oge anyị nwere fọdụrụ naanị ntakịrị, site ugbu a gaa nʼihu ndị nwere nwunye ga-adị ndụ ha dịka ndị na-enweghị.
30 Wote walio na huzuni wajifanye kama walikuwa hawana huzuni, na wote wanaofurahi, kama walikuwa hawafurahi, na wote wanaonunua kitu chochote, kama hawakumiliki chochote.
Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dịka ndị ihe anaghị ewute, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dịka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọbụla.
31 Na wote wanaoshughulika na ulimwengu, wawe kama hawakushughulika nao. Kwa kuwa mitindo ya dunia inafikia mwisho wake.
Ka ndị na-etinye oge nʼihe ụtọ nke ụwa hapụ ibi ndụ ịchọ iritecha ihe niile dị nʼụwa nʼuru. Nʼihi na ụwa, otu ọ dị ugbu a, bụ ihe na-agabiga agabiga.
32 Ninataka muwe huru kwa masumbufu yote. Mwanaume asiyeoa anajihusisha na vitu vinavyo mhusu Bwana, namna ya kumpendeza yeye.
Unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya niile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.
33 Lakini mwanaume aliyeoa hujihusisha na mambo ya dunia, namna ya kumpendeza mkewe,
Ma nwoke nwere nwunye na-echegbu onwe ya banyere ihe igbo mkpa nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ.
34 amegawanyika. Mwanawake asiyeolewa au bikira hujihusisha na vitu kuhusu Bwana, namna ya kujitenga katika mwili na katika roho. Lakini mwanamke aliyeolewa hujihusisha kuhusu vitu dunia, namna ya kumfurahisha mme wake.
Ọ na-enwekwa obi abụọ nʼihe ọbụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nye nwaagbọghọ na-alụbeghị di maọbụ onye nke na-amabeghị nwoke, nchegbu ya bụ banyere ihe nke Onyenwe anyị. Ọchịchọ ya bụ ka ọ dị nsọ nʼanụ ahụ ya na nʼime mmụọ ya. Ma nwanyị nwere di na-echegbu onwe ya banyere ihe nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ di ya ụtọ.
35 Nasema hivi kwa faida yenu wenyewe, na siweki mtego kwenu. Nasema hivi kwa vile ni haki, ili kwamba mnaweza kujiweka wakfu kwa Bwana bila kikwazo chochote.
Ana m ekwu ihe ndị a maka ọ dị mma nke unu onwe unu, ọ bụghị ịgbalị igbochi unu, kama ọ bụ ka unu nwee ike bie ndụ unu nʼụzọ kwesiri ekwesi, werekwa ịhụnanya zuruoke rụọra Onyenwe anyị ọrụ.
36 Lakini kama mtu anafikiri hawezi kumtendea kwa heshima mwanawali wake, kwa sababu ya hisia zake zina nguvu sana, acha aoane naye kama apendavyo. Siyo dhambi.
Ọ bụrụ na nwoke ọbụla enweghị ike ijide onwe ya nʼihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya nʼebe nwaagbọghọ ya na ya kpebiri ịlụ nọ, ya mee ihe ọ na-achọ, o meghị mmehie ọbụla, ha lụọ di na nwunye.
37 Lakini kama amefanya maamuzi kutokuoa, na hakuna haja ya lazima, na kama anaweza kutawala hamu yake, atafanya vyema kama hatamwoa.
Ma ọ bụrụ na onye ọbụla ekpebie nʼobi ya, ma nwee ike ijide onwe ya, ka o si nʼenweghị mmanye ọbụla idebe nwaagbọghọ e kwuru na ọ ga-alụ na-enweghị mmekọ ọbụla, ọ bụ ihe dị mma ka o mere.
38 Hivyo, anayemwoa mwanamwali wake afanya vyema, na yeyote ambaye anachagua kutooa atafanya vyema zaidi.
Ya mere, onye ahụ lụrụ nwaagbọghọ o kwuru na ọ ga-alụ mere nke ọma, ma onye kpebikwara na ọ gaghị alụ mekwara nke ọma karịa.
39 Mwanamke amefungwa na mmewe wakati yu hai. Lakini kama mmewe akifa, yuko huru kuolewa na yeyote ampendaye, lakini katika Bwana tu.
Njikọta e jikọtara nwunye na di ya na-adị ire naanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ, ma ọ lụọ ya nʼime Onyenwe anyị.
40 Bado katika maamuzi yangu, atakuwa na furaha zaidi kama akiishi kama alivyo. Na ninafikiri kuwa nami pia nina Roho wa Mungu.
Nʼuche m, ọ ga-enwe ọṅụ nʼobi ya karịa ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ọzọ. Ana m echekwa na mụ onwe m nwekwara Mmụọ nke Chineke.