< 1 Nyakati 9 >
1 Kwa hivyo watu wote wa Israeli walinakiliwa ki uzao. Walinakiliwa katika vitabu vya kifalme vya Israeli. Yuda, walipelekwa matekani Babylon kwasababu ya dhambi zao.
E dere usoro ọmụmụ ụmụ Izrel niile nʼime akwụkwọ ndị eze Izrel na Juda. Emesịa, a dọọrọ ha nʼagha buru ha gaa Babilọn nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
2 Wakwanza kurudi kuishi katika miiji yao walikuwa Waisraeli, Makuhani, Walawi, na Watumishi wa hekalu.
Nʼime ndị a, ndị bụ ụzọ lọta bịa birikwa nʼihe onwunwe ha nʼobodo nke aka ha bụ ụfọdụ ndị Izrel, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu.
3 Baadhi ya uzao wa Yuda, Benjamin, Efraimu, na Manase waliishi Yerusalemu.
Ndị si nʼebo Juda, na Benjamin, na Ifrem na Manase lọta bịa biri na Jerusalem bụ ndị a:
4 Wahamiaji walijumusha Uthai mwana wa Ammihudi mwana wa Omri mwana wa Bani, moja ya uzao wa Perezi mwana wa Yuda.
Utai nwa Amihud, nwa Omri, nwa Imri, nwa Bani, onye ikwu Perez, nwa Juda.
5 Kati ya Mashilonite kulikuwa na Asaia mtoto wa kwanza na wana wake.
Nʼezinaụlọ Shilo: Asaya nwa mbụ ya na ụmụ ya ndị ikom.
6 Kati ya uzao wa Zera alikuwa Yeuli. Uzao wao ulikuwa na namba 690.
Ụmụ Zera, Jeuel so nʼime ha. Ọnụọgụgụ ndị Juda niile lọtara dị narị isii na iri itoolu.
7 Katika uzao Benjamini walikuwa Salu mwana wa Meshulamu mwana wa hodavia mwana wa Hssenua.
Ụmụ Benjamin: Salu nwa Meshulam, nwa Hodavaya, nwa Hasenua;
8 Pia walikuwa Ibneia mwana wa Yerohamu; Ela mwana wa Uzzi mwana wa Mikri; na Meshullam mwana wa Shefatia mwana waReuli mwana wa Ibnija.
na Ibneia nwa Jeroham; Elaa nwa Uzi, nwa Mikri; na Meshulam nwa Shefataya, nwa Reuel, nwa Ibnija.
9 Ndugu zao waliandika kwenye orodha ya namba 956 ya vizazi vyao. Wanaume wote hawa walikuwa viongozi wa koo za mababu zao.
Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị Benjamin niile lọtara ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ha, dị narị itoolu na iri ise na isii.
10 Makuhani walikuwa Yedaia, Yehoiarib, na Yokini.
Ndị nchụaja: Jedaya, Jehoiarib na Jakin;
11 Walikuwa pia Azaria mwana wa Hilkia mwana wa Meshullamu mwana wa Zadoki mwana wa Meraioti mwana wa Ahitubi, aliyekuwa na mamlaka katika nyumba ya Mungu.
Azaraya nwa Hilkaya, nwa Meshulam, nwa Zadọk, na Meraiot, nwa Ahitub. Azaraya bụ onye na-elekọta ụlọnsọ ukwu Chineke.
12 Kulikuwa na Adaia mwana wa Yerohamu mwana wa Pashuri mwana wa Malkija. Pia kulikuwa na Maasai mwanawa Adieli mwana wa Yazera mwana wa Meshulamu mwana wa Meshilemiti mwana wa Imma.
Ndị nchụaja ọzọ lọtaranụ bụ Adaya nwa Jeroham, nwa Pashua, nwa Malkija. Onye ọzọ bụ Maasai nwa Adiel, nwa Jazera, nwa Meshulam nwa Meshilemit, nwa Imea
13 Ndugu zao, ambao walikuwa viongozi katika koo za mababu zao, idadi ya 1, 760. Walikuwa ni wanaume wenye uwezo sana wa kufanya kazi katika nyumba ya Mungu.
Ọnụọgụgụ ndị nchụaja lọtaranụ bụ otu puku na narị asaa, na iri isii. Ha niile bụkwa ndịisi ezinaụlọ, ndị tozuru etozu ịrụ ọrụ ha, ndị ọrụ ha bụ ije ozi nʼụlọnsọ Chineke.
14 Kati ya Walawii, kulikuwa na Shemaia mwana wa Hashubu mwana wa Azrikam mwana wa Hashabia, kati ya uzao wa Merari.
Ndị Livayị: Shemaya nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaya onye ikwu Merari.
15 Walikuwako pia Bakbakari, Hereshi, Galali, na Mattania mwana wa Mika mwana wa Zikri mwana wa Asafu.
Bakbaka, Heresh, Galal, na Matanaya nwa Mika, nwa Zikri, nwa Asaf;
16 Walikuwako pia Obadia mwana wa Shemaia mwana wa Galali mwana wa Yedutuni; na Berekia mwana wa Asa mwana wa Elkana, aliyeishikatika vijiji vya Netophathites.
Ọbadaya nwa Shemaya, nwa Galal, nwa Jedutun; na Berekaya nwa Asa, nwa Elkena onye biri nʼobodo nta ndị Netofa.
17 Walinzi wa lango walikuwa Shalumu, Akubi, Talimoni, Ahimani, na uzao wao. Shalumu alikuwa kiongozi wao.
Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ si nʼebo Livayị: Shalum, onyeisi ha, Akub, Talmon, Ahiman na ụmụnna ha.
18 Awali walisimama kulinda katika geti la mfalme upande wa mashariki wa kambi ya uzao wa Walawi.
Ha nọ ruo ugbu a nʼọnụ ụzọ ama Eze, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ha bụ ndị nche ọnụ ụzọ ama si nʼọmụma ụlọ nke ndị Livayị.
19 Shalumu mwana wa Kore mwana wa Ebiasafu, ambaye kama mwana wa Kora, na ndugu zake kutoka nyumba ya baba yake, Korahite, alikuwa na mamlaka kwa kazi ya huduma, Walilinda mlango wa hema, kama mababu zao walivyolinda kambi ya Yawehi, na pia walilinda lango la kuingilia.
Shalum bụ nwa Kore, na nwa nwa Ebiasaf na Kora. Ya na ụmụnna ya ka ọ bụ ọrụ ha ilekọta ebe a na-eje ozi, na ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ dịka nna nna ha lekọtara, cheekwa ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.
20 Finehasi mwana wa Eleaza aliwaongoza kipindi cha nyuma, na Yahwehi alikuwa pamoja nae.
Finehaz nwa Elieza bụ onyeisi ndị mbụ rụrụ ọrụ a na mgbe ochie, Onyenwe anyị nọnyekwaara ya.
21 Zekaria mwana wa Meshelemia alikua mlinzi katika mlango wa kuingilia hekalu, “eneo la kukutania.”
Mgbe ahụ, Zekaraya nwa Meshelemaia bụ onye na-elekọta ọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ ikwu.
22 Hawa wote walichaguliwa kana walinzi wa mageti ya kuingilia kwa idadi ya 212. Majina yao yaliandikwa kwenye kumbukumbu za watu katika vijiji vyao. Mtabiri aliwaweka Daudi na Samueli katika nafasi ya uaminifu.
Ọnụọgụgụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nche nʼoge ahụ bụ narị abụọ na iri na abụọ. E depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nke obodo nta ha. Ndị nche ọnụ ụzọ ama ndị a bụ ndị Devid na Samuel onye amụma họpụtara nye ha ọnọdụ a nʼihi na-atụkwasịrị ha obi.
23 Kwa hivyo wao na watotot wao walilinda mageti katika nyumba ya Yawehi, hema la kuabudia.
Ha na ụmụ ụmụ ha ka e tinyere ya nʼaka iche ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.
24 Walinzi wa mageti waliwekwa katika pande zote nne, upande wa mashariki, magharibi, kaskazini, na kusini.
Ha na-eche akụkụ anọ ya niile, ọwụwa anyanwụ, ọdịda anyanwụ, ugwu na ndịda.
25 Kaka zao, walioishi kwenye vijiji vyao, walikuja kuwasaidia baada ya mzunguko wa siku saba.
Ụbọchị asaa ka ha na-anọ nʼọrụ a. Emesịa, ụmụnna ha na-abịa gbanwee ha. Ya mere, ha na-agbanwe onwe ha ụbọchị asaa asaa.
26 Lakini viongozi wanne wa walinzi, ambao walikwa walawi, walipangiwa kulinda vyumba na vyumba vya kuhifadhi katika nyumba ya Mungu.
Ma ndịisi nche ọnụ ụzọ ama anọ ndị ahụ bụ ndị Livayị ka esitere nʼịtụkwasị obi nyefee ọrụ ilekọta ime ụlọ niile nakwa ụlọakụ niile dị nʼime ụlọ Chineke nʼaka.
27 Walitumia usiku wao sehemu walizowekwa kuzunguka nyumba ya Mungu, kwao ilikuwa ni wajibu wao kulinda. Na walifungua geti kila asubuhi.
Ha na-eche nche gburugburu ụlọnsọ Chineke abalị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka ọ dị nʼaka iche ya nche. Ọ bụkwa ha ka e nyefere ọrụ imeghe ya ụtụtụ niile.
28 Baadhi yao waliwajibika katika hekalu la vifaa; walihesabu makala zilizo ingizwa ndani na zilizo tolewa nje.
Ụfọdụ nʼime ha ka ọ dị nʼaka ilekọta ngwongwo e ji achụ aja. Ha na-agụ ya ọnụ mgbe ọbụla e webatara ya, na mgbe ọbụla a na-ewepụ ya.
29 Baadhi yao pia waliwekwa kutunza vitu vitakatifu, vifaa, na vitu, kujuisha unga safi, mvinyo, mafuta, manukato, na uvumba.
Ndị ọzọ na-elekọta ihe niile e ji chọọ ụlọnsọ ahụ mma, ya na ụtụ ọka, na mmanya, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ụda dị iche iche.
30 Baadhi ya wana wa makuhani walichanganya uvumba.
Ma ọ bụ ndị nchụaja ndị ọzọ ka e nyere ọrụ ịsụ, ịgwakọta na ịkpụkọta ụda na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
31 Matithia, mmoja wa walawi, ambaye alikuwa mtoto wa kwanza wa Shalumu wa Wakorahi, alikuwa na wajibu wa kuandaa mikate kwa ajili ya sadaka.
Matitaia, onye Livayị, ọkpara Shalum, onye ikwu Kora, ka esitere na ntụkwasị obi nyefee ya ọrụ ime achịcha onyinye.
32 Baadhi ya kaka zao, uzao wa kohathite, waliwajibika kwa mikate ya uwepo, kuandaa kila Sabatho.
Ụfọdụ nʼime ndị ikwu Kohat ka ọ dị nʼaka ime achịcha pụrụ iche, a na-adọkwasị nʼelu tebul, nʼụbọchị izuike niile.
33 Waimbaji na viongozi wa familia ya Walawi waliishi ndani ya vyumba katika mahali takatifu walipo kuwa hawafanyi kazi, kwa sababu wapiswa kufanya kazi walio pangiwa usiku na mchana.
Ndị ọbụ abụ, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị na-anọgide nʼime ọnụụlọ ndị dị nʼụlọnsọ ukwu nʼihi na e kweghị ka ha rụọ ọrụ ọzọ ebe ọ bụ na ha na-arụ ọrụ ịbụ abụ ehihie na abalị niile.
34 Hawa walikuwa viongozi wa familia miongoni mwa Walawi, kama ilivyo orodheshwa katika kumbukumbu za uzao wao. Waliishi Yerusalemu.
Ha niile bụ ndịisi ezinaụlọ nʼebo Livayị. Ndị ndu dịka e depụtakwara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ha bikwa na Jerusalem.
35 Baba wa Gibeoni, Yeiel, ambaye mkewe aliitwa Maaka, aliishi Gibeoni.
Jeiel nna Gibiọn bụ na Gibiọn ka o bi, Aha nwunye ya bụ Maaka.
36 Mtoto wake wa kwanza alikuwa Abdoni, alafu wana wake Zuri, Kishi, Baali, Neri, Nadabu,
Ọ mụrụ Abdon, ọkpara ya, Zua, Kish, Baal, Nea, Nadab,
37 Gedori, Ahio, Zekaria, na Mikloti.
Gedoa, Ahio, Zekaraya na Miklot.
38 Mikloti alikuwa baba wa Shimeamu. Pia waliishi karibu na kaka yao huko Yerusalemu.
Miklot bụ nna Shimeam. Ha onwe ha sokwa ụmụnna ha biri na Jerusalem.
39 Neri alikuwa baba wa Kishi. Kishi alikuwa baba wa Sauli. sauli alikuwa baba wa Yonathani, malkishua, Abinadabu, na Ishbaali.
Nea mụrụ Kish nna Sọl, onye bụ nna Jonatan, Malkishua, Abinadab na Esh-Baal.
40 Mwana wa Jonathani alikuwa Merib baali. Merib baali alikuwa baba wa Mika.
Jonatan mụrụ Merib-Baal nna Maịka.
41 Mwana wa Mika walikuwa pithoni, Meleki, Tahrea, na ahazi.
Maịka mụrụ Piton, Melek, Tahrea na Ehaz.
42 Ahazi alikuwa baba wa Jara. Jara alikuwa baba wa Alemeti, Azmaveti, na zimri. Zimri alikuwa baba wa Moza.
Ehaz mụrụ Jada. Jada bụ nna Alemet, Azmavet na Zimri. Zimri mụrụ Moza.
43 Moza alikuwa baba wa Binea. Binea alikuwa baba wa Refaia. Refaia alikuwa baba wa Eleas. eleasa alikuwa baba wa Azeli.
Moza mụrụ Binea, nna Refaya, nna Eleasa, nna Azel.
44 Wana sita wa Azeli walikuwa Azrikamu, Bochera, Ishmaeli, shearia, Obdia, na Hanani. hawa walikuwa wana wa Azeli
Azel mụrụ ụmụ isii: Azrikam, Bokeru, Ishmel, Shearaya, Ọbadaya na Hanan. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Azel.