< 1 Nyakati 24 >
1 Makundi vya kazi kulingana na uzao wa Aroni yalikuwa haya: Nadabu, Abihu, Eleazari na Ithamari.
Ndị a bụ otu e si kenye ụmụ Erọn ọrụ ije ozi ha: Ụmụ ndị ikom Erọn bụ Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.
2 Nadabu na Abihu walikufa kabla ya baba yao kufa. Walikuwa hawana watoto, kwahiyo Eleazari na Ithamari walitumika kama makuhani.
Ma Nadab na Abihu nwụrụ tupu nna ha anwụọ. Ha amụtaghị ụmụ ndị ikom, ya mere, Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja.
3 Daudi pamoja na Zadoki, uzao wa Eleazari, na Ahimeleki, uzao wa Ithamari, waliwagawanya katika makundi yao ya kazi kama makuhani.
Devid kewara ha dịka usoro ije ozi ha ga-esi dị. Ọ bụ Zadọk onye ikwu Elieza, na Ahimelek onye ikwu Itama nyeere Devid aka ime nke a.
4 Kulikuwa na wanaume viongozi zaidi kati ya uzao wa Eleazari kuliko kati ya uzao wa Ithamari, kwahiyo waligawanya uzao wa Eleazari katika makundi kumi na sita. Walifanya hivyo na viongozi wa ukoo na uzao wa Ithamari. Magawanyo haya yalikuwa nane kwa idadi, sambamba na koo zao.
Ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Elieza karịrị ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Itama. Nʼihi ya, e sitere nʼikwu Elieza nweta ndịisi ezinaụlọ iri na isii, sitekwa nʼikwu Itama nweta ndịisi ezinaụlọ asatọ.
5 Waliwagawanya bila upendeleo kwa kura, kwa kuwa walikuwa waamuzi watakatifu na waamuzi wa Mungu, kutoka pande zote uzao wa Eleazari na uzao wa Ithamari.
E kere ha na-eleghị onye ọbụla anya nʼihu, site nʼife nza, nʼihi na e nwere ndịisi ozi ebe nsọ, nweekwa ndịisi ozi Chineke nʼetiti ndị ikwu Elieza na Itama.
6 Shemaia mwana wa Nethaneli mwandishi, Mlawi, aliandika majina yao mbele ya mfalme, muamuzi, kuhani Zadoki, Ahimeleki mwana wa Abiathari, na viongozi wa makuhani na familia za Walawi. Ukoo mmoja ulichaguliwa kwa kura kutoka uzao wa Eleazari, na kisha uliofata utachaguliwa kutoka uzao wa Ithhamari.
Ode akwụkwọ Shemaya, nwa Netanel, onye Livayị, dekọtara aha ndị a niile nʼihu eze, na ndịisi ozi eze, ya bụ, Zadọk onye nchụaja, na Ahimelek nwa Abịata, na ndịisi ezi ndị nchụaja, na nke ndị Livayị. E sitere nʼikwu Elieza, họrọ otu ezinaụlọ, sitekwa nʼikwu Itama họrọ otu ezinaụlọ.
7 Kura ya kwanza ilienda kwa Yehoiaribu, ya pili kwa Yedaia,
Nza nke mbụ mara Jehoiarib nke abụọ a maa Jedaya
8 ya tatu kwa Harimu, ya nne kwa Seorimu,
nke atọ, Harim nke anọ, Seorim
9 ya tano kwa Malikija, ya sita kwa Mijamini,
nke ise, Malkija nke isii, Mijamin
10 ya saba kwa Hakozi, ya nane kwa Abija,
nke asaa, Hakoz nke asatọ, Abija
11 ya tisa kwa Yeshua, ya kumi kwa Shekania,
nke itoolu, Jeshua nke iri, Shekanaya
12 ya kumi na moja kwa Eliashibu, ya kumi na mbili kwa Yakimu,
nke iri na otu, Eliashib nke iri na abụọ, Jakim
13 ya kumi na tatu kwa Hupa, ya kumi na nne kwa Yesheheabu,
nke iri na atọ, Hupa nke iri na anọ, Jeshebeab
14 ya kumi na tano kwa Biliga, ya kumi na sita kwa Imma,
nke iri na ise, Bilga nke iri na isii, Imea
15 ya kumi na saba kwa Heziri, ya kumi na nane kwa Hapizezi,
nke iri na asaa, Hezia nke iri na asatọ, Hapizez
16 ya kumi na tisa kwa Pethaia, ya ishirini kwa Yehezikeli,
nke iri na itoolu, Petahaya nke iri abụọ, Jehezkel
17 ya ishirini na moja kwa Yakini, ya ishirini na mbili kwa Gamuli,
nke iri abụọ na otu, Jakin nke iri abụọ na abụọ, Gamul
18 ya ishirini na tatu kwa Delaia, na ya ishirini na nne kwa Maazia.
nke iri abụọ na atọ, Delaya nke iri abụọ na anọ, Maazaya.
19 Hii ilikuwa taratibu ya utumishi wao, walipo kuja kwenye nyumba ya Yahweh, wakifuata utaratibu waliopewa na Aruni babu yao, kama Yahweh, Mungu wa Israeli, alivyo waagiza.
Otu a ka e si keere ha usoro ije ozi ha mgbe ha batara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. E mere ya dị ka ụkpụrụ nna nna ha Erọn nyere ha si dị, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya nʼiwu.
20 Hawa walikuwa Walawi waliobakia: Wana wa Amiramu, Shebueli; wana wa Shebaeli, Yedeia.
Ndị a bụkwa ndị ndu a họpụtara nʼebo Livayị: Site nʼụmụ Amram, a họpụtara Shubuel. Site nʼụmụ Shubuel a họpụtara Jehdeia.
21 Wana wa Rehabia: wana wa Rehabia, Ishia kiongozi.
Site nʼụmụ Rehabaya, onye mbụ a họpụtara bụ Ishaya.
22 Wa Waizari, Shelomothi; mwana wa Shelomothi, Yahathi.
Site na ndị Izha a họpụtara Shelomot. Sitekwa nʼụmụ Shelomot a họpụtaara Jahat.
23 Wana wa Hebroni: Yeria kiongozi, Amaria wapili, Yahazieli watatu, na Yekameamu wanne.
Site nʼụmụ Hebrọn a họpụtara Jeraya, nwa mbụ ya, Amaraya nwa nke abụọ ya, Jahaziel nwa nke atọ ya na Jekameam nwa nke anọ ya.
24 Wana wa uzao wa Uzieli ulimjumuisha Mika. Uzao wa Mika ulimjumuisha Shamiri.
A họpụtara Maịka nwa Uziel, sitekwa nʼụmụ Maịka họpụta Shamia.
25 Kaka wa Mika alikuwa Ishia. Wana wa Ishia akijumuishwa Zakaria.
A họpụtara nwanne Maịka nke nwoke aha ya bụ Ishaya, sitekwa nʼụmụ Ishaya họpụta Zekaraya.
26 Wana na Merari: Mahli na Mushi. Mwana wa Yaazia, Beno.
Site nʼụmụ Merari e nwere Mahali na Mushi. A họpụtakwara Beno nwa Jaazia.
27 Wana wa Merari: Yaazia, Beno, Shohamu, Zakuri, na Ibrri.
Sitekwa nʼụmụ Merari a họpụtara ụmụ Jaazia ndị a: Beno, Shoham, Zakua na Ibri.
28 Wana wa Mahili: eleazari, ambaye alikuwa hana wana.
Site nʼụmụ Mahali a họpụtara Elieza, ma Elieza nʼonwe ya amụtaghị nwa nwoke.
29 Wana wa Kishi: Yerameli
Site nʼụmụ Kish a họpụtara Jerameel.
30 wana wa Mushi: Mahli, Eda, na yerimothi. Walikuwa walawi, walio orodheshwa na familia zao.
Site nʼụmụ Mushi, a họpụtara Mahali, na Eda na Jerimot. Ndị a niile bụ ndị Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị.
31 Wanaume hawa ambao walikuwa vichwa katika nyumba za baba zao na kila wadogo zao, walipiga kura katika uwepo wa Mfalme Daudi, na Zadoki na Ahimeleki, pamoja na viongozi wa familia wa makuhani na Walawi. Walirusha kura kama uzao wa Aroni walivyofanya.
Dịka e mere mgbe a na-ahọpụta ụmụ Erọn, e ji ife nza kenye ha niile ọrụ ha kwesiri ịrụ nʼotu nʼotu, onye ukwu ha na onye nta ha. E mere ya nʼihu eze Devid, na Zadọk, na Ahimelek, na ndịisi ezinaụlọ ndị nchụaja na ndị Livayị niile. Mgbe a na-efe nza a, e mesoro ndị ikom niile otu mmeso, ma okenye ha ma ndị na-etolite etolite.