< Ufunuo 7 >

1 Baada ya hili nikaona malaika wanne wakiwa wamesimama katika pembe nne za dunia, wakizuia hizo pepo nne za dunia, ili kwamba pasiwe na upepo utakaovuma juu ya nchi au juu ya bahari au juu ya mti wowote.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nʼakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọbụla ghara ife nʼelu ala, na nʼelu osimiri, na nʼelu osisi.
2 Nikaona malaika mwingine akipanda kutoka mawio ya jua akiwa na muhuri wa Mungu aliye hai. Akawaita kwa sauti kubwa wale malaika wanne waliokuwa wamepewa mamlaka ya kuidhuru nchi na bahari, akisema,
Mgbe ahụ, ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼọwụwa anyanwụ na-apụta, akara Chineke dị ndụ dịkwa nʼaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri,
3 “Msiidhuru nchi wala bahari, wala miti, hadi tuwe tumetia muhuri kwenye vipaji vya nyuso za watumishi wa Mungu wetu.”
na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha.”
4 Ndipo nikasikia idadi ya wale waliotiwa muhuri: yaani 144,000 kutoka makabila yote ya Israeli.
Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel.
5 Kutoka kabila la Yuda 12,000 walitiwa muhuri, kutoka kabila la Reubeni 12,000, kutoka kabila la Gadi 12,000,
Ndị a kara akara site nʼebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ. Ndị si nʼebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ. Ndị si nʼebo Gad dị puku mmadụ iri na abụọ.
6 kutoka kabila la Asheri 12,000, kutoka kabila la Naftali 12,000, kutoka kabila la Manase 12,000,
E sitere nʼebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ. Ndị sitekwara nʼebo Naftalị dị puku mmadụ iri na abụọ. E sitere nʼebo Manase họpụta puku mmadụ iri na abụọ.
7 kutoka kabila la Simeoni 12,000, kutoka kabila la Lawi 12,000, kutoka kabila la Isakari 12,000,
Ndị si nʼebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ. Ndị sitere nʼebo Livayị dị puku mmadụ iri na abụọ. Ndị si nʼebo Isaka dị puku mmadụ iri na abụọ.
8 kutoka kabila la Zabuloni 12,000, kutoka kabila la Yosefu 12,000, na kutoka kabila la Benyamini 12,000.
E sitere nʼebo Zebụlọn họpụta puku mmadụ iri na abụọ. Ndị si nʼebo Josef dị puku mmadụ iri na abụọ. Ndị sikwa nʼebo Benjamin dị puku mmadụ iri na abụọ.
9 Baada ya hili nikatazama na hapo mbele yangu palikuwa na umati mkubwa wa watu ambao hakuna yeyote awezaye kuuhesabu, kutoka kila taifa, kila kabila, kila jamaa na kila lugha, wamesimama mbele ya kile kiti cha enzi na mbele ya Mwana-Kondoo. Walikuwa wamevaa mavazi meupe na wakiwa wameshika matawi ya mitende mikononi mwao.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m oke igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nke onye ọbụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche na ndị niile na asụsụ dị iche iche, na-eguzo nʼihu ocheeze ahụ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe ọcha, jirikwa igu nkwụ nʼaka ha.
10 Nao walikuwa wakipiga kelele kwa sauti kubwa wakisema: “Wokovu una Mungu wetu, yeye aketiye kwenye kiti cha enzi, na Mwana-Kondoo!”
Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị, “Nzọpụta dịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.”
11 Malaika wote walikuwa wamesimama kukizunguka kile kiti cha enzi na wale wazee ishirini na wanne na wale viumbe wanne wenye uhai. Wakaanguka kifudifudi mbele ya hicho kiti cha enzi na kumwabudu Mungu,
Ndị mmụọ ozi niile ahụ guzoro ocheeze ahụ gburugburu, ha na ndị okenye ahụ na anụ anọ ahụ dị ndụ. Ha dara, kpuo ihu ha nʼala nʼihu ocheeze ahụ feekwa Chineke ofufe,
12 wakisema: “Amen! Sifa na utukufu na hekima na shukrani na heshima na uweza na nguvu viwe kwa Mungu wetu milele na milele. Amen!” (aiōn g165)
na-asị, “Amen! Ngọzị niile na otuto niile, na amamihe niile na ekele niile na nsọpụrụ niile na ike niile na ume niile, dịrị Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.” (aiōn g165)
13 Kisha mmoja wa wale wazee ishirini na wanne akaniuliza, “Ni nani hawa waliovaa mavazi meupe, nao wametoka wapi?”
Mgbe ahụ, otu nʼime ndị okenye ahụ zara m sị, “Ị maara ndị ahụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ, ebee ka ha siri pụta?”
14 Nikamjibu, “Bwana, wewe wajua.” Naye akasema, “Hawa ni wale waliotoka katika ile dhiki kuu, nao wamefua mavazi yao katika damu ya Mwana-Kondoo na kuyafanya meupe kabisa.
Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Nwa Atụrụ ahụ.
15 Kwa hiyo, “Wako mbele ya kiti cha enzi cha Mungu na kumtumikia usiku na mchana katika hekalu lake; naye aketiye katika kile kiti cha enzi atatanda hema yake juu yao.
Ọ bụ nke a mere, “ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chineke na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya. Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ ga-ekpuchikwa ha.
16 Kamwe hawataona njaa wala kiu tena. Jua halitawapiga wala joto lolote liunguzalo.
‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla. Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’ okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ.
17 Kwa maana Mwana-Kondoo aliyeko katikati ya kile kiti cha enzi atakuwa Mchungaji wao; naye atawaongoza kwenda kwenye chemchemi za maji yaliyo hai. Naye Mungu atafuta kila chozi kutoka macho yao.”
Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha; ‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’ ‘Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’”

< Ufunuo 7 >