< Zaburi 87 >
1 Zaburi ya wana wa Kora. Wimbo. Ameuweka msingi wake katika mlima mtakatifu;
Abụ Ọma ụmụ Kora. Otu Abụ. Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ;
2 Bwana anayapenda malango ya Sayuni kuliko makao yote ya Yakobo.
Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya, karịa ebe obibi niile nke Jekọb.
3 Mambo matukufu yanasemwa juu yako, ee mji wa Mungu:
Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị, O obodo Chineke; (Sela)
4 “Nitaweka kumbukumbu ya Rahabu na Babeli miongoni mwa wale wanaonikubali mimi: Ufilisti pia na Tiro, pamoja na Kushi, nami nitasema, ‘Huyu alizaliwa Sayuni.’”
“Aga m agụnye Rehab na Babilọn, dịka ndị na-asọpụrụ m, aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush, aga m asị, ‘A mụrụ nke a na Zayọn.’”
5 Kuhusu Sayuni itasemwa hivi, “Huyu na yule walizaliwa humo, naye Aliye Juu Sana mwenyewe atamwimarisha.”
Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị, “A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya, ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike.”
6 Bwana ataandika katika orodha ya mataifa: “Huyu alizaliwa Sayuni.”
Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ: “A mụrụ onye a na Zayọn.”
7 Watakapokuwa wanapiga vinanda wataimba, “Chemchemi zangu zote ziko kwako.”
Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị, “Isi iyi m niile dị na gị.”