< Zaburi 74 >

1 Utenzi wa Asafu. Ee Mungu, mbona umetukataa milele? Mbona hasira yako inatoka moshi juu ya kondoo wa malisho yako?
Abụ maskil nke Asaf. Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi? Gịnị mere iwe gị ji akwụ anwụrụ megide igwe atụrụ ndị ị na-azụ?
2 Kumbuka watu uliowanunua zamani, kabila la urithi wako, ambao uliwakomboa: Mlima Sayuni, ambamo uliishi.
Cheta mba ahụ nke ị zụtara na mgbe ochie, ebo ahụ bụ ihe nketa gị, ndị ị gbapụtara, nʼugwu Zayọn ebe i biri.
3 Geuza hatua zako kuelekea magofu haya ya kudumu, uharibifu wote huu ambao adui ameuleta pale patakatifu.
Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a. Ọ bụ onye iro wetara ịla nʼiyi a niile nʼụlọnsọ a.
4 Adui zako wamenguruma pale ulipokutana nasi, wanaweka bendera zao kama alama.
Ndị iro gị gbọrọ ụja nʼebe i zutere anyị. Ha weliri ọkọlọtọ ha dịka ihe ịrịbama.
5 Walifanya kama watu wanaotumia mashoka kukata kichaka cha miti.
Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụike ha ga-eji gbutuo ọtụtụ osisi dị nʼoke ọhịa.
6 Walivunjavunja milango yote iliyonakshiwa kwa mashoka na vishoka vyao.
Ha ji anyụike na egbugbu ha kụjisie ihe niile eji amachi ihe bụ nke egbunyere ihe.
7 Waliteketeza kabisa mahali pako patakatifu, wakayanajisi makao ya Jina lako.
Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa. Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị.
8 Walisema mioyoni mwao, “Tutawaponda kabisa!” Walichoma kila mahali ambapo Mungu aliabudiwa katika nchi.
Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!” Ha kpọrọ ebe niile a na-anọ efe Chineke nʼala a ọkụ.
9 Hatukupewa ishara za miujiza; hakuna manabii waliobaki, hakuna yeyote kati yetu ajuaye hali hii itachukua muda gani.
Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke. Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ.
10 Ee Mungu, mtesi atakudhihaki mpaka lini? Je, adui watalitukana jina lako milele?
O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị? Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi?
11 Kwa nini unazuia mkono wako, mkono wako wa kuume? Uutoe kutoka makunjo ya vazi lako na uwaangamize!
Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi!
12 Lakini wewe, Ee Mungu, ni mfalme wangu tangu zamani, unaleta wokovu duniani.
Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie. Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa.
13 Ni wewe uliyeigawanya bahari kwa uweza wako; ulivunja vichwa vya wanyama wakubwa wa kutisha katika maji.
Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ. Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri.
14 Ni wewe uliyeponda vichwa vya Lewiathani nawe ukamtoa kama chakula kwa viumbe vya jangwani.
Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan, mee ka ọ ghọọ nri nye ụmụ anụmanụ bi nʼọzara.
15 Ni wewe uliyefungua chemchemi na vijito, ulikausha mito ambayo ilikuwa ikitiririka daima.
Ọ bụ gị mere ka isi iyi na mmiri iyi na-asọ. I mere ka osimiri na-eru eru mgbe niile taa.
16 Mchana ni wako, nao usiku ni wako pia, uliziweka jua na mwezi.
Ehihie na abalị bụ nke gị. I mere ka anyanwụ na ọnwa guzosie ike.
17 Ni wewe uliyeiweka mipaka yote ya dunia, ulifanya kiangazi na masika.
Ọ bụ gị kewapụtara oke ala niile nke ụwa. Ọ bụ gị mere ka ọkọchị na udu mmiri dị.
18 Ee Bwana, kumbuka jinsi mtesi alivyokudhihaki, jinsi watu wapumbavu walivyolitukana jina lako.
O Onyenwe anyị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị, na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo.
19 Usiukabidhi uhai wa njiwa wako kwa wanyama wakali wa mwitu; usisahau kabisa uhai wa watu wako wanaoteseka milele.
Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka. Echefukwala ndụ ndị gị a na-akpagbu ruo mgbe ebighị ebi.
20 Likumbuke agano lako, maana mara kwa mara mambo ya jeuri yamejaa katika sehemu za giza nchini.
Chetakwa ọgbụgba ndụ gị, nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a.
21 Usiruhusu walioonewa warudi nyuma kwa aibu; maskini na wahitaji hebu walisifu jina lako.
Ekwela ka ndị a na-akpagbu gbaghachi azụ nʼihere; ka ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa too aha gị.
22 Inuka, Ee Mungu, ujitetee; kumbuka jinsi wapumbavu wanavyokudhihaki mchana kutwa.
O Chineke, bilie, kpechitara onwe gị ikpe. Chetakwa otu ndị nzuzu si kọọ gị ọnụ ogologo ụbọchị niile.
23 Usipuuze makelele ya watesi wako, ghasia za adui zako, zinazoinuka mfululizo.
Elepụla mkpọtụ nke ndị iro gị niile anya, olu mkpọtụ nke ndị iro gị na-aga nʼihu na-ala elu.

< Zaburi 74 >