< Zaburi 64 >
1 Kwa mwimbishaji. Zaburi ya Daudi. Ee Mungu, unisikie ninapoeleza lalamiko langu, uyahifadhi maisha yangu kutokana na vitisho vya adui.
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Nụrụ olu m O Chineke, mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m. Chebe ndụ m site nʼaka ndị iro m.
2 Unifiche kutokana na shauri la siri la waovu, kutokana na zile kelele za kundi la watenda mabaya.
Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ, site nʼatụmatụ ndị na-eme ajọ ihe.
3 Wananoa ndimi zao kama panga na kuelekeza maneno yao kama mishale ya kufisha.
Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha, na-agbapụ okwu dịka àkụ ọjọọ.
4 Hurusha mishale kutoka kwenye mavizio kwa mtu asiye na hatia, humrushia ghafula bila woga.
Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo, na mberede ka ha na-agba ya, na-atụghị egwu.
5 Kila mmoja humtia moyo mwenzake katika mipango mibaya; huzungumza juu ya kuficha mitego yao, nao husema, “Ni nani ataiona?”
Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ, ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo, ha na-asị, “Onye ga-ahụ ya?”
6 Hufanya shauri baya la dhuluma na kusema, “Tumebuni mpango mkamilifu!” Hakika nia na moyo wa mwanadamu vina hila.
Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị, “Anyị echepụtala atụmatụ zuruoke!” Nʼezie, uche na obi mmadụ dị aghụghọ.
7 Bali Mungu atawapiga kwa mishale, nao ghafula wataangushwa.
Ma Chineke ga-agba ha àkụ, na mberede ka a ga-etida ha.
8 Atageuza ndimi zao wenyewe dhidi yao na kuwaleta kwenye maangamizi; wote wawaonao watatikisa vichwa vyao kwa dharau.
Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha, mee ka ha laa nʼiyi; ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo.
9 Wanadamu wote wataogopa, watatangaza kazi za Mungu na kutafakari yale aliyoyatenda.
Mmadụ niile ga-atụ egwu, ha ga-ekwupụta ọrụ niile nke Chineke, ma tụgharịa uche nke ọma banyere ihe o mere.
10 Wenye haki na wafurahi katika Bwana, na wakimbilie kwake; wanyofu wote wa moyo na wamsifu yeye!
Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, ha ga-agbabakwa nʼime ya; ndị niile obi ha ziri ezi ga-anyakwa isi nʼime ya.