< Zaburi 57 >
1 Kwa mwimbishaji. Mtindo wa “Usiharibu!” Utenzi wa Daudi. Baada ya kumponyoka Sauli pangoni. Unihurumie, Ee Mungu, unihurumie, kwa maana nafsi yangu inakukimbilia. Chini ya uvuli wa mbawa zako nitakimbilia mpaka maafa yapite.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala” Devid. Abụ miktam. Mgbe ọ gbapụrụ ga biri nʼime ọgba nkume nʼihi Sọl. Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba. Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa.
2 Namlilia Mungu Aliye Juu Sana, Mungu atimizaye makusudi yake kwangu.
Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu, Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa.
3 Hutumana kutoka mbinguni na kuniokoa, akiwakemea wale wanaonifuatilia vikali; Mungu huutuma upendo wake na uaminifu wake.
Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; (Sela) Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya.
4 Niko katikati ya simba, nimelala katikati ya wanyama wenye njaa kuu: watu ambao meno yao ni mikuki na mishale, ambao ndimi zao ni panga kali.
Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm; amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa, ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe, ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha.
5 Ee Mungu, utukuzwe juu ya mbingu, utukufu wako na uenee duniani kote.
O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
6 Waliitegea miguu yangu nyavu, nikainamishwa chini na dhiki. Wamechimba shimo katika njia yangu, lakini wametumbukia humo wao wenyewe.
Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ, ihe mgbu nyịturu m. Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe, ma ha onwe ha adabala nʼime ya. (Sela)
7 Ee Mungu, moyo wangu ni thabiti; nitaimba na kusifu kwa moyo wangu wote.
Obi m dị njikere, o Chineke, obi m dị njikere sikwaa ike; aga m abụ abụ, kụkwaa egwu.
8 Amka, nafsi yangu! Amka, kinubi na zeze! Nitayaamsha mapambazuko.
Teta nʼụra mkpụrụobi m! Teta, ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ.
9 Nitakusifu wewe, Ee Bwana, katikati ya mataifa; nitaimba habari zako, katikati ya jamaa za watu.
O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.
10 Kwa maana upendo wako ni mkuu, waenea hadi mbinguni, uaminifu wako unazifikia anga.
Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.
11 Ee Mungu, utukuzwe juu mbinguni, utukufu wako na uwe duniani pote.
O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.