< Zaburi 43 >
1 Ee Mungu unihukumu, nitetee dhidi ya taifa lisilomcha Mungu, niokoe na watu wadanganyifu na waovu.
O Chineke, kpepụta m, kpechitere m ikpe m nʼebe mba na-amaghị Chineke nọ; gbapụta m site nʼaka ndị ajọ omume na ndị aghụghọ.
2 Wewe ni Mungu ngome yangu. Kwa nini umenikataa? Kwa nini niendelee kuomboleza, nikiwa nimeonewa na adui?
Ị bụ Chineke, ebe m e wusiri ike. Gịnị mere i ji jụ m? Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ, nʼihi mmegbu nke onye iro?
3 Tuma hima nuru yako na kweli yako na viniongoze; vinilete mpaka mlima wako mtakatifu, mpaka mahali unapoishi.
Zipụ ìhè gị na eziokwu gị, ka ha duo m; ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị, bụ ebe i bi.
4 Ndipo nitakwenda madhabahuni pa Mungu, kwa Mungu, furaha yangu na shangwe yangu. Nitakusifu kwa kinubi, Ee Mungu, Mungu wangu.
Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke, gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m. Aga m eji ụbọ akwara too gị, O Chineke, bụ Chineke m.
5 Ee nafsi yangu, kwa nini unasononeka? Kwa nini unafadhaika hivyo ndani yangu? Weka tumaini lako kwa Mungu, kwa sababu bado nitamsifu Mwokozi wangu na Mungu wangu.
O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ, onye Nzọpụta m na Chineke m.