< Zaburi 34 >
1 Zaburi ya Daudi, alipojifanya mwendawazimu mbele ya Abimeleki, ambaye alimfukuza, naye akaondoka. Nitamtukuza Bwana nyakati zote, sifa zake zitakuwa midomoni mwangu siku zote.
Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m.
2 Nafsi yangu itajisifu katika Bwana, walioonewa watasikia na wafurahi.
Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ.
3 Mtukuzeni Bwana pamoja nami, naam, na tulitukuze jina lake pamoja.
Soro m too Onyenwe anyị; ka anyị bulie aha ya elu.
4 Nilimtafuta Bwana naye akanijibu, akaniokoa kwenye hofu zangu zote.
Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile.
5 Wale wamtazamao hutiwa nuru, nyuso zao hazifunikwi na aibu kamwe.
Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha.
6 Maskini huyu alimwita Bwana, naye akamsikia, akamwokoa katika taabu zake zote.
Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile.
7 Malaika wa Bwana hufanya kituo akiwazunguka wale wamchao, naye huwaokoa.
Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha.
8 Onjeni mwone kwamba Bwana ni mwema, heri mtu yule anayemkimbilia.
Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.
9 Mcheni Bwana enyi watakatifu wake, kwa maana wale wamchao hawapungukiwi na chochote.
Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya, nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya.
10 Wana simba wenye nguvu hutindikiwa na kuona njaa, bali wale wamtafutao Bwana hawatakosa kitu chochote kilicho chema.
Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị.
11 Njooni, watoto wangu, mnisikilize, nitawafundisha kumcha Bwana.
Ụmụ m, bịanụ gee m ntị; aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ.
12 Yeyote kati yenu anayependa uzima na kutamani kuziona siku nyingi njema,
Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya, ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,
13 basi auzuie ulimi wake na mabaya, na midomo yake kutokana na kusema uongo.
chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ, chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha.
14 Aache uovu, atende mema, aitafute amani na kuifuatilia.
Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe, chọọ udo ma gbasookwa ya.
15 Macho ya Bwana huwaelekea wenye haki, na masikio yake yako makini kusikiliza kilio chao.
Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha;
16 Uso wa Bwana uko kinyume na watendao maovu, ili kufuta kumbukumbu lao duniani.
ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa.
17 Wenye haki hulia, naye Bwana huwasikia, huwaokoa katika taabu zao zote.
Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.
18 Bwana yu karibu na waliovunjika moyo, na huwaokoa waliopondeka roho.
Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.
19 Mwenye haki ana mateso mengi, lakini Bwana humwokoa nayo yote,
Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.
20 huhifadhi mifupa yake yote, hata mmoja hautavunjika.
Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie.
21 Ubaya utamuua mtu mwovu, nao adui za mwenye haki watahukumiwa.
Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ; ndị na-akpọ onye ezi omume asị ka a ga-ama ikpe ọnwụ.
22 Bwana huwakomboa watumishi wake, yeyote anayemkimbilia yeye hatahukumiwa kamwe.
Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya; ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.