< Zaburi 3 >
1 Zaburi ya Daudi. Alipomkimbia mwanawe Absalomu. Ee Bwana, tazama adui zangu walivyo wengi! Ni wengi kiasi gani wanaoinuka dhidi yangu!
Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ. O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.
2 Wengi wanasema juu yangu, “Mungu hatamwokoa.”
Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị, “Chineke agaghị azọpụta ya.” (Sela)
3 Lakini wewe, Ee Bwana, ni ngao pande zote; umeniwekea utukufu na kuinua kichwa changu.
Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m; I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.
4 Ninamlilia Bwana kwa sauti kuu, naye ananijibu kutoka mlima wake mtakatifu.
Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. (Sela)
5 Ninajilaza na kupata usingizi; naamka tena, kwa maana Bwana hunitegemeza.
Edinara m ala, hie ụra, ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.
6 Sitaogopa makumi elfu ya adui, wanaojipanga dhidi yangu kila upande.
A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu, agaghị m atụ egwu ọbụla.
7 Ee Bwana, amka! Niokoe, Ee Mungu wangu! Wapige adui zangu wote kwenye taya, vunja meno ya waovu.
Bilie Onyenwe anyị! Zọpụta m Chineke m! Tie ndị iro m niile aka nʼagba; tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ.
8 Kwa maana wokovu watoka kwa Bwana. Baraka yako na iwe juu ya watu wako.
Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa. Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. (Sela)