< Zaburi 107 >

1 Mshukuruni Bwana, kwa kuwa yeye ni mwema, upendo wake wadumu milele.
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
2 Waliokombolewa wa Bwana na waseme hivi, wale aliowaokoa kutoka mkono wa adui,
Ka ndị niile Onyenwe anyị gbapụtara kwuo otu a, ndị niile ọ gbapụtara site nʼaka onye kpọrọ ha asị,
3 wale aliowakusanya kutoka nchi mbalimbali, kutoka mashariki na magharibi, kutoka kaskazini na kusini.
ndị ọ kpọlatara site nʼala niile dị iche iche, site nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, site nʼugwu na ndịda.
4 Baadhi yao walitangatanga jangwani, hawakuona njia ya kuwafikisha mji ambao wangeweza kuishi.
Ụfọdụ wagharịrị nʼọzara, ala nke tọgbọrọ nʼefu, ha enweghị ike ịchọta ụzọ nke ga-eduba ha nʼobodo ebe ha ga-ebi.
5 Walikuwa na njaa na kiu, nafsi zao zikadhoofika.
Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ, olileanya gwụrụ ha nʼobi.
6 Ndipo walipomlilia Bwana katika shida yao, naye akawaokoa kutoka taabu yao.
Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị, nʼime nsogbu ha, ọ napụtakwara ha site na mkpagbu ha niile.
7 Akawaongoza kwa njia iliyo sawa hadi mji ambao wangeweza kuishi.
O duuru ha nʼụzọ ziri ezi baa nʼobodo ha ga-ebi.
8 Basi na wamshukuru Bwana kwa upendo wake usiokoma, na kwa matendo yake ya ajabu kwa wanadamu,
Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,
9 kwa maana yeye humtosheleza mwenye kiu, na kumshibisha mwenye njaa kwa vitu vyema.
nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ meekwa ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ṅụjuo afọ.
10 Wengine walikaa gizani na katika huzuni kuu, wafungwa wakiteseka katika minyororo,
Ụfọdụ nọdụrụ ala nʼọchịchịrị na nʼọnọdụ oke ihe mwute nke obi, ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ na-ata ahụhụ ndị e ji mkpọrọ igwe kee ha agbụ,
11 kwa sababu walikuwa wameasi dhidi ya maneno ya Mungu na kudharau shauri la Aliye Juu Sana.
nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke ma lelikwaa ndụmọdụ niile nke Onye kachasị ihe niile elu.
12 Aliwatumikisha kwa kazi ngumu; walijikwaa na hapakuwepo yeyote wa kuwasaidia.
Nʼihi ya, Chineke mere ka ha hụjuo anya site nʼịdọgbu onwe ha nʼọrụ, ha sụrụ ngọngọ daa, ma ọ dịghị onye ọbụla nyeere ha aka ibilite ọtọ.
13 Ndipo walipomlilia Bwana katika shida yao, naye akawaokoa kutoka taabu yao.
Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha, ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ha niile.
14 Akawatoa katika giza na huzuni kuu na akavunja minyororo yao.
O mere ka ha site nʼọchịchịrị na oke ihe mwute nke obi pụta. O tijikwara agbụ ha niile.
15 Basi na wamshukuru Bwana kwa upendo wake usiokoma, na kwa matendo yake ya ajabu kwa wanadamu,
Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,
16 kwa kuwa yeye huvunja malango ya shaba na kukata mapingo ya chuma.
nʼihi na o tijisiela ọnụ ụzọ ama niile e ji bronz kpụọ gbujiekwa mkpọrọ ịkpọchi ụzọ niile e ji igwe kpụọ.
17 Wengine wakawa wapumbavu kutokana na uasi wao, wakapata mateso kwa sababu ya uovu wao.
Ụfọdụ ghọrọ ndị nzuzu site na nnupu isi taakwa ahụhụ nʼihi njehie ha niile.
18 Wakachukia kabisa vyakula vyote, wakakaribia malango ya mauti.
Ihe oriri ọbụla ghọọrọ ha ihe rụrụ arụ ha bịakwara ọnụ ụzọ ama ọnwụ nso.
19 Ndipo walipomlilia Bwana katika shida yao, naye akawaokoa kutoka taabu yao.
Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ahụ niile.
20 Akalituma neno lake na kuwaponya, akawaokoa kutoka maangamizo yao.
O zipụrụ okwu ọnụ ya, gwọọ ha; ọ napụtara ha site nʼili.
21 Basi na wamshukuru Bwana kwa upendo wake usiokoma, na kwa matendo yake ya ajabu kwa wanadamu.
Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.
22 Na watoe dhabihu za kushukuru, na wasimulie matendo yake kwa nyimbo za furaha.
Ka ha chụọ aja ekele nye ya jirikwa ọtụtụ abụ ọṅụ kwupụta banyere ọrụ ya niile.
23 Wengine walisafiri baharini kwa meli, walikuwa wafanyabiashara kwenye maji makuu.
Ụfọdụ ji ụgbọ mmiri na-ejegharị nʼelu oke osimiri; ha bụ ndị na-azụ ahịa ma na-ebugharịkwa ngwa ahịa nʼelu oke osimiri.
24 Waliziona kazi za Bwana, matendo yake ya ajabu kilindini.
Ha hụrụ ọrụ niile nke Onyenwe anyị, ọtụtụ ọrụ ebube ya nʼogbu mmiri.
25 Kwa maana alisema na kuamsha tufani iliyoinua mawimbi juu.
Nʼihi na o kwuru okwu mere ka oke ifufe kuo nke buliri ebili mmiri elu.
26 Yakainuka juu mbinguni, yakashuka chini hadi vilindini, katika hatari hii ujasiri wao uliyeyuka.
Ha bụ ndị e buliri nnọọ ezigbo elu, ma budatakwa ruo ogbu mmiri niile; nʼọnọdụ ihe egwu ahụ, obi lọrọ ha mmiri.
27 Walipepesuka na kuyumbayumba kama walevi, ujanja wao ukafikia ukomo.
Ha na-adagharị, na-aṅagharịkwa dịka ndị ṅụbigara mmanya oke. Mmụta ha banyere ịnya ụgbọ mmiri adịghị enyekwara ha aka nʼoge dị otu a.
28 Ndipo walipomlilia Bwana katika shida yao, naye akawatoa kwenye taabu yao.
Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha, o mere ka ha pụta na mkpagbu ahụ niile.
29 Akatuliza dhoruba kwa mnongʼono, mawimbi ya bahari yakatulia.
O mere ka oke ifufe dere duu; o mekwara ka ebili mmiri nke oke osimiri dajụọ.
30 Walifurahi ilipokuwa shwari, naye akawaongoza hadi bandari waliyoitamani.
Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọ dajụrụ, o duuru ha ruo ebe ha na-aga nʼudo.
31 Basi na wamshukuru Bwana kwa upendo wake usiokoma, na kwa matendo yake ya ajabu kwa wanadamu.
Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.
32 Na wamtukuze yeye katika kusanyiko la watu, na wamsifu katika baraza la wazee.
Ka ha bulie ya elu nʼetiti ọgbakọ ukwu ụmụ mmadụ ma tookwa ya na nzukọ ndị okenye.
33 Yeye aligeuza mito kuwa jangwa, chemchemi za maji zitiririkazo kuwa ardhi yenye kiu,
Ọ na-eme ka iyi ghọọ ọzara; na-emekwa ka ebe mmiri si asọpụta ghọọ ala kpọrọ nkụ.
34 nchi izaayo ikawa ya chumvi isiyofaa, kwa sababu ya uovu wa wale walioishi humo.
Ọ na-eme ka ala na-amị mkpụrụ hiri nne ghọọ ọzara, nʼihi ajọ omume nke ndị bi nʼime ya.
35 Aligeuza jangwa likawa madimbwi ya maji, nayo ardhi kame kuwa chemchemi za maji zitiririkazo;
Ọ na-eme ka ọzara ghọọ ala nke ọdọ mmiri jupụtara mee ka ala akọrọ ghọọ isi iyi nke na-asọ asọ;
36 aliwaleta wenye njaa wakaishi humo, nao wakajenga mji wangeweza kuishi.
ebe ahụ ka ọ kpọbatara ndị agụụ na-agụ ka ha biri, ebe ahụ ka ha wuru obodo ebe ha ga-ebi.
37 Walilima mashamba na kupanda mizabibu, nayo ikazaa matunda mengi,
Ha ghara mkpụrụ nʼubi ha dị iche iche, kụọkwa ọtụtụ ubi vaịnị ndị mịrị mkpụrụ dị ukwuu;
38 Mungu aliwabariki, hesabu yao ikaongezeka sana, wala hakuruhusu mifugo yao kupungua.
ọ gọziri ha, ọnụọgụgụ ha bakwara ụba, o mekwara ka anụ ụlọ ha mụbaa.
39 Kisha hesabu yao ilipungua, na walinyenyekeshwa kwa kuonewa, maafa na huzuni.
Mgbe ahụ, ọnụọgụgụ ha adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, ha bụ ndị e ji mkpagbu na ihe ndakwasị na iru ụjụ wedata nʼala;
40 Yeye ambaye huwamwagia dharau wakuu, aliwafanya watangetange nyikani isiyo na njia.
onye ahụ na-eleda ndị na-achị achị anya mere ka ha wagharịa nʼọzara, ebe ụzọ na-adịghị.
41 Lakini yeye aliwainua wahitaji katika taabu zao, na kuongeza jamaa zao kama makundi ya kondoo.
Ma ọ na-anapụta ndị mkpa na-akpa site na nhụju anya ha, mee ka ezinaụlọ ha mụbaa dịka igwe anụ ụlọ.
42 Wanyofu wataona na kufurahi, lakini waovu wote watafunga vinywa vyao.
Ndị ezi omume na-ahụ ya na-aṅụrị ọṅụ, ma ndị ajọ omume na-emechi ọnụ ha nọọ duu.
43 Yeyote aliye na hekima, ayasikie mambo haya, na atafakari upendo mkuu wa Bwana.
Onye ọbụla maara ihe ga-echezi echiche banyere ihe ndị a, ma tuleekwa ọrụ ịhụnanya Onyenwe anyị nke dị ukwuu.

< Zaburi 107 >