< Mithali 7 >
1 Mwanangu, shika maneno yangu na kuzihifadhi amri zangu ndani yako.
Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya, dokwaa iwu m niile nʼime obi gị.
2 Shika amri zangu nawe utaishi; linda mafundisho yangu kama mboni ya jicho lako.
Debe iwu m ka ị dị ndụ, chee ozizi m nche dịka ọ bụ mkpụrụ anya gị.
3 Yafunge katika vidole vyako; yaandike katika kibao cha moyo wako.
Kee ha na mkpịsịaka gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.
4 Mwambie hekima, “Wewe ni dada yangu,” uite ufahamu jamaa yako;
Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya; hụkwa inwe nghọta nʼanya dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne gị.
5 watakuepusha na mwanamke mzinzi, kutokana na mwanamke mpotovu na maneno yake ya kubembeleza.
Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko, ka ị gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ire ụtọ ya.
6 Kwenye dirisha la nyumba yangu nilitazama nje kupitia upenyo kwenye mwimo wa dirisha.
Nʼihi na otu ụbọchị, esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya,
7 Niliona miongoni mwa wajinga, nikagundua miongoni mwa wanaume vijana, kijana asiye na akili.
hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche, ahụtara m otu nwokorobịa nʼetiti ha, onye amamihe kọrọ,
8 Alikuwa akishuka njiani karibu na pembe ya kwake, akielekea kwenye nyumba ya huyo mwanamke
ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọ nʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme,
9 wakati wa machweo, jua likipungua nuru yake, giza la usiku lilipokuwa likiingia.
nʼoge anyasị, dịka chi na-eji, mgbe ọchịchịrị na-agbachi.
10 Ndipo huyo mwanamke akatoka kumlaki, hali amevaa kama kahaba akiwa na nia ya udanganyifu.
Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya. O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya.
11 (Ni mwanamke mwenye makelele na mkaidi, miguu yake haitulii nyumbani;
(Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla. Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya.
12 mara kwenye barabara za mji, mara kwenye viwanja vikubwa, kwenye kila pembe huvizia.)
Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama; na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.)
13 Huyo mwanamke alimkumbatia kijana na kumbusu, na kwa uso usio na haya akamwambia:
O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ, were ihu nke ihere na-adịghị, sị:
14 “Nina sadaka za amani nyumbani; leo nimetimiza nadhiri zangu.
“Emezuru m nkwa niile m kwere taa, enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m,
15 Kwa hiyo nimetoka nje kukulaki; nimekutafuta na nimekupata!
Ọ bụ gị ka m na-achọkwute, lee gị ka ị na-abịa.
16 Nimetandika kitanda changu kwa kitani za rangi kutoka Misri.
Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m, bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa.
17 Nimetia manukato kitanda changu kwa manemane, udi na mdalasini.
Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn nʼelu nʼihe ndina m.
18 Njoo, tuzame katika mapenzi mpaka asubuhi; tujifurahishe wenyewe kwa mapenzi!
Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi.
19 Mume wangu hayupo nyumbani; amekwenda safari ya mbali.
Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya.
20 Amechukua mkoba uliojazwa fedha na hatakuwepo nyumbani karibuni.”
O ji akpa ego juru gaa njem, abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.”
21 Kwa maneno laini yule mwanamke akampotosha; alimshawishi kwa maneno yake laini.
Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya. O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ.
22 Mara huyo kijana alimfuata yule mwanamke kama fahali aendaye machinjoni, kama kulungu aingiaye kwenye kitanzi,
O sooro nwanyị ahụ dịka ehi a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya, dịka ele nke na-aba nʼọnya,
23 mpaka mshale umchome ini lake, kama ndege anayenaswa kwenye mtego, bila kujua itamgharimu maisha yake.
nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi. Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya.
24 Sasa basi wanangu, nisikilizeni; sikilizeni kwa makini nisemalo.
Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị, kama meekwanụ ihe m na-ekwu.
25 Usiruhusu moyo wako ugeukie njia za huyo mwanamke, wala usitangetange katika mapito yake.
Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị; ejela nwanyị dị otu a nso; gbaara ya ọsọ, ka ọ ghara ịnwa gị nwetakwa gị.
26 Aliowaangusha ni wengi; aliowachinja ni kundi kubwa.
Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ, ọtụtụ mmadụ amaala nʼọnya ya.
27 Nyumba yake ni njia kuu iendayo kaburini, ielekeayo chini kwenye vyumba vya mauti. (Sheol )
Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili, nke na-edubakwa nʼala ọnwụ. (Sheol )