< Mithali 5 >
1 Mwanangu, sikiliza kwa makini hekima yangu, sikiliza vizuri maneno yangu ya busara,
Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m, gee ntị nʼokwu nghọta m ndị a.
2 ili uweze kutunza busara na midomo yako ihifadhi maarifa.
Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche, ka egbugbere ọnụ gị na-echebekwa ihe ọmụma.
3 Kwa maana midomo ya mwanamke kahaba hudondoza asali, na maneno ya kinywa chake ni laini kuliko mafuta;
Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ, okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.
4 lakini mwisho wake ni mchungu kama nyongo, mkali kama upanga ukatao kuwili.
Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ.
5 Miguu yake hushuka kuelekea kwenye kifo; hatua zake huelekea moja kwa moja kaburini. (Sheol )
Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ, nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ. (Sheol )
6 Yeye hafikiri juu ya njia ya uzima; njia zake zimepotoka, lakini yeye hajui.
Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ; ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a.
7 Sasa basi wanangu, nisikilizeni; msiache ninalowaambia.
Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị, unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu.
8 Njia zenu ziwe mbali naye, msiende karibu na mlango wa nyumba yake,
Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ! Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,
9 usije ukatoa nguvu zako nzuri kwa wengine na miaka yako kwa aliye mkatili,
ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ, maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.
10 wageni wasije wakasherehekea utajiri wako na jitihada yako ikatajirisha nyumba ya mwanaume mwingine.
Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị, ka ihe niile ị dọgburu onwe gị nʼọrụ ịkpata gharakwa imejupụta ụlọ onye ọzọ.
11 Mwishoni mwa maisha yako utalia kwa uchungu, wakati nyama na mwili wako vimechakaa.
Ka ị gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ mgbe ọrịa ga-eripịa ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị.
12 Utasema, “Tazama jinsi gani nilivyochukia adhabu! Tazama jinsi moyo wangu ulivyodharau maonyo!
Mgbe ị ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị! “Leekwa ka obi m si lelịa iba mba anya!
13 Sikuwatii walimu wangu wala kuwasikiliza wakufunzi wangu.
Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m maọbụ nabata ndụmọdụ nke ndị ndụmọdụ m.
14 Nimefika ukingoni mwa maangamizi kabisa katikati ya kusanyiko lote.”
Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi nʼihu ọha mmadụ niile.”
15 Kunywa maji kutoka kwenye kisima chako mwenyewe, maji yanayotiririka kutoka kwenye kisima chako mwenyewe.
Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị; mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị.
16 Je, chemchemi zako zifurike katika barabara za mji na vijito vyako vya maji viwanjani?
Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ, ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama?
17 Na viwe vyako mwenyewe, kamwe visishirikishwe wageni.
Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị, nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya.
18 Chemchemi yako na ibarikiwe na umfurahie mke wa ujana wako.
Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị; ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị.
19 Kulungu jike apendaye, kulungu mzuri: matiti yake na yakutosheleze siku zote, nawe utekwe daima na upendo wake.
Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma, ka ara dị ya nʼobi zuore gị, ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.
20 Kwa nini mwanangu, utekwe na mwanamke kahaba? Kwa nini ukumbatie kifua cha mke wa mwanaume mwingine?
Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko? Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi?
21 Kwa maana njia za mtu ni wazi kabisa mbele za Bwana, naye huyapima mapito yake yote.
Nʼihi na Onyenwe anyị na-ele gị anya, ihe niile ị na-eme ka ọ na-ahụ.
22 Matendo mabaya ya mtu mwovu humnasa yeye mwenyewe; kamba za dhambi yake humkamata kwa nguvu.
Onye na-emebi iwu na-esite na mmehie ya laa onwe ya nʼiyi; mmehie ndị a bụ ụdọ nke na-ejide ya.
23 Atakufa kwa kukosa nidhamu, akipotoshwa kwa upumbavu wake mwenyewe.
Ọ ga-anwụ nʼihi na ọ nabataghị ịdọ aka na ntị; ọ bụkwa nzuzu ya dufuru ya.