< Mithali 4 >

1 Sikilizeni wanangu, mafundisho ya baba yenu; sikilizeni kwa makini na mpate ufahamu.
Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu, lezienụ anya ka unu nwee nghọta.
2 Ninawapa mafundisho ya maana, kwa hiyo msiyaache mafundisho yangu.
Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu; ya mere, unu ahapụkwala iwu m.
3 Nilipokuwa mvulana mdogo katika nyumba ya baba yangu, ningali mchanga na mtoto pekee kwa mama yangu,
Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m, mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji,
4 baba alinifundisha akisema, “Yashike maneno yangu yote kwa moyo wako wote; yashike maagizo yangu na wewe utaishi.
ọ ziri m ihe, sịkwa m, “Ka obi gị jidesie okwu m niile ike, debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.
5 Pata hekima, pata ufahamu; usiyasahau maneno yangu wala usiyaache.
Nweta amamihe, nwetakwa nghọta, echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị.
6 Usimwache hekima naye atakuweka salama; mpende, naye atakulinda.
Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị, hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị.
7 Hekima ni bora kuliko vitu vyote; kwa hiyo jipe hekima. Hata ikikugharimu vyote ulivyo navyo, pata ufahamu.
Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe, ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta.
8 Mstahi, naye atakukweza; mkumbatie, naye atakuheshimu.
Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu. Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ.
9 Atakuvika shada la neema kichwani mwako na kukupa taji ya utukufu.”
Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma nyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.”
10 Sikiliza mwanangu, kubali ninachokuambia, nayo miaka ya maisha yako itakuwa mingi.
Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị; ị ga-enwekwa ndụ ogologo.
11 Ninakuongoza katika njia ya hekima na kukuongoza katika mapito yaliyonyooka.
M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe, duokwa gị nʼụzọ ziri ezi.
12 Utembeapo, hatua zako hazitazuiliwa; ukimbiapo, hutajikwaa.
Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị, ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ.
13 Mkamate sana elimu, usimwache aende zake; mshike, maana yeye ni uzima wako.
Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha, nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke.
14 Usiuweke mguu wako katika njia ya waovu wala usitembee katika njia ya watu wabaya.
Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha.
15 Epukana nayo, usisafiri katika njia hiyo; achana nayo, na uelekee njia yako.
Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha; chepu ihu gị nʼụzọ ahụ,
16 Kwa kuwa hawawezi kulala mpaka watende uovu; wanashindwa hata kusinzia mpaka wamwangushe mtu.
nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ. Ha anaghị ezu ike tutu ha emee ka otu onye maa nʼọnya.
17 Wanakula mkate wa uovu, na kunywa mvinyo wa jeuri.
Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ nke ọgbaaghara.
18 Njia ya wenye haki ni kama nuru ya kwanza ya mapambazuko, ambayo hungʼaa zaidi na zaidi mpaka mchana mkamilifu.
Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ, nke na-enwuwakwa dịka ìhè nʼetiti ehihie ụbọchị.
19 Lakini njia ya waovu ni kama giza nene; hawajui kinachowafanya wajikwae.
Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị, ha anaghị ama ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.
20 Mwanangu, yasikilize kwa makini yale ninayokuambia; sikiliza kwa makini maneno yangu.
Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu. Gee ntị nke ọma.
21 Usiruhusu yaondoke machoni pako, yahifadhi ndani ya moyo wako;
Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile; ka ha bamiekwa nʼime obi gị,
22 kwa sababu ni uzima kwa wale wanaoyapata na afya kwa mwili wote wa mwanadamu.
nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha, bụrụkwa ahụ ike nye mmadụ.
23 Zaidi ya yote, linda moyo wako, kuliko yote uyalindayo, maana ndiko zitokako chemchemi za uzima.
Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya, nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.
24 Epusha kinywa chako na ukaidi; weka mazungumzo machafu mbali na midomo yako.
Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta; kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị.
25 Macho yako na yatazame mbele, kaza macho yako moja kwa moja mbele yako.
Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu; atụgharịkwala isi gị ile ihe ọbụla.
26 Sawazisha mapito ya miguu yako na njia zako zote ziwe zimethibitika.
Leruo ije ụkwụ gị anya, doziekwa ụzọ gị niile ka ọ guzozie.
27 Usigeuke kulia wala kushoto; epusha mguu wako na ubaya.
Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe; si nʼihe ọjọọ wezuga ụkwụ gị.

< Mithali 4 >