< Mithali 30 >

1 Misemo ya Aguri mwana wa Yake, usia: Huyu mtu alimwambia Ithieli, naam, kwa Ithieli na kwa Ukali:
Ndị a bụ okwu Agọ, nwa Jake, onye Masa, Okwu si nʼọnụ nwoke a zigaara Itiel na Ukal: “Ike agwụla m, Chineke ma a pụrụ imeri.
2 “Mimi ni mjinga kuliko wanadamu wote; sina ufahamu wa kibinadamu.
Nʼezie, abụ m onye nzuzu karịa mmadụ ọbụla; Enweghị m ụdị nghọta ahụ mmadụ na-enwe.
3 Sijajifunza hekima, wala sina maarifa ya kumjua yeye Aliye Mtakatifu.
Amụtabeghị m amamihe, maọbụ ruo ịmata maka Onye Nsọ ahụ.
4 Ni nani ameshapanda mbinguni na kushuka? Ni nani ameshakusanya upepo kwenye vitanga vya mikono yake? Ni nani ameshafungia maji kwenye nguo yake? Ni nani ameimarisha miisho yote ya dunia? Jina lake ni nani, na mwanawe anaitwa nani? Niambie kama unajua!
Olee onye na-arịgo nʼeluigwe na-arịdatakwa? Onye ka ọ bụ, bụ onye jikọtara ifufe nʼaka ya? Onye kwa weere akwa kechikọtaa osimiri niile nʼaka ya? Onye hiwere oke nsọtụ ụwa niile? Onye ka ọ bụ? Ọ bụrụ na ị ma onye ọ bụ, gịnị bụ aha ya? Gịnịkwa bụ aha nwa ya?
5 “Kila neno la Mungu ni kamilifu; yeye ni ngao kwa wale wanaomkimbilia.
“Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha, Ọ bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
6 Usiongeze kwenye maneno yake, ama atakukemea na kukuthibitisha kuwa mwongo.
Atụkwasịla ihe ọbụla nʼokwu ya, ka ọ ghara ịbara gị mba, ka ị gharakwa ịghọ onye ụgha.
7 “Ninakuomba vitu viwili, Ee Bwana; usininyime kabla sijafa:
“O Onyenwe anyị, naanị ihe abụọ ka m na-arịọ gị tupu m nwụọ; ajụkwala imere m ha:
8 Uutenge mbali nami udanganyifu na uongo; usinipe umaskini wala utajiri, bali unipe chakula cha kunitosha kila siku.
Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ. Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya, kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile.
9 Nisije nikawa na vingi vya kuzidi nikakukana na kusema, ‘Bwana ni nani?’ Au nisije nikawa maskini nikaiba, nami nikaliaibisha jina la Mungu wangu.
Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke, ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’ Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi, site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere.
10 “Usimchongee mtumishi kwa bwana wake, asije akakulaani, ukapatilizwa kwalo.
“Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu, ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị.
11 “Wako watu wale ambao huwalaani baba zao na wala hawawabariki mama zao;
“Ọ dị ndị na-akọcha nna ha, ha adịghị agọzikwa nne ha;
12 wale ambao ni safi machoni pao wenyewe kumbe hawakuoshwa uchafu wao;
Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru.
13 wale ambao daima macho yao ni ya kiburi, ambao kutazama kwao ni kwa dharau;
Ọ dị ndị anya ha dị nʼelu, ndị ile anya ha jupụtara na nlelị.
14 wale ambao meno yao ni panga na ambao mataya yao yamewekwa visu kuwaangamiza maskini katika nchi, na wahitaji kutoka miongoni mwa wanadamu.
Ndị eze ha niile bụ mma agha ịkịrị eze ha bụkwa mma maka irichapụ ndị ogbenye site nʼụwa na ndị nọ nʼụkọ site nʼetiti mmadụ.
15 “Mruba anao binti wawili waliao, ‘Nipe! Nipe!’ “Kuna vitu vitatu visivyotosheka kamwe, naam, viko vinne visivyosema, ‘Yatosha!’:
“Etu nwere ụmụ nwanyị abụọ ndị na-eti, ‘Nye, nye.’ “Ọ dị ụzọ ihe atọ nke afọ na-adịghị eju. E, anọ dị na-adịghị asị, ‘O zuola.’
16 Ni kaburi, tumbo lisilozaa, nchi isiyoshiba maji kamwe, na moto, usiosema kamwe, ‘Yatosha!’ (Sheol h7585)
Ala ili, akpanwa nwanyị na-adịghị atụ ime, ala nke mmiri na-adịghị eju afọ, na ọkụ nke na-adịghị asị, ‘O zuola.’ (Sheol h7585)
17 “Jicho lile limdhihakilo baba, lile linalodharau kumtii mama, litangʼolewa na kunguru wa bondeni, litaliwa na tai.
“Onye ahụ na-akwa nna ya emo, nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị, ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya, udele ga-erikwa anụ ahụ ya.
18 “Kuna vitu vitatu vinavyonishangaza sana, naam, vinne nisivyovielewa:
“Ọ dị ihe atọ na-agbagwoju m anya, apụghị m ịghọta ha; mbaa, ha dị anọ!
19 Ni mwendo wa tai katika anga, mwendo wa nyoka juu ya mwamba, mwendo wa meli katika maji makuu ya bahari, nao mwendo wa mtu pamoja na msichana.
Otu ugo si efegharị na mbara eluigwe; otu agwọ si akpụ nʼelu nkume, otu ụgbọ mmiri si achọta ụzọ ya nʼoke osimiri; na otu ịhụnanya si eto nʼetiti nwoke na nwaagbọghọ.
20 “Huu ndio mwendo wa mwanamke mzinzi, hula akapangusa kinywa chake na kusema, ‘Sikufanya chochote kibaya.’
“Nke bụ ụzọ nwanyị na-akwa iko, Ọ na-eri ma hichaa ọnụ ya, na-asị, ‘E meghị m ajọ ihe ọbụla.’
21 “Kwa mambo matatu nchi hutetemeka, naam, kwa mambo manne haiwezi kuvumilia:
“Ọ dị ihe atọ na-eme ka ụwa maa jijiji, nʼokpuru ihe anọ nke ọ na-apụghị ịnagide,
22 Mtumwa awapo mfalme, mpumbavu ashibapo chakula,
Ohu ghọrọ eze, onye nzuzu ihe na-agara nke ọma,
23 mwanamke asiyependwa aolewapo, naye mtumishi wa kike achukuapo nafasi ya bibi yake.
nwanyị obi ilu mesịrị lụta dị, na odibo nwanyị ghọrọ nwunye nna ya ukwu.
24 “Vitu vinne duniani vilivyo vidogo, lakini vina akili nyingi sana:
“Ihe anọ dị nke dị nta nʼelu ụwa, ma ha maa ihe nke ukwuu.
25 Mchwa ni viumbe wenye nguvu ndogo, hata hivyo hujiwekea akiba ya chakula chao wakati wa kiangazi.
Ndanda bụ ndị na-enweghị ume, ma ha na-akpakọta nri ha, dozie nke ha ga-eri nʼoge oyi.
26 Pelele ni viumbe vyenye uwezo mdogo hata hivyo hujitengenezea nyumba zao kwenye miamba.
Ewi nkume bụ ndị na-adịghị ike, ma ha na-echebe onwe ha site nʼibi nʼọgba nkume.
27 Nzige hawana mfalme, hata hivyo huenda pamoja vikosi vikosi.
Igurube enweghị eze, ma ha na-aga nʼigwe nʼahịrị nʼahịrị.
28 Mjusi anaweza kushikwa kwa mkono, hata hivyo huonekana katika majumba ya kifalme.
Ngwere dị mfe iji aka jide ya, ma ị ga-achọta ha ọ bụladị nʼụlọ ndị eze.
29 “Viko vitu vitatu ambavyo vinapendeza katika mwendo wao, naam, vinne ambavyo hutembea kwa mwendo wa madaha:
“Ha dị ihe atọ na-ejegharị nʼụwa nʼọnọdụ ịdị oke ebube, mbaa, ha dị anọ:
30 simba, mwenye nguvu miongoni mwa wanyama, asiyerudi nyuma kwa chochote;
Ọdụm, eze ụmụ anụmanụ. Ọ naghị atụ onye ọbụla egwu,
31 jogoo atembeaye kwa maringo, pia beberu, naye mfalme pamoja na jeshi lake lililomzunguka.
na oke ọkụkọ na-ejegharị ejegharị, na mkpi, na eze ndị agha ya gbara gburugburu.
32 “Ikiwa umefanya upumbavu na ukajitukuza mwenyewe, au kama umepanga mabaya, basi funika mdomo wako na mkono wako.
“Ọ bụrụ na i meela ihe nzuzu site nʼifuli onwe gị elu maọbụ zube nzube ọjọọ, anyala isi nʼihi ya, were aka gị kpuchie ọnụ gị nʼihere.
33 Kwa maana kama vile kusukasuka maziwa hutoa siagi, na pia kule kufinya pua hutoa damu, kadhalika kuchochea hasira hutokeza ugomvi.”
A pịaa mmiri ara ehi a na-ewepụta mmanụ ara ehi; iti mmadụ aka nʼimi na-akpata ịgba ọbara, otu a kwa ikpali iwe na-eweta ise okwu.”

< Mithali 30 >