< Mithali 18 >

1 Mtu ajitengaye na wengine hufuata matakwa yake mwenyewe; hupiga vita kila shauri jema.
Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya, na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ.
2 Mpumbavu hafurahii ufahamu, bali hufurahia kutangaza maoni yake mwenyewe.
Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ. Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.
3 Wakati uovu unapokuja, dharau huja pia, pamoja na aibu huja lawama.
Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata, otu a kwa nkọcha na-eweta ihere.
4 Maneno ya kinywa cha mwanadamu ni kina cha maji, bali chemchemi ya hekima ni kijito kinachobubujika.
Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi, ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ.
5 Sio vizuri kumpendelea mtu mwovu, au kumnyima haki asiye na hatia.
Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ, si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.
6 Midomo ya mpumbavu humletea ugomvi na kinywa chake hualika kipigo.
Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu, ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.
7 Kinywa cha mpumbavu ni uharibifu wake na midomo yake ni mtego kwa nafsi yake.
Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu, egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.
8 Maneno ya mchongezi ni kama chakula kitamu; huingia sehemu za ndani sana za mtu.
Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
9 Mtu aliye mlegevu katika kazi yake ni ndugu na yule anayeharibu.
Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye mbibi.
10 Jina la Bwana ni ngome imara, wenye haki huikimbilia na kuwa salama.
Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike, ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
11 Mali ya tajiri ni mji wake wenye ngome, wanaudhania kuwa ukuta usioweza kurukwa.
Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.
12 Kabla ya anguko moyo wa mtu hujaa kiburi, bali unyenyekevu hutangulia heshima.
Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga, ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.
13 Yeye ajibuye kabla ya kusikiliza, huo ni upumbavu wake na aibu yake.
Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị bụ enweghị uche na ihe ihere.
14 Roho ya mtu itastahimili katika ugonjwa bali roho iliyovunjika ni nani awezaye kuistahimili?
Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa, ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?
15 Moyo wa mwenye ufahamu hujipatia maarifa, masikio ya mwenye hekima huyatafuta maarifa.
Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma, nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya.
16 Zawadi humfungulia njia mtoaji, nayo humleta mbele ya wakuu.
Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara, ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu.
17 Yeye aliye wa kwanza kuleta mashtaka huonekana sahihi, hadi mwingine ajitokezapo na kumuuliza maswali.
Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara, tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ.
18 Kupiga kura hukomesha mashindano na kutenganisha wapinzani wakuu wanaopingana.
Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ dị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu.
19 Ndugu aliyechukizwa ni mgumu kuridhika kuliko mji uliozungushiwa ngome, nayo mabishano ni kama malango ya ngome yenye makomeo.
Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa. Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie.
20 Tumbo la mtu litajaa kutokana na tunda la kinywa chake, atashibishwa mavuno yanayotokana na midomo yake.
Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya. Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ.
21 Mauti na uzima viko katika uwezo wa ulimi, nao waupendao watakula matunda yake.
Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka. Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.
22 Apataye mke apata kitu chema naye ajipatia kibali kwa Bwana.
Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe. Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.
23 Mtu maskini huomba kuhurumiwa bali tajiri hujibu kwa ukali.
Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere; ma ọgaranya na-asa okwu ike ike.
24 Mtu mwenye marafiki wengi wanaweza kumharibu, bali yuko rafiki aambatanaye na mtu kwa karibu kuliko ndugu.
Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya, ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.

< Mithali 18 >