< Hesabu 2 >
1 Bwana aliwaambia Mose na Aroni:
Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị ha,
2 “Waisraeli watapiga kambi zao kuzunguka Hema la Kukutania kwa umbali fulani kutoka kwenye hema, kila mwanaume chini ya alama yake pamoja na bendera ya jamaa yake.”
“Ụmụ Izrel ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute, nʼebe dịpụturu adịpụ site nʼụlọ nzute ahụ. Onye ọbụla ga-ama ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ọkọlọtọ ebo ya, ha na ihe ịrịbama nke ụlọ ha.”
3 Kwa upande wa mashariki kuelekea mawio ya jua, kambi ya makundi ya Yuda watapiga kambi chini ya alama yao. Kiongozi wa watu wa Yuda ni Nashoni mwana wa Aminadabu.
Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, usuu ndị agha ebo Juda, ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha ga-abụ Nashọn nwa Aminadab.
4 Kundi lake lina watu 74,600.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ya dị puku iri asaa na anọ, na narị isii
5 Kabila la Isakari watapiga kambi karibu na Yuda. Kiongozi wa watu wa Isakari ni Nethaneli mwana wa Suari.
Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Isaka ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Netanel nwa Zua.
6 Kundi lake lina watu 54,400.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ.
7 Kabila la Zabuloni litafuata. Kiongozi wa watu wa Zabuloni ni Eliabu mwana wa Heloni.
Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Zebụlọn ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Eliab nwa Helọn.
8 Kundi lake lina watu 57,400.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ.
9 Wanaume wote walio katika kambi ya Yuda, kufuatana na makundi yao, ni 186,400. Wao watatangulia kuondoka.
Ọnụọgụgụ ndị niile a gụkọtara ha na Juda nʼọwụwa anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku asatọ na puku isii na narị anọ. Ha ga-ebu ụzọ bulie ije.
10 Kwa upande wa kusini kutakuwa kambi ya makundi ya Reubeni chini ya alama yao. Kiongozi wa watu wa Reubeni ni Elisuri mwana wa Shedeuri.
Nʼakụkụ ndịda ka usuu ndị agha ebo Ruben ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Elizọ nwa Shedeua.
11 Kundi lake lina watu 46,500.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku isii na narị ise.
12 Kabila la Simeoni watapiga kambi karibu na Reubeni. Kiongozi wa watu wa Simeoni ni Shelumieli mwana wa Surishadai.
Nʼakụkụ ha ka ebo Simiọn ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Shelumiel nwa Zurishadai.
13 Kundi lake lina watu 59,300.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ.
14 Kabila la Gadi litafuata. Kiongozi wa watu wa Gadi ni Eliasafu mwana wa Deueli.
Ebo Gad ga-esokwa ha. Onyendu ha bụ Eliasaf nwa Deuel.
15 Kundi lake lina watu 45,650.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise.
16 Wanaume wote walio katika kambi ya Reubeni, kufuatana na makundi yao, ni 151,450. Nao watakuwa nafasi ya pili kuondoka.
Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ruben bikọrọ na ndịda ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na otu, na narị anọ na iri ise dịka usuu ndị agha ha si dị. Ebo atọ a bụ ndị na-eso ebo atọ nke mbụ ahụ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.
17 Kisha Hema la Kukutania na kambi ya Walawi vitakuwa katikati ya kambi zote. Wao watasafiri kwa utaratibu ule ule kama walivyopiga kambi, kila mmoja mahali pake mwenyewe chini ya alama yake.
Ka ụlọ nzute na-azọli ije, ụlọ ikwu ndị Livayị ga-anọ nʼetiti ụlọ ikwu ndị ọzọ. Ha ga-ebili ije nʼusoro dịka ha si maa ụlọ ikwu ha. Ndị ọbụla nʼọnọdụ ha, nʼokpuru ọkọlọtọ nke na-akọwa ndị ha bụ.
18 Upande wa magharibi kutakuwepo na kambi ya makundi ya Efraimu chini ya alama yao. Kiongozi wa watu wa Efraimu ni Elishama mwana wa Amihudi.
Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ka ebo Ifrem ga-ama ụlọ ikwu ha dịka ọkọlọtọ ha si dị. Onyendu ha bụ Elishama nwa Amihud.
19 Kundi lake lina watu 40,500.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ na narị ise.
20 Kabila la Manase litafuata baada ya Efraimu. Kiongozi wa watu wa Manase ni Gamalieli mwana wa Pedasuri.
Ebo Manase ga-amakwa ụlọ ikwu nʼakụkụ ha. Onyendu ha bụ Gamaliel nwa Pedazo.
21 Kundi lake lina watu 32,200.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ.
22 Kabila la Benyamini litafuata baada ya Manase. Kiongozi wa watu wa Benyamini ni Abidani mwana wa Gideoni.
Nʼakụkụ ha ka ebo Benjamin ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Abidan nwa Gidiọn.
23 Kundi lake lina watu 35,400.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku ise na narị anọ.
24 Wanaume wote walio katika kambi ya Efraimu kufuatana na makundi yao ni 108,100. Nao watakuwa nafasi ya tatu kuondoka.
Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ifrem bikọrọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, puku asatọ na narị mmadụ. Ha niile na-esokwa nʼazụ ndị Livayị na ụlọ nzute ahụ. Ndị a bụ ndị na-eso nʼọnọdụ nke atọ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.
25 Upande wa kaskazini kutakuwa na makundi ya kambi ya Dani, chini ya alama yao. Kiongozi wa watu wa Dani ni Ahiezeri mwana wa Amishadai.
Ebo Dan na usuu ndị agha ha ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ elu elu nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai
26 Kundi lake lina watu 62,700.
Ọnụọgụgụ usuu ha dị iri puku isii, puku abụọ na narị asaa.
27 Kabila la Asheri watapiga kambi karibu na Dani. Kiongozi wa watu wa Asheri ni Pagieli mwana wa Okrani.
Nʼakụkụ ha ka ebo Asha ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Pagịel nwa Okran.
28 Kundi lake lina watu 41,500.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise.
29 Kabila la Naftali litafuata. Kiongozi wa watu wa Naftali ni Ahira mwana wa Enani.
Otu aka ahụ ka ebo Naftalị ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Ahira nwa Enan.
30 Kundi lake lina watu 53,400.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ.
31 Wanaume wote walio katika kambi ya Dani ni 157,600. Wao watakuwa wa mwisho kuondoka chini ya alama yao.
Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Dan bikọrọ nʼakụkụ elu elu nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na puku asaa na narị isii. Ha ga-abụ ndị ga-ekpe azụ bilie ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha.
32 Hawa ndio Waisraeli, wakiwa wamehesabiwa kufuatana na jamaa zao. Wote walio kambini kwa makundi yao ni watu 603,550.
Ndị a bụ ndị Izrel, ndị a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. Ndị ikom niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka usuu ha dị iche iche si dị, narị puku isii, puku atọ na narị ise na iri ise nʼọnụọgụgụ.
33 Hata hivyo, Walawi hawakuhesabiwa pamoja na Waisraeli wengine, kama Bwana alivyomwagiza Mose.
Ma otu ọ dị, a gụnyeghị ebo Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel ndị ọzọ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
34 Kwa hiyo Waisraeli wakafanya kila kitu Bwana alichomwamuru Mose. Hivyo ndivyo walivyopiga kambi chini ya alama zao, pia hivyo ndivyo walivyoondoka, kila mmoja akiwa na ukoo wake na jamaa yake.
Ya mere, ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Otu a ka ha si maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Otu a kwa ka ha si ebuli ije. Onye ọbụla nʼime ha dịka ebo ha na ezinaụlọ ha si dị.