< Nehemia 10 >
1 Wale waliotia muhuri walikuwa: Nehemia mtawala, mwana wa Hakalia. Sedekia,
Ndị tinyere aka, nʼakwụkwọ ahụ bụ: Onyeisi ọchịchị: Nehemaya nwa Hakalaya. Zedekaya,
2 Seraya, Azaria, Yeremia,
Ndị ọzọ bụ Seraya, Azaraya, Jeremaya,
3 Pashuri, Amaria, Malkiya,
Pashua, Amaraya, Malkija,
4 Hatushi, Shebania, Maluki,
Hatush, Shebanaya, Maluk,
5 Harimu, Meremothi, Obadia,
Harim, Meremot, Ọbadaya,
6 Danieli, Ginethoni, Baruku,
Daniel, Gineton, Baruk,
7 Meshulamu, Abiya, Miyamini,
Meshulam, Abija, Mijamin,
8 Maazia, Bilgai na Shemaya. Hawa ndio waliokuwa makuhani.
Maazaya, Bilgai na Shemaya. Ndị a bụ ndị nchụaja.
9 Walawi: Yeshua mwana wa Azania, Binui wa wana wa Henadadi, Kadmieli,
Ndị Livayị so tinye aka ha nʼakwụkwọ bụ, Jeshua nwa Azanaya, Binui otu nʼime ụmụ Henadad, Kadmiel,
10 na wenzao: Shebania, Hodia, Kelita, Pelaya, Hanani,
ndị so ha na-arụ ọrụ: Shebanaya, Hodia, Kelita, Pelaia, Hanan,
11 Mika, Rehobu, Hashabia,
Mika, Rehob, Hashabaya
12 Zakuri, Sherebia, Shebania,
Zakua, Sherebaya, Shebanaya,
13 Hodia, Bani na Beninu.
Hodia, Bani na Beninu.
14 Viongozi wa watu: Paroshi, Pahath-Moabu, Elamu, Zatu, Bani,
Ndịisi ọchịchị tinyere aka ha bụ, Parosh, Pahat-Moab, Elam, Zatu, Bani,
16 Adoniya, Bigwai, Adini,
Adonaịja, Bigvai, Adin,
17 Ateri, Hezekia, Azuri,
Atea, Hezekaya, Azoa,
18 Hodia, Hashumu, Besai,
Hodia, Hashum, Bezai,
19 Harifu, Anathothi, Nebai,
Harif, Anatot, Nebai,
20 Magpiashi, Meshulamu, Heziri,
Magpịash, Meshulam, Hezia,
21 Meshezabeli, Sadoki, Yadua,
Meshezabel, Zadọk, Jadua,
22 Pelatia, Hanani, Anaya,
Pelataya, Hanan, Anaia,
23 Hoshea, Hanania, Hashubu,
Hoshea, Hananaya, Hashub,
24 Haloheshi, Pilha, Shobeki,
Halohesh, Pilha, Shobek,
25 Rehumu, Hashabna, Maaseya,
Rehum, Hashabna, Maaseia,
27 Maluki, Harimu na Baana.
Maluk, Harim na Baana.
28 “Watu wengine wote, wakiwa ni makuhani, Walawi, mabawabu, waimbaji, watumishi wa Hekalu, na wale wote waliojitenga na mataifa jirani kwa ajili ya Sheria ya Mungu, pamoja na wake zao na wana wao na binti zao wote waliokuwa na uwezo wa kufahamu,
“Ndị ọzọ fọdụrụ bụ ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị nche, ndị ọbụ abụ, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ndị ahụ niile sitere nʼirube isi nʼiwu Chineke wezuga onwe ha site nʼebe ndị mba ọzọ ahụ bi ha gburugburu nọ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom, bụ ndị niile tozuru ịghọta ihe.
29 basi hawa wote wanajiunga na ndugu zao na wakuu wao, na kujifunga kwa laana na kwa kiapo kufuata Sheria ya Mungu iliyotolewa kupitia kwa Mose mtumishi wa Mungu, na kutii kwa uangalifu amri zote, maagizo na sheria za Bwana, Bwana wetu.
Ndị a niile sooro ụmụnne ha ndị Izrel a na-asọpụrụ, jikọtaa onwe ha nʼọbụbụ ọnụ na ịṅụ iyi ịgbaso iwu Chineke, nke o nyere site nʼaka Mosis, bụ ohu Chineke; na ilezi anya rube isi nʼihe niile enyere nʼiwu, ntụziaka niile na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị.
30 “Tunaahidi kutowaoza binti zetu kwa watu wanaotuzunguka, wala kuwaoza wana wetu binti zao.
“Anyị kpebikwara na ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom agaghị alụ di maọbụ nwunye site na mba ọzọ.
31 “Wakati mataifa jirani waletapo bidhaa zao au nafaka kuuza siku ya Sabato, hatutazinunua kutoka kwao siku ya Sabato, wala siku nyingine yoyote takatifu. Kila mwaka wa saba, tutaacha kuilima ardhi na tutafuta madeni yote.
“Anyị kpebikwara na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ eburu ngwa ahịa ha maọbụ mkpụrụ ubi ha bịa ire ya nʼụbọchị izuike, maọbụ nʼụbọchị ọzọ dị nsọ, anyị agaghị azụ ihe ọbụla. Anyị na-ekpebikwa na anyị agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼafọ nke asaa niile, kwekọọkwa na anyị ga-agbaghara ụmụnna anyị niile ji anyị ụgwọ nʼafọ ahụ.
32 “Tunakubali wajibu wa kutimiza amri za kutoa theluthi ya shekeli kila mwaka kwa ajili ya utumishi wa nyumba ya Mungu:
“Anyị kwekọrịtakwara na anyị ga-atụ ụtụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke otu shekel afọ niile maka iji kwadoo ọrụ ụlọnsọ ukwu Chineke,
33 Kwa ajili ya mikate ya Wonyesho, kwa ajili ya sadaka za kawaida za nafaka na sadaka za kuteketezwa, kwa ajili ya sadaka za siku za Sabato, Sikukuu za Mwandamo wa Mwezi na sikukuu nyingine zilizoamriwa, kwa ajili ya sadaka takatifu, kwa ajili ya sadaka za dhambi ili kufanya upatanisho kwa ajili ya Israeli, na kwa ajili ya kazi zote za nyumba ya Mungu wetu.
maka ime ka ihe ndị a dịrị nʼụlọnsọ ukwu ahụ: achịcha nsọ, onyinye ọka nke ụbọchị niile, aja nsure ọkụ na onyinye nke ụbọchị izuike, mmemme ọnwa ọhụrụ niile, ha na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka, maka aja dị nsọ niile na aja ikpuchi mmehie ndị Izrel, maka ozi niile a na-aga nʼụlọnsọ Chineke anyị.
34 “Sisi makuhani, Walawi na watu, tumepiga kura kuamua kuwa kila mmoja wa jamaa zetu lazima alete katika nyumba ya Mungu wetu kwa nyakati maalum kila mwaka mchango wa kuni za kukokea moto katika madhabahu ya Bwana Mungu wetu, kama ilivyoandikwa katika Sheria.
“Anyị bụ ndị nchụaja, ndị Livayị na ndị ọzọ, ejirila ife nza chọpụta mgbe ezinaụlọ ọbụla nʼetiti anyị ga-eji bubata nku nʼụlọ Chineke anyị nʼoge ya kwa afọ, maka ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị Chineke anyị dịka e dere ya nʼiwu.
35 “Pia tunachukua wajibu wa kuleta malimbuko ya mazao yetu na matunda ya kwanza ya kila mti wa matunda katika nyumba ya Bwana kila mwaka.
“Anyị kpebikwara na mmadụ niile nʼotu nʼotu ga na-ewebata mkpụrụ mbụ nke ihe ubi ya nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na mkpụrụ osisi ọbụla, maọbụ ihe ubi ndị ọzọ.
36 “Kama pia ilivyoandikwa katika Sheria, tutawaleta wazaliwa wetu wa kwanza wa kiume, na wa mifugo yetu, yaani wa ngʼombe wetu na wa makundi yetu ya kondoo na mbuzi, katika nyumba ya Mungu wetu, kwa ajili ya makuhani wanaohudumu huko.
“Dịka e dere ya nʼIwu, anyị ga-ewebata ụmụ ndị ikom mbụ anyị, na nwa mbụ nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ anyị niile, nʼụlọ Chineke anyị. A ga-enye ha ndị nchụaja na-eje ozi nʼebe ahụ.
37 “Zaidi ya hayo, tutaleta katika ghala za nyumba ya Mungu wetu, kwa makuhani, vyakula vya kwanza vya mashamba yetu, sadaka zetu za nafaka, matunda ya miti yetu yote, divai yetu mpya na mafuta. Nasi tutaleta zaka za mazao yetu kwa Walawi, kwa kuwa Walawi ndio ambao hukusanya zaka katika miji yote tunakofanya kazi.
“Karịsịa, anyị ga-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ Chineke anyị, nyekwa ha ndị nchụaja, ụtụ ọka mbụ anyị kwọrọ, ya na onyinye ndị ọzọ nke mkpụrụ ubi mbụ anyị, dịka mmanya vaịnị mbụ, mmanụ oliv mbụ na mkpụrụ osisi ndị ọzọ. Anyị kpebikwara inye ndị Livayị otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile anyị nwetara nʼubi anyị, nʼihi na ọ bụ ọrụ ndị Livayị ịnakọta otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼobodo niile ebe anyị na-arụ ọrụ.
38 Kuhani atokanaye na uzao wa Aroni atashirikiana na Walawi wakati wanapopokea zaka, nao Walawi itawapasa kuleta sehemu ya kumi ya zaka katika nyumba ya Mungu wetu katika ghala za hazina.
Ndị nchụaja bụ ụmụ ụmụ Erọn ga-eso ndị Livayị mgbe ha na-anakọta onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ndị a. Ha ga-ewekọta ihe ndị a niile webaa ha nʼụlọ Chineke anyị, ruo nʼime ọnụụlọ ịchịkọba ihe, nke ụlọakụ.
39 Watu wa Israeli pamoja na Walawi itawapasa kuleta michango yao ya nafaka, divai mpya na mafuta katika vyumba vya ghala, mahali vifaa vya mahali patakatifu vinapohifadhiwa, na wanapokaa makuhani wanaohudumu, na mabawabu na waimbaji. “Hatutaacha kuijali nyumba ya Mungu wetu.”
Ndị Izrel na ndị Livayị, kwesiri iweta onyinye ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv nʼime ụlọ ịchịkọba ihe, nʼebe a na-edebe ngwongwo niile e ji eje ozi nʼụlọ ukwu ahụ, nke ndị nchụaja na-eje ozi, ndị nche na nke ndị ọbụ abụ. “Anyị agaghị agbakụtakwa ụlọ Chineke anyị azụ.”