< Nahumu 1 >
1 Neno alilosema Mungu kuhusu Ninawi. Kitabu cha maono cha Nahumu, Mwelkoshi.
Amụma banyere obodo Ninive. Akwụkwọ ọhụ Nehum, onye obodo Elkosh.
2 Bwana ni mwenye wivu na Mungu mlipiza kisasi; Bwana hulipiza kisasi na amejaa ghadhabu. Bwana hulipiza kisasi juu ya watesi wake, naye anadumisha ghadhabu yake dhidi ya adui zake.
Onyenwe anyị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ. Onyenwe anyị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi. Onyenwe anyị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya, oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya.
3 Bwana si mwepesi wa hasira naye ni mwenye nguvu, Bwana hataacha kuadhibu wenye hatia. Njia yake ipo katika kisulisuli na tufani, na mawingu ni vumbi la miguu yake.
Onyenwe anyị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ. Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe, igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya.
4 Anakemea bahari na kuikausha, anafanya mito yote kukauka. Bashani na Karmeli zinanyauka na maua ya Lebanoni hukauka.
Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa, o mekwaala ka osimiri niile takọrọ. Bashan na Kamel na-akpọnwụ, otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị.
5 Milima hutikisika mbele yake na vilima huyeyuka. Nchi hutetemeka mbele yake, dunia na wote waishio ndani yake.
Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ, ugwu nta niile na-agbazekwa, elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya, ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya.
6 Ni nani awezaye kuzuia hasira yake yenye uchungu? Nani awezaye kuvumilia hasira yake kali? Ghadhabu yake imemiminwa kama moto, na miamba inapasuka mbele zake.
Onye ga-eguzogide oke iwe ya? Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ? A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ, e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya.
7 Bwana ni Mwema, kimbilio wakati wa taabu. Huwatunza wale wanaomtegemea,
Onyenwe anyị dị mma. Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu. Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,
8 lakini kwa mafuriko makubwa, ataangamiza Ninawi; atafuatilia adui zake hadi gizani.
ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu gbuo ndị iro ya niile, ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị.
9 Shauri baya lolote wapangalo dhidi ya Bwana yeye atalikomesha; taabu haitatokea mara ya pili.
Kedụ izu ọjọọ unu na-agba megide Onyenwe anyị ọ ga-eweta ihe niile nʼisi njedebe; nsogbu agaghị abịakwa nke ugboro abụọ.
10 Watasongwa katikati ya miiba na kulewa kwa mvinyo wao. Watateketezwa kama mabua makavu.
Ha ga-abụ ndị a tụhịkọtara nʼetiti ogwu, ndị mmanya ha ṅụbigara oke na-egbu, ha ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
11 Ee Ninawi, kutoka kwako amejitokeza mmoja, ambaye anapanga shauri baya dhidi ya Bwana na kushauri uovu.
Ọ bụ nʼime gị, Ninive, ka otu onye si pụta, bụ onye ahụ gbara izu ọjọọ megide Onyenwe anyị, na-echepụtakwa ajọ atụmatụ.
12 Hili ndilo asemalo Bwana: “Ingawa wana muungano nao ni wengi sana, watakatiliwa mbali na kuangamia. Ingawa nimekutesa wewe, ee Yuda, sitakutesa tena.
Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ ezie na ha siri ike, ma bakwaa ụba nʼọnụọgụgụ, ha ga-abụ ndị a ga-egbutu na ndị ga-agabiga. Ọ bụ ezie na m ataala gị bụ Juda ahụhụ, ma agaghị m atakwa gị ahụhụ ọzọ.
13 Sasa nitavunja nira zao kutoka shingo yako, nami nitazivunjilia mbali pingu zako.”
Ugbu a, aga m agbajipụ agbụ yoku ọ nyanyere unu nʼolu, tibikwaa ụdọ igwe e jiri kegide unu.”
14 Hii ndiyo amri Bwana aliyoitoa kukuhusu wewe, Ninawi: “Hutakuwa na wazao watakaoendeleza jina lako. Nitaharibu sanamu za kuchonga na sanamu za kuyeyusha ambazo zipo katika hekalu la miungu yenu. Nitaandaa kaburi lako, kwa maana wewe ni mwovu kabisa.”
Onyenwe anyị enyela iwu ya banyere gị, Ninive: “Ị gaghị enwekwa ụmụ ụmụ ndị ga-aza aha gị. Aga m ala arụsị unu niile a pịrị apị na ndị a kpụrụ akpụ nʼiyi, bụ arụsị ndị ahụ dị nʼụlọnsọ nke chi unu niile. Aga m akwadokwa ili gị, nʼihi na ị bụrụla onye jọgburu onwe ya na njọ.”
15 Tazama, huko juu milimani, miguu ya huyo mmoja aletaye habari njema, ambaye anatangaza amani! Ee Yuda, sherehekea sikukuu zako, nawe utimize nadhiri zako. Waovu hawatakuvamia tena; wataangamizwa kabisa.
Lee, nʼelu ugwu niile ka ụkwụ onye ahụ na-eweta oziọma dị, bụ onye ahụ na-ekwusa na udo ga-adị! Mee mmemme gị niile gị Juda, mezukwaa nkwa niile i kwere. Nʼihi na ndị ajọ omume agakwaghị ebuso gị agha, nʼihi na a ga-ala ha nʼiyi kpamkpam.