< Mambo ya Walawi 4 >

1 Bwana akamwambia Mose,
Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 “Waambie Waisraeli: ‘Mtu yeyote afanyapo dhambi bila kukusudia na akatenda lile lililokatazwa katika amri yoyote ya Bwana:
“Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, megide ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu:
3 “‘Ikiwa kuhani aliyetiwa mafuta amefanya dhambi na kuwaletea watu hatia, lazima alete kwa Bwana fahali mchanga asiye na dosari, kuwa sadaka ya dhambi kwa ajili ya dhambi aliyotenda.
“‘Ọ bụrụ na onye nchụaja e tere mmanụ emehie na-amaghị ama, si otu a weta ikpe ọmụma nʼisi ọha mmadụ. Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị otu oke ehi na-enweghị ntụpọ dịka aja mmehie, nʼihi mmehie ahụ o mere.
4 Atamkabidhi huyo fahali kwenye ingilio la Hema la Kukutania mbele za Bwana. Ataweka mkono wake juu ya kichwa cha huyo fahali na kumchinja mbele za Bwana.
Ọ ga-ewere oke ehi ahụ bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi ya, gbuo ya nʼebe ahụ nʼihu Onyenwe anyị.
5 Kisha kuhani huyo aliyetiwa mafuta atachukua sehemu ya damu ya huyo fahali na kuileta katika Hema la Kukutania.
Mgbe ahụ, onye nchụaja e tere mmanụ ga-eburu ụfọdụ ọbara oke ehi ahụ baa nʼime ụlọ nzute.
6 Atachovya kidole chake katika hiyo damu na kuinyunyiza sehemu yake mara saba mbele za Bwana mbele ya pazia la mahali patakatifu.
Ọ ga-edenye mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ, fesa ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu akwa mgbochi nke ebe nsọ ahụ.
7 Kisha kuhani atatia sehemu ya hiyo damu juu ya pembe za madhabahu ya kufukizia uvumba wenye harufu nzuri iliyoko mbele za Bwana katika Hema la Kukutania. Damu iliyobaki ya huyo fahali ataimwaga chini ya hayo madhabahu ya kuteketezea sadaka kwenye ingilio la Hema la Kukutania.
Onye nchụaja ga-etekwasị ụfọdụ ọbara ahụ na mpi dị nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ, nʼihu Onyenwe anyị nʼime ụlọ nzute. Ọbara fọdụrụ nʼoke ehi ahụ ka ọ ga-awụsa nʼụkwụ ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ, nʼọnụ ụzọ ịba ụlọ nzute.
8 Atayaondoa mafuta yote ya fahali huyo wa sadaka ya dhambi, mafuta yale yanayofunika sehemu za ndani au zile zinazounganika nazo,
Ọ ga-ewepụ abụba niile site nʼoke ehi aja mmehie, abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya na nke jikọtara ha,
9 figo zote mbili na mafuta yaliyo juu yake karibu na kiuno na yale yanayofunika ini ambayo atayaondoa pamoja na figo zote,
na akụrụ ya abụọ na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na ihe kpuchiri umeju ya, nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya,
10 kama vile mafuta yanayoondolewa kutoka kwenye maksai aliyetolewa sadaka ya amani. Kisha kuhani ataviteketeza juu ya madhabahu ya sadaka ya kuteketezwa.
dịka e si ewepụ abụba oke ehi e ji chụọ aja udo. Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ.
11 Lakini ngozi ya huyo fahali na nyama zake zote, pamoja na kichwa na miguu yake, sehemu za ndani na matumbo,
Ma akpụkpọ anụ oke ehi ahụ na ahụ ya niile, ma isi ya, na ụkwụ ya, na ihe dị nʼime afọ ya, na mgbịrị afọ ya,
12 yaani sehemu nyingine zote zilizobaki za huyo fahali, lazima azitoe nje ya kambi mpaka mahali palipo safi kiibada, ambapo majivu hutupwa, naye atamchoma kwa moto juu ya kuni zilizoko juu ya lundo la majivu.
ihe niile fọdụrụ nʼoke ehi ahụ, ka a ga-ebupu nʼazụ ebe obibi ụmụ Izrel, ebe dị ọcha, ebe a na-ekpofu ntụ. Ebe ahụ ka a ga-anọ kpọọ ya ọkụ, nʼọkụ a kwanyere nʼebe a na-ekpofu ntụ.
13 “‘Ikiwa jumuiya yote ya Israeli watatenda dhambi pasipo kukusudia na kufanya lile lililokatazwa katika amri yoyote ya Bwana, hata kama jumuiya haifahamu juu ya jambo hilo, wana hatia.
“‘Ọ bụrụ na nzukọ Izrel niile emehie na-amaghị ama, mee ihe ọbụla megidere ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, ọ bụ ezie na ndị obodo amaghị okwu a, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha
14 Wanapotambua kuhusu dhambi waliyoitenda, lazima kusanyiko lilete fahali mchanga kuwa sadaka ya dhambi na kuikabidhi mbele ya Hema la Kukutania.
matakwa mmehie ha mehiere, nzukọ ahụ aghaghị iweta nwa oke ehi dịka aja mmehie, duru ya chee ya nʼihu ụlọ nzute.
15 Wazee wa jumuiya wataweka mikono yao juu ya kichwa cha huyo fahali aliye mbele za Bwana, naye fahali atachinjwa mbele za Bwana.
Ndị okenye nzukọ Izrel ga-ebikwasị aka ha nʼisi oke ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. A ga-egbu ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị.
16 Kisha kuhani aliyetiwa mafuta ataiingiza sehemu ya damu ya huyo fahali ndani ya Hema la Kukutania.
Mgbe ahụ, onye nchụaja e tere mmanụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara ya baa nʼụlọ nzute.
17 Atachovya kidole chake kwenye damu na kuinyunyiza mara saba mbele za Bwana mbele ya hilo pazia.
Ọ ga-edenye mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ fesa ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu akwa mgbochi ahụ.
18 Atatia sehemu ya hiyo damu juu ya pembe za madhabahu yaliyo mbele za Bwana katika Hema la Kukutania. Damu iliyobaki ataimwaga chini ya madhabahu ya kuteketezea sadaka, penye ingilio la Hema la Kukutania.
Ọ ga-ete ọbara ụfọdụ nʼelu mpi nke dị nʼebe ịchụ aja nke dị nʼihu Onyenwe anyị, nʼụlọ nzute. Ọ ga-awụ ọbara nke fọdụrụ nʼụkwụ ala ala, nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
19 Atayaondoa mafuta yote ya yule fahali na kuyateketeza juu ya madhabahu,
Ọ ga-ewepụta abụba niile dị ya nʼahụ kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja.
20 naye atamfanyia fahali huyu kama alivyomfanyia yule fahali mwingine wa sadaka ya dhambi. Kwa njia hii kuhani atawafanyia watu upatanisho, nao watasamehewa.
Ọ ga-eme oke ehi ahụ ihe o mere oke ehi aja mmehie. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchi mmehie ndị Izrel. A ga-agbagharakwa ha.
21 Kisha atamchukua yule fahali nje ya kambi na kumteketeza kama alivyomteketeza yule wa kwanza. Hii ni sadaka ya dhambi kwa ajili ya jumuiya.
Emesịa, onye nchụaja ga-eburu ozu oke ehi ahụ gaa nʼazụ obodo kpọọ ya ọkụ nʼebe ahụ, dịka o mere oke ehi nke mbụ. Nke a bụ aja mmehie nʼihi nzukọ Izrel.
22 “‘Wakati kiongozi ametenda dhambi bila kukusudia na kufanya yaliyokatazwa katika amri yoyote ya Bwana Mungu wake, ana hatia.
“‘Mgbe otu nʼime ndịisi obodo mehiere na-amaghị ama, si otu a megide ihe Onyenwe anyị Chineke nyere nʼiwu banyere ihe a na-agaghị eme, mgbe ọ ghọtara ikpe ọmụma ya.
23 Atakapofahamishwa dhambi aliyotenda, ni lazima alete mbuzi dume asiye na dosari kama sadaka yake.
Ọ bụrụkwa na-eme ka ọ mata mmehie ya, ọ ghaghị iweta mkpi na-enweghị nkwarụ dịka onyinye nʼihi mmehie ya.
24 Ataweka mkono wake juu ya kichwa cha yule mbuzi na kumchinja mahali pale ambapo sadaka za kuteketezwa huchinjiwa mbele za Bwana. Hii ni sadaka ya dhambi.
Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi mkpi ahụ. Gbuo ya nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ aja mmehie.
25 Kisha kuhani atachukua sehemu ya damu ya sadaka ya dhambi kwa kidole chake na kuitia kwenye pembe za madhabahu ya sadaka ya kuteketeza, na kuimwaga damu iliyobaki chini ya madhabahu.
Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara aja mmehie ahụ na mkpịsịaka ya tee ya nʼelu mpi ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Nke fọdụrụ ka ọ ga-awụpụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja.
26 Atayateketeza mafuta yote juu ya madhabahu, kama alivyoteketeza mafuta ya sadaka ya amani. Kwa njia hii kuhani atafanya upatanisho wa dhambi kwa ajili ya yule mtu, naye atasamehewa.
Ọ ga-akpọ abụba ya niile ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka o si kpọọ abụba anụ e ji chụọ aja udo ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchiri onyeisi ahụ mmehie ya. A ga-agbaghara ya.
27 “‘Kama mtu katika jumuiya ametenda dhambi pasipo kukusudia na kufanya lile lililokatazwa katika amri yoyote ya Bwana, yeye ana hatia.
“‘Ọ bụrụ na otu onye nʼetiti ndị obodo ahụ emehie na-amaghị ama, mee ihe megidere ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha,
28 Atakapofahamishwa dhambi yake aliyoitenda, ni lazima alete mbuzi jike asiye na dosari kama sadaka yake kwa ajili ya dhambi aliyotenda.
ọ bụrụkwa na-amata mmehie ha mere, ha ga-eweta nne ewu na-enweghị ntụpọ dịka onyinye nʼihi mmehie ya.
29 Ataweka mkono wake juu ya kichwa cha sadaka ya dhambi na kumchinjia mahali pa kuteketezea sadaka.
Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼelu isi aja mmehie ahụ, e gbuo ya nʼebe a na-achụ aja nsure ọkụ.
30 Kisha kuhani atachukua sehemu ya ile damu kwa kidole chake na kuitia kwenye pembe za madhabahu ya sadaka ya kuteketezwa na kuimwaga damu iliyobaki chini ya madhabahu.
Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara ahụ na mkpịsịaka ya tee ya na mpi nke ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, ọ ga-awụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja.
31 Atayaondoa mafuta yote, kama vile mafuta yaondolewavyo kwenye sadaka ya amani, naye kuhani atayateketeza juu ya madhabahu kama harufu nzuri ya kumpendeza Bwana. Kwa njia hii kuhani atafanya upatanisho kwa ajili yake, naye atasamehewa.
Ọ ga-ewepụ abụba ya niile dịka a na-eme nʼaja udo. Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja, dịka ihe na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja a ga-ekpuchikwara ha mmehie. A ga-agbagharakwa ha.
32 “‘Ikiwa ataleta mwana-kondoo kama sadaka yake ya dhambi, atamleta jike asiye na dosari.
“‘Ma ọ bụrụ na mmadụ eweta otu atụrụ dịka onyinye nʼihi aja mmehie ya, ọ ghaghị ịbụ nne atụrụ na-enweghị ntụpọ.
33 Ataweka mkono wake juu ya kichwa cha huyo mwana-kondoo na kumchinja kwa ajili ya sadaka ya dhambi mahali sadaka ya kuteketezwa huchinjiwa.
Ọ ga-eweta ya nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ebikwasị ya aka nʼisi, gbuo ya nʼebe ahụ, ka ọ bụrụ aja mmehie ya.
34 Kisha kuhani atachukua sehemu ya damu ya sadaka ya dhambi kwa kidole chake na kuitia juu ya pembe za madhabahu ya sadaka ya kuteketezwa, na ile damu iliyobaki ataimwaga chini ya madhabahu.
Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara anụ aja mmehie ahụ na mkpịsịaka ya, tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Ọ ga-awụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala nke ebe ịchụ aja.
35 Ataondoa mafuta yote, kama vile mafuta yaondolewavyo kutoka kwenye mwana-kondoo wa sadaka ya amani, naye kuhani atayateketeza juu ya madhabahu juu ya zile sadaka zilizotolewa kwa Bwana kwa moto. Kwa njia hii kuhani atafanya upatanisho kwa ajili yake kwa dhambi aliyoitenda, naye atasamehewa.
Ha ga-ewepụ abụba ya niile, dịka a na-eme nʼatụrụ aja udo. Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka onyinye nsure ọkụ a chụrụ nye Onyenwe anyị. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie nʼihi iwu ha dara. A ga-agbaghara ha mmehie ha.

< Mambo ya Walawi 4 >