< Waamuzi 12 >

1 Watu wa Efraimu wakaita majeshi yao, wakavuka kwenda Zafoni, wakamwambia Yefta, “Kwa nini mmekwenda kupigana na Waamoni bila kutuita ili twende pamoja nawe? Basi tutaichoma moto nyumba yako, pamoja nawe ukiwa ndani yake.”
Mgbe ahụ, ndị Ifrem kpọkọtara ndị agha ha na Zafọn zigara Jefta ozi sị ya, “Gịnị mere ị kpọghị anyị ka anyị bịa nyere gị aka ịlụso ndị Amọn agha? Anyị na-abịa iwere ọkụ irechapụ gị na ezinaụlọ gị.”
2 Yefta akajibu, “Mimi na watu wangu tulikuwa na ugomvi mkubwa na Waamoni, hata ingawa niliwaita hamkuniokoa katika mkono wao.
Jefta zaghachiri ha sị, “Akpọrọ m unu mgbe mụ na ndị m na ndị Amọn na-ese okwu dị ukwu ma unu jụrụ ịbịa. Unu azọpụtaghị m site nʼaka ha.
3 Nilipoona kuwa hamkunipa msaada nikauhatarisha uhai wangu na nikavuka kupigana na Waamoni. Naye Bwana akanipatia ushindi dhidi yao. Sasa kwa nini mnanijia leo ili kupigana nami?”
Mgbe m hụrụ na unu achọghị inyere anyị aka, e tinyere m ndụ m nʼaka m, gabiga nʼofe nke ọzọ ibuso ndị Amọn agha. Ma Onyenwe anyị nyeere m aka imeri ha. Ugbu a, nʼihi gịnị ka unu ji bịa ịlụso m ọgụ taa?”
4 Ndipo Yefta akakusanya watu wa Gileadi pamoja na kupigana na Efraimu. Wagileadi wakawashinda Efraimu, kwa kuwa Waefraimu walisema, “Ninyi Wagileadi ni watoro mliotoroka toka Efraimu na Manase.”
Jefta kpọkọtara ndị ikom Gilead pụọ buso ndị Ifrem agha. Ndị Gilead tidara ha nʼala nʼihi na ndị Ifrem sịrị, “Ndị gbapụrụ agbapụ site nʼIfrem na Manase ka unu bụ.”
5 Wagileadi wakaviteka vivuko vya Yordani dhidi ya hao Waefraimu, kisha ilikuwa yeyote yule aliyenusurika katika Efraimu aliposema, “Niache nivuke,” hao watu wa Gileadi walimuuliza, “Je wewe ni Mwefraimu?” Kama alijibu “Hapana,”
Ọ nọchiri akụkụ Jọdan dị ndị agha Ifrem nʼazụ, ebe ndị agha Ifrem nwere ike isi gbapụ. Mgbe ọbụla onye agha Ifrem ọbụla gbapụrụ ọsọ chọọ ịgafe osimiri ahụ, ndị agha Gilead ga-ejide ya jụọ ya sị, “Ị bụ onye Ifrem?” Ọ bụrụ na onye ahụ ekwuo na ya abụghị onye Ifrem,
6 walimwambia, “Sawa, sema ‘Shibolethi.’” Iwapo alitamka, “Sibolethi,” kwa sababu hakuweza kutamka hilo neno sawasawa, walimkamata na kumuua hapo kwenye vivuko vya Yordani. Waefraimu 42,000 waliuawa wakati huo.
ha sịrị, “Ọ dị mma, kpọọ, ‘Shibolet.’” Ọ bụrụ na onye ahụ akpọ, “Sibolet,” nʼihi na ọ kpọpụtaghị mkpụrụ okwu ahụ nke ọma, ha na-akpụrụ ya gbuo ya na ngabiga mmiri Jọdan. Ọ bụ ọnụọgụgụ iri puku anọ, na puku abụọ ndị Ifrem ka e gburu mgbe ahụ.
7 Yefta akawa mwamuzi wa Waisraeli kwa muda wa miaka sita. Basi Yefta akafa, akazikwa katika mmojawapo wa miji ya Gileadi.
Jefta duuru ndị Izrel afọ isii. Mgbe ọ nwụrụ, e liri ya nʼotu obodo Gilead.
8 Baada yake, Ibzani wa Bethlehemu akawa mwamuzi wa Israeli.
Onye ikpe ọzọ Izrel nwere bụ Ibzan onye bi na Betlehem.
9 Alikuwa na wana thelathini na binti thelathini. Akawaoza binti zake kwa watu wengine nje ya ukoo wake, na kuwatwalia wanawe wanawake thelathini toka nje ya ukoo wake. Ibzani akawa mwamuzi wa Israeli kwa muda wa miaka saba.
O nwere iri ụmụ ndị ikom atọ na iri ụmụ ndị inyom atọ. O kenyere ndị ikom ikwu ọzọ ụmụ ya ndị inyom. Otu a kwa, o sikwa nʼikwu ọzọ lụtara ụmụ ya ndị ikom iri ndị inyom atọ. O kpere Izrel ikpe afọ asaa.
10 Ibzani akafa, akazikwa huko Bethlehemu.
Ibzan nwụrụ, e lie ya na Betlehem.
11 Baada yake Eloni, Mzabuloni, akawa mwamuzi wa Israeli, naye akawaamua kwa muda wa miaka kumi.
Onye ọzọ kpere Izrel ikpe bụ Elọn, onye Zebụlọn. O kpere Izrel ikpe afọ iri.
12 Kisha Eloni akafa, akazikwa katika Aiyaloni, katika nchi ya Zabuloni.
Emesịa, Elọn nwụrụ, e lie ya nʼAijalon, nʼime ala Zebụlọn.
13 Baada yake, Abdoni mwana wa Hileli, Mpirathoni, akawa mwamuzi wa Israeli.
Onye ọzọ kpere Izrel ikpe bụ Abdon nwa Hilel, onye Piraton.
14 Naye akazaa wana arobaini na wana wa wanawe thelathini waliopanda punda sabini. Akawa mwamuzi wa Israeli kwa muda wa miaka minane.
O nwere iri ụmụ ndị ikom anọ na iri ụmụ ụmụ atọ ndị na-agba iri ịnyịnya ibu asaa. O kpere ụmụ Izrel ikpe afọ asatọ.
15 Ndipo Abdoni mwana wa Hileli, Mpirathoni, akafa, naye akazikwa huko Pirathoni katika Efraimu, katika nchi ya vilima ya Waamaleki.
Mgbe ahụ, Abdon nwa Hilel nwụrụ, e lie ya na Piraton ala dị nʼIfrem, nʼobodo ugwu ndị Amalek.

< Waamuzi 12 >