< Ayubu 6 >
2 “Laiti uchungu wangu ungeweza kupimwa, nayo taabu yangu yote ingewekwa kwenye mizani!
“A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu m ya na nhụju anya m niile nʼelu nʼihe ọtụtụ!
3 Kwa kuwa hakika ingekuwa nzito kuliko mchanga wa bahari zote, kwa hiyo si ajabu maneno yangu yamekuwa ya haraka.
Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri, nke mere okwu m ji ada ike ike.
4 Mishale ya Mwenyezi iko ndani yangu, roho yangu inakunywa sumu yake; vitisho vya Mungu vimejipanga dhidi yangu.
Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m; mmụọ m na-aṅụkwa nsi dị na ha; ihe egwu Chineke edoola onwe ha nʼusoro imegide m.
5 Je, punda-mwitu hulia akiwa na majani, au ngʼombe dume hulia akiwa na chakula?
Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata, ka oke ehi ọ na-akwa akwa mgbe ihe oriri ya dị?
6 Je, chakula kisicho na ladha huliwa bila chumvi, au upo utamu katika ute mweupe wa yai?
A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu, ka o nwere ụtọ dị na eso ọkwụrụ?
7 Ninakataa kuvigusa; vyakula vya aina hii hunichukiza.
A jụrụ m ịmetụ ya aka, nʼihi na nri dị otu a na-eme ka m daa ọrịa.
8 “Laiti ningepata haja yangu, kwamba Mungu angenijalia hilo nililotarajia,
“O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ, na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya.
9 kwamba Mungu angekuwa radhi kuniponda, kuuachia mkono wake na kunikatilia mbali!
Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m ka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m.
10 Ndipo bado ningekuwa na hii faraja, furaha yangu katika maumivu makali: kwamba sikuwa nimeyakana maneno yake yeye Aliye Mtakatifu.
Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a, wụlikwaa elu nʼime ihe mgbu na-adịgide, na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ.
11 “Ninazo nguvu gani, hata niendelee kutumaini? Matazamio yangu ya mbele ni nini, hata niendelee kuwa mvumilivu?
“Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ? Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi?
12 Je, mimi nina nguvu za jiwe? Je, mwili wangu ni shaba?
Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume? Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz?
13 Je, ninao uwezo wowote wa kujisaidia mimi mwenyewe, wakati ambapo mafanikio yamefukuziwa mbali nami?
Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka, ugbu a, e siterela nʼebe m nọ wezuga nzube?
14 “Mtu anayekata tamaa angetazamia moyo wa kujitoa wa rafiki zake, hata kama akiacha uchaji wa Mwenyezi.
“Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.
15 Lakini ndugu zangu sio wa kutegemewa, ni kama vijito vya msimu, ni kama vijito ambavyo hufurika
Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha, dịka iyi mmiri na-akọ, dịka iyi nke na-etofe ọnụ ya,
16 wakati vimefunikwa barafu iyeyukayo, ambavyo hujazwa na theluji inayoyeyuka,
nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi, nke unyi jupụtara nʼihi mgbaze nke mkpụrụ mmiri oyi.
17 lakini hukauka majira ya ukame, na wakati wa hari hutoweka katika mikondo yake.
Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị, nke na-ata ata nʼihi okpomọkụ.
18 Misafara hugeuka kutoka njia zake; hukwea kwenda kwenye nchi ya ukiwa na kuangamia.
Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha. Ha na-arịgo nʼala akọrọ si otu a laa nʼiyi.
19 Misafara ya Tema inatafuta maji, wafanyabiashara wa Sheba wanaosafiri hutazama kwa matarajio.
Ndị ije si Tema na-ele anya mmiri, otu a kwa ndị ahịa Sheba na-ele anya nʼolileanya.
20 Wamedhikika, kwa sababu walikuwa na matumaini; wanafika huko, lakini wanahuzunika kwa kukosa walichotarajia.
Obi mgbu na-ejide ha nʼihi na ha nwere ntụkwasị obi, ha bịarutere ebe ahụ, bụrụ ndị emenyere ihere.
21 Sasa nanyi mmethibitika kwamba hamna msaada wowote; mnaona jambo la kutisha, nanyi mnaogopa.
Ma ugbu a, unu egosila na unu abaghị uru, unu ahụla ihe na-eyi egwu ma ụjọ ejidela unu.
22 Je, nimewahi kusema, ‘Toeni kitu kwa ajili yangu, au mnilipie fidia kutoka mali zenu,
O nweela mgbe m sịrị unu, ‘Nyenụ ihe ọbụla nʼọnọdụ m, sitenụ nʼakụnụba unu kwụọ ụgwọ ịgbapụta m,
23 au niokoeni mikononi mwa adui, au nikomboeni kutoka makucha ya wasio na huruma’?
gbapụtanụ m nʼaka ndị iro, maọbụ napụtanụ m nʼaka ndị na-enweghị obi ebere’?
24 “Nifundisheni, nami nitanyamaza kimya; nionyesheni nilikokosea.
“Zienụ m ihe ga-eme ka m mechie ọnụ, gosi m ebe m si mejọọ.
25 Tazama yalivyo ya kuumiza maneno ya kweli! Lakini mabishano yenu yanathibitisha nini?
Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi! Ma gịnị ka ịrụ ụka unu na-ewepụta?
26 Je, mna maana ya kuyasahihisha ninayosema, na kuyafanya maneno ya mtu anayekata tamaa kama upepo?
Ị chọrọ idozi okwu ọnụ m? Si otu a mee ka okwu onye ike gwụrụ ghọọ ikuku efu?
27 Mngeweza hata kupiga kura kwa ajili ya yatima, na kubadilishana rafiki yenu na mali.
Unu nwere ike ife nza nʼisi onye na-enweghị nna, ma refukwaa enyi unu.
28 “Lakini sasa kuweni na huruma mkaniangalie mimi. Je, ningeweza kusema uongo mbele zenu?
“Lezie m anya nke ọma, ọ dị unu ka m nwere ike ilegide unu anya gwa unu okwu ụgha?
29 Tulizeni hasira, msiwe wadhalimu; angalieni tena, kwa maana nimehatarisha uadilifu wangu.
Kwụsịnụ ihe unu na-eme. Unu abụla ndị na-eme ihe na-ezighị ezi, tuleenụ ihe unu na-eme, nʼihi na ezi omume m ka guzosiri ike.
30 Je, pana uovu wowote midomoni mwangu? Je, kinywa changu hakiwezi kupambanua hila?
Ọ dị ihe ọjọọ si nʼegbugbere ọnụ m abụọ pụta? Ọ bụ na ọnụ m apụghị ịchọpụta nzube iro?