< Ayubu 34 >
2 “Sikieni maneno yangu, enyi watu wenye hekima; nisikilizeni mimi, ninyi watu wenye maarifa.
“Nụrụ okwu m, unu ndị amamihe; gee m ntị unu ndị ikom nwere mmụta.
3 Kwa kuwa sikio huyajaribu maneno kama vile ulimi uonjavyo chakula.
Ntị na-anwale okwu dịka ire si anụ ụtọ ihe oriri.
4 Tujichagulie wenyewe yaliyo sawa, nasi tujifunze pamoja yaliyo mema.
Ka anyị chọpụtara onwe anyị ihe ziri ezi; ka anyị nọkọta mụta ihe dị mma.
5 “Ayubu anasema, ‘Mimi sina hatia, lakini Mungu ameninyima haki yangu.
“Job na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume, ma Chineke na-anapụ m ikpe ziri ezi.
6 Ingawa niko sawa, ninaonekana mwongo; nami ingawa sina kosa, kidonda changu hakiponi.’
Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha ma a na-ahụta m dịka onye ụgha; ọ bụ eziokwu na ikpe amaghị m ma ọnya na-enweghị ngwọta ka àkụ ya na-enye m.’
7 Ni mtu gani aliye kama Ayubu, anywaye dharau kama maji?
Olee nwoke dịka Job, nke na-aṅụ ịkwa emo dịka mmiri?
8 Ashirikianaye na watenda mabaya na kuchangamana na watu waovu.
Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi, ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe.
9 Kwa kuwa anasema, ‘Haimfaidi mwanadamu kitu chochote anapojitahidi kumpendeza Mungu.’
Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị ya na mmadụ na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.’
10 “Hivyo nisikilizeni mimi, ninyi watu wenye ufahamu. Kamwe Mungu hatendi uovu, Mwenyezi hafanyi kosa.
“Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta. Ya bụrụ ihe dị anya nʼebe Chineke nọ, bụ ime ajọ omume, bụrụkwa ihe dị anya nʼebe Onye pụrụ ime ihe niile nọ, bụ ime ihe na-ezighị ezi.
11 Humlipa mwanadamu kwa ajili ya lile alilotenda; huleta juu yake kile ambacho matendo yake yanastahili.
Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị, ọ na-ewetara mmadụ dịka omume ya kwesiri.
12 Ni jambo lisiloweza kufikiriwa kwamba Mungu angefanya makosa, kwamba Mwenyezi angepotosha hukumu.
Ọ bụ ihe a na-ekwesighị iche nʼuche na Chineke pụrụ ime ihe na-ezighị ezi, na Onye pụrụ ime ihe niile ga-ekpe ikpe nʼezighị ezi.
13 Je, ni nani aliyemtawaza juu ya dunia? Ni nani aliyemweka kuwa mwangalizi wa ulimwengu wote?
Onye họpụtara ya ịchị ụwa? Onye mere ya onye nlekọta ụwa niile?
14 Kama lilikuwa kusudi la Mungu, naye akaiondoa Roho yake na pumzi yake,
Ọ bụrụ na ọ bụ ebumnuche ya iweghachi mmụọ ya na nkuume ya,
15 wanadamu wote wangeliangamia kwa pamoja, na mtu angerudi mavumbini.
mmadụ niile ga-alakọta nʼiyi, mmadụ niile ga-alaghachikwa nʼaja.
16 “Kama ninyi mnaufahamu, sikieni hili; sikilizeni hili nisemalo.
“Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a; gee ntị nʼokwu m.
17 Je, yeye aichukiaye haki aweza kutawala? Je, utamhukumu mwenye haki, Aliye na Nguvu Zote?
Ọ pụrụ ịchị bụ onye ahụ kpọrọ ikpe ziri ezi asị? Ị ga-ama Onye ezi omume na onye dị ike ikpe?
18 Je, si ni yeye awaambiaye wafalme, ‘Ninyi hamfai kitu,’ nao watu mashuhuri, ‘Ninyi ni waovu,’
Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’ ma na-agwakwa ndị a mara aha ha sị, ‘Unu bụ ndị ajọ omume.’
19 yeye asiyependelea wakuu, wala haonyeshi upendeleo kwa matajiri kuliko maskini, kwa kuwa wote ni kazi ya mikono yake?
Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide nye ụmụ ndị ikom eze, onye na-adịghị emenyere ndị ọgaranya, ma megbuo ndị ogbenye, nʼihi na ha niile bụ ọrụ aka ya.
20 Wanakufa ghafula, usiku wa manane; watu wanatikiswa nao hupita; wenye nguvu huondolewa bila mkono wa mwanadamu.
Nʼotu ntabi anya, ha na-anwụ nʼime etiti abalị; ndị ahụ na-ama jijiji ma gabiga; a na-ewezugakwa ndị dị ike ma ọ bụghị site nʼaka mmadụ.
21 “Macho yake yanazitazama njia za wanadamu; anaona kila hatua yao.
“Anya ya na-elekwasị ụzọ niile nke ụmụ mmadụ; ọ na-ahụkwa nzọ ụkwụ ha niile.
22 Hakuna mahali penye giza nene, wala uvuli mkubwa, ambapo watenda mabaya wanaweza kujificha.
Ọ dịghị ọchịchịrị dị, ọ dịghịkwa oke ọchịchịrị dị, ebe ndị na-eme ajọ ihe pụrụ izo.
23 Mungu hana haja ya kumchunguza mtu sana, ili apate kuja mbele zake kwa hukumu.
Ọ dịghị mkpa ọ dịịrị Chineke ịga nʼihu inyocha ụmụ mmadụ, nke mere na ha ga-abịa nʼihu ya maka ikpe ikpe.
24 Bila kuuliza huwapondaponda wenye nguvu nyingi na kuwaweka wengine mahali pao.
Na-ajụghị ajụjụ Chineke na-akụtu ndị a maara aha ha ma were ndị ọzọ dochie nʼọnọdụ ha.
25 Kwa sababu huyaangalia matendo yao yote, huwaondoa usiku, nao wakaangamia.
Nʼihi na ọ na-agụkọ ọrụ ha niile, ọ na-achụpụ ha nʼabalị mee ka ha ghọọ ndị e gwepịara egwepịa.
26 Anawaadhibu kwa ajili ya uovu wao mahali ambapo kila mmoja ataweza kuwaona,
Nʼebe mmadụ niile ga-ahụ ha ka ọ na-ata ha ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,
27 kwa sababu wameacha kumfuata Mungu, nao hawakuiheshimu njia yake hata moja.
nʼihi na ha sitere nʼiso ya wezuga onwe ha, ha enweghịkwa uche ilebanye anya nʼụzọ ya ọbụla.
28 Wamesababisha kilio cha maskini kifike mbele zake, hivyo akasikia kilio cha wahitaji.
Ha mere ka iti mkpu akwa nke ndị ogbenye ruo ya ntị, nke mere na ọ nụrụ akwa ndị nọ na mkpa.
29 Lakini kama akinyamaza kimya, ni nani awezaye kumhukumu? Kama akiuficha uso wake, ni nani awezaye kumwona? Ikiwa ni taifa au mtu mmoja, kwake ni sawa,
Ma ọ bụrụ na ọ gba nkịtị, onye ga-ama ya ikpe? Ọ bụrụ na o zoo ihu ya, onye pụrụ ịhụ ya? Ma ya onwe ya na-achị isi nʼebe mmadụ na mba nọ,
30 ili kumzuia mtu mwovu kutawala, au wale ambao huwategea watu mitego.
igbochi nwoke na-adịghị atụ egwu Chineke ịchị obodo, ka ọ gharakwa ịbụ ihe ọnya nye ndị mmadụ.
31 “Kama mwanadamu akimwambia Mungu, ‘Nimekosa lakini sitatenda dhambi tena.
“Ọ bụrụ na mmadụ a sị Chineke, ‘Abụ m onye ikpe mara ma agaghị m emehie kwa ọzọ.
32 Nifundishe nisichoweza kuona; kama nimekukosea, sitafanya hivyo tena.’
Biko, zi m ihe ndị ahụ m na-apụghị ịhụ; ọ bụrụ na m emehiela, agaghị m emekwa ya ọzọ.’
33 Je basi, Mungu atakulipa kwa masharti yako, wakati wewe umekataa kutubu? Yakupasa wewe uamue, wala si mimi; sasa niambie lile ulijualo.
Chineke ọ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ site na mkpebi gị mgbe ị jụrụ ichegharị? Gị onwe gị ga-ekpebi, ọ bụghị mụ; ya mere gwa m ihe ị mara.
34 “Wanadamu wenye ufahamu husema, wenye hekima wanaonisikia huniambia,
“Ndị ikom ndị nwere nghọta na-ekwu si, ndị amamihe nụrụ okwu m na-asị m,
35 ‘Ayubu huongea bila maarifa; maneno yake hayana busara.’
‘Job na-ekwu okwu dịka onye na-amaghị ihe; okwu ya dị ka nke onye na-enweghị uche.’
36 Laiti Ayubu angejaribiwa hadi kikomo cha mwisho, kwa sababu anajibu kama mtu mwovu!
Ọ ga-adị nnọọ mma ma a sị na a nwaa Job ruo nsọtụ maka ọsịsa ya dịka nke ajọ mmadụ!
37 Kwenye dhambi yake huongeza uasi; kwa dharau hupiga makofi miongoni mwetu, na kuzidisha maneno yake dhidi ya Mungu.”
Ọ na-atụkwasị nnupu isi nʼelu mmehie ya; na-akụ aka nʼetiti anyị nʼụzọ ịkwa emo, ma werekwa okwu nkwulu bara ụba megide Chineke.”