< Isaya 21 >
1 Neno kuhusu Jangwa kando ya Bahari: Kama upepo wa kisulisuli unaopita katika nchi hadi kusini, mshambuliaji anakuja kutoka jangwani, kutoka nchi inayotisha.
Amụma megide ọzara nke dị nʼakụkụ oke osimiri: Dịka oke ifufe si nʼọzara Negeb na-efebiga, ka onye na-eme ihe ike ga-esi nʼọzara bịa, site nʼala nke oke egwu.
2 Nimeonyeshwa maono ya kutisha: Msaliti anasaliti, mteka nyara anateka nyara. Elamu, shambulia! Umedi, izunguke kwa jeshi! Nitakomesha huzuni zote alizosababisha.
Ahụrụ m ọhụ dị egwu, ọhụ oke mbibi, na ọhụ oke nrara nye nʼaka ndị mbibi, nʼebe onye na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-akwakọta ngwongwo. Bilienụ unu ndị agha Elam, buonu agha! Unu ndị agha Midia, gbaanụ obodo gburugburu! Aga m eme ka ịsụ ude na mmegbu niile kwụsị.
3 Katika hili mwili wangu umeteswa na maumivu, maumivu makali ya ghafula yamenishika, kama yale ya mwanamke mwenye utungu wa kuzaa. Nimeduwazwa na lile ninalolisikia, nimeshangazwa na lile ninaloliona.
Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu, oke ihe mgbu zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme. Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ, ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya.
4 Moyo wangu unababaika, woga unanifanya nitetemeke, gizagiza la jioni nililolitamani sana, limekuwa hofu kuu kwangu.
Obi m anọkwaghị jụụ, oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu; chi ojiji nke m na-ele anya ya aghọọlara m ihe ịma jijiji.
5 Wanaandaa meza, wanatandaza mazulia, wanakula, wanakunywa! Amkeni, enyi maafisa, zitieni ngao mafuta!
Ha na-akwado tebul. Ha na-edozi ute ịnọdụ ala, ha na-eri, ha na-aṅụ. Bilienụ ndịisi agha, teekwanụ ọta niile mmanụ!
6 Hili ndilo Bwana analoniambia: “Nenda, weka mlinzi, na atoe taarifa ya kile anachokiona.
Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzobe onye nche, ka o kwuo ihe ọ na-ahụ.
7 Anapoona magari ya vita pamoja na kundi la farasi, wapanda punda au wapanda ngamia, na awe macho, awe macho kikamilifu.”
Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha, na usuu ịnyịnya, na ndị na-agba ịnyịnya ibu, maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ, gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma, nọọkwa na njikere.”
8 Naye mlinzi alipaza sauti, “Mchana baada ya mchana, bwana wangu, ninasimama katika mnara wa ulinzi, kila usiku ninakaa mahali pangu nilipoamriwa.
Onye nche na-elepụ anya tiri mkpu dịka ọdụm, sị, “Onyenwe m, nʼehihie ụbọchị niile ka m na-eguzo nʼelu ụlọ nche, nʼọnọdụ nche m ka m na-eguzokwa abalị niile.
9 Tazama, yuaja mtu anayepanda gari la vita pamoja na kundi la farasi. Naye anajibu: ‘Babeli umeanguka, umeanguka! Vinyago vyote vya miungu yake vimelala chini vikiwa vimevunjwa!’”
Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa, ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ. O nyeghachiri ọsịsa ahụ, ‘Babilọn adaala, e ọ daala, arụsị niile apịrị apị nke chi ya niile a kurisiela tọgbọrọ nʼala.’”
10 Ee watu wangu, mliopondwa kwenye sakafu ya kupuria, ninawaambia kile nilichokisikia kutoka kwa Bwana Mwenye Nguvu Zote, kutoka kwa Mungu wa Israeli.
O, ndị m, ndị a zọchara azọcha, dịka ọka a zọchara nʼebe ịzọcha ọka, agwala m unu ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru.
11 Neno kuhusu Duma: Mtu fulani ananiita kutoka Seiri, “Mlinzi, usiku utaisha lini? Mlinzi, usiku utaisha lini?”
Nke a bụ amụma megide Duma: Otu onye si na Sia na-akpọ m oku, “Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ? Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?”
12 Mlinzi anajibu, “Asubuhi inakuja, lakini pia usiku. Kama ungeliuliza, basi uliza; bado na urudi tena.”
Onye nche zara sị, “Chi ọbụbọ na-abịa, abalị na-abịakwa. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịjụ ajụjụ, jụọnụ ajụjụ, ma laghachikwa ọzọ.”
13 Neno kuhusu Arabia: Enyi misafara ya Wadedani, mnaopiga kambi katika vichaka vya Arabia,
Amụma megide Arebịa: Unu ndị ije niile nke Dedan, ndị na-anọ ọnọdụ abalị nʼoke ọhịa nke Arebịa,
14 leteni maji kwa wenye kiu, ninyi mnaoishi Tema, leteni chakula kwa ajili ya wakimbizi.
kuterenụ ndị ahụ bịakwutere unu akpịrị na-akpọ nkụ mmiri ọṅụṅụ; unu ndị bi nʼala Tema, buterenụ ndị gbakwutere unu ọsọ ndụ nri.
15 Wanaukimbia upanga, kutoka upanga uliochomolewa alani, kutoka upinde uliopindwa, na kutoka kwenye joto la vita.
Nʼihi na ọ bụ site nʼagha nke e ji mma agha egbu ndị mmadụ, na agha e ji akụ agbatu mmadụ ka ha si na-agbapụ ọsọ.
16 Hili ndilo Bwana analoniambia: “Katika muda wa mwaka mmoja, kama vile mtumishi aliyefungwa na mkataba angeihesabu, majivuno yote ya Kedari yatafikia mwisho.
Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị m, “Tupu otu afọ agwụ, dị ka esi agụ afọ onye ohu e goro ọrụ, ịma mma Keda ga-agwụsị.
17 Wanaume wavutao pinde walionusurika, mashujaa wa Kedari, watakuwa wachache.” Bwana, Mungu wa Israeli, amesema.
Ndị fọdụrụ ndụ nʼime ndị na-agba ụta, ndị bụ dike nʼagha na Keda, ga-adị mmadụ ole na ole.” Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel ekwuola ya.