< Mwanzo 32 >
1 Yakobo pia akaondoka akaenda zake, nao malaika wa Mungu wakakutana naye.
Jekọb nʼonwe ya hapụrụ gawa nʼihu nʼije ya. Ndị mmụọ ozi Chineke zutere ya nʼụzọ.
2 Yakobo alipowaona, akasema, “Hii ni kambi ya Mungu!” Kwa hiyo akapaita mahali pale Mahanaimu.
Mgbe Jekọb hụrụ ha, o kwuru sị, “Ebe a bụ ụlọ ikwu Chineke!” Ọ kpọrọ ebe ahụ, Mahanaim.
3 Yakobo akatuma wajumbe kumtangulia kwa Esau ndugu yake huko Seiri, katika nchi ya Edomu.
Mgbe ahụ, Jekọb zipụrụ ndị ozi ka ha jee hụ Ịsọ nwanne ya nwoke nʼala Sia, nʼobodo Edọm.
4 Akawaagiza akisema: “Hili ndilo mtakalomwambia bwana wangu Esau: ‘Mtumishi wako Yakobo anasema, nimekuwa nikiishi pamoja na Labani na nimekuwako huko mpaka sasa.
O ziri ha ozi sị, “Ihe a bụ ihe unu ga-agwa nna m ukwu Ịsọ, ‘Odibo gị Jekọb kwuru sị, Ọ bụ na nke Leban ka m jere kemgbe, ọ bụkwa ebe ahụ ka m nọ ruo ugbu a.
5 Ninao ngʼombe na punda, kondoo na mbuzi, watumishi wa kiume na wa kike. Sasa ninatuma ujumbe huu kwa bwana wangu, ili nipate kibali machoni pako.’”
Enwere m ọtụtụ ehi, na ịnyịnya ibu, na igwe atụrụ na ewu, na ndị odibo ndị nwoke na ndị nwanyị. Ana m ezigara onyenwe m ozi a ka m nata ihuọma nʼebe ọ nọ.’”
6 Wajumbe waliporudi kwa Yakobo, wakamwambia, “Tulikwenda kuonana na ndugu yako Esau, naye sasa anakuja kukulaki akifuatana na wanaume 400.”
Mgbe ndị ozi ahụ lọghachikwutere Jekọb, ha gwara ya sị ya, “Anyị jekwuru nwanne gị nwoke Ịsọ dị ka i ziri anyị. Ugbu a, ọ na-abịa. Ọ chị narị ndị ikom anọ na-abịa izute gị.”
7 Kwa hofu kuu na huzuni, Yakobo akagawanya watu aliokuwa nao katika makundi mawili, pia akagawanya makundi ya kondoo na mbuzi, na vilevile ngʼombe na ngamia.
Ụjọ tụrụ Jekọb nke ukwuu, obi ya jupụtakwara na nsogbu. Nʼihi nke a, o kewara ndị niile so ya ụzọ abụọ, tinyere anụ ụlọ ya, na igwe ehi ya na ịnyịnya kamel ya.
8 Yakobo alifikiri, “Kama Esau akija na kushambulia kundi moja, kundi lililobaki litaweza likanusurika.”
O chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na Ịsọ alụso otu nʼime ụzọ abụọ a ọgụ, otu ụzọ fọdụrụ ga-enwe ike gbalaga.”
9 Ndipo Yakobo akaomba, “Ee Mungu wa baba yangu Abrahamu, Mungu wa baba yangu Isaki, Ee Bwana, ambaye uliniambia, ‘Rudi katika nchi yako na jamaa yako, nami nitakufanya ustawi,’
Mgbe ahụ, Jekọb kpere ekpere sị, “Chineke nke nna m Ebraham, Chineke nke nna m Aịzik, Onyenwe anyị, gị onye gwara m sị, ‘Laghachi nʼala gị na nʼebe ụmụnna gị nọ, aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma.’
10 mimi sistahili fadhili na uaminifu wako wote ulionitendea mimi mtumishi wako. Nilikuwa na fimbo tu mkononi mwangu nilipovuka mto huu wa Yordani, lakini sasa ninayo makundi mawili.
Ekwesighị m obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi nke i gosiri ohu gị. Mgbe m gabigara Jọdan a, enweghị m ihe ọbụla karịa mkpanaka m, ma ugbu a, abụ m ọmụma ụlọ ikwu abụọ.
11 Nakuomba, uniokoe na mkono wa ndugu yangu Esau, kwa maana ninaogopa kuwa atakuja kunishambulia, pia mama pamoja na watoto wao.
Zọpụta m, arịọ m gị, site nʼaka nwanne m Ịsọ, nʼihi na egwu na-atụ m na ọ ga-abịa lụso m agha, lụsokwa ndị nne a na ụmụntakịrị ha agha.
12 Lakini umeshasema, ‘Hakika nitakufanya ustawi na kuufanya uzao wako kuwa mwingi kama mchanga wa baharini ambao hauwezi kuhesabika!’”
Ọ bụ gị kwuru sị, ‘Aga m eme ka ihe gaara gị nke ọma, meekwa ka ụmụ ụmụ gị dịrị ka aja nke dị nʼọnụ osimiri, nke mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ.’”
13 Akalala pale usiku ule, miongoni mwa vitu alivyokuwa navyo, akachagua zawadi kwa ajili ya Esau ndugu yake:
Jekọb rahụrụ nʼebe ahụ nʼabalị ahụ. Site nʼihe niile o nwere, ọ họpụtara onyinye ọ ga-enye nwanne ya Ịsọ.
14 Mbuzi waume ishirini na mbuzi wake 200, kondoo dume ishirini na kondoo wake 200.
Ọ kwadoro inye ya: narị nne ewu abụọ, iri mkpi abụọ, narị nne atụrụ abụọ, iri ebule abụọ
15 Ngamia wake thelathini pamoja na ndama zao, ngʼombe wake arobaini na mafahali kumi, punda wake ishirini na punda waume kumi.
Iri nne ịnyịnya kamel atọ na ụmụ ha, na iri nne ehi anọ, oke ehi iri, iri nne ịnyịnya ibu abụọ, oke ịnyịnya ibu iri.
16 Akaviweka chini ya uangalizi wa watumishi wake, kila kundi peke yake na kuwaambia, “Nitangulieni na kuacha nafasi kati ya makundi.”
O weere onyinye ndị a niile nyefee nʼaka ndị ozi ya nʼusoro dịka ụdị ha si dị. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị ha, “Burunu ụzọ na-aga, meenụ ka ohere dị nʼetiti igwe anụ na igwe ibe ya.”
17 Akamwagiza yule aliyetangulia kuwa, “Ndugu yangu Esau atakapokutana nawe na kukuuliza, ‘Wewe ni wa nani? Unakwenda wapi? Wanyama hawa wote mbele yako ni mali ya nani?’
O nyere onye mbụ iwu sị ha, “Mgbe Ịsọ nwanne m zutere unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Onye bụ nna unu ukwu? Ebee ka unu na-aga? Onye nwe anụ ụlọ ndị a niile unu chị na-aga?’
18 Ndipo utakaposema, ‘Ni mali ya mtumishi wako Yakobo. Ni zawadi ambazo zimetumwa kwa bwana wangu Esau, naye anakuja nyuma yetu.’”
Unu ga-aza sị ya, ‘Anụ ụlọ ndị a bụ nke ohu gị Jekọb. Ha bụ onyinye e zitere onyenwe m Ịsọ, lee ka ọ na-abịa nʼazụ anyị.’”
19 Akamwagiza pia yule mtumishi wa kundi la pili, la tatu na yale mengine yote yaliyofuata akiwaambia, “Mtamwambia Esau maneno hayo hayo mtakapokutana naye.
Otu ozi ahụ ka Jekọb ziri onye nke abụọ na onye nke atọ, na ndị ọzọ niile chị igwe anụ ụlọ, sị ha, “Unu ga-agwa Ịsọ otu ihe ahụ mgbe unu zutere ya.
20 Hakikisheni mmesema, ‘Mtumishi wako Yakobo anakuja nyuma yetu.’” Kwa kuwa alifikiri, “Nitaweza kumtuliza kwa zawadi hizi ninazotanguliza, hatimaye, nitakapomwona, huenda atanikubali.”
Hụkwanụ na unu gwara ya sị, ‘Ohu gị Jekọb nọ nʼazụ anyị.’” Echiche ya bụ, “Aga m eji onyinye ndị a niile m na-ezipụrụ ya mee ka obi ya dajụọ, nke ọ ga-abụ mgbe mụ na ya zutere, ma eleghị anya, ọ ga-anabata m.”
21 Kwa hiyo zawadi za Yakobo zilitangulia mbele yake, lakini yeye mwenyewe alilala kambini usiku ule.
Mgbe o zipụchasịrị onyinye ndị ahụ niile, Jekọb rahụrụ ụra nʼụlọ ikwu ya nʼabalị ahụ.
22 Usiku ule Yakobo akaamka akawachukua wake zake wawili, watumishi wake wawili wa kike na wanawe kumi na mmoja na akavuka kivuko cha Yaboki.
Nʼabalị ahụ, Jekọb biliri duru ndị nwunye ya abụọ na ndị odibo nwanyị ya abụọ, na ụmụ ya iri na otu, site nʼebe na-adịghị omimi nke iyi Jabọk kpọfee ha.
23 Baada ya kuwavusha ngʼambo ya kijito, alivusha pia mali zake zote.
Mgbe ọ kpọfechara ha, o bufekwara ihe niile o nwere.
24 Kwa hiyo Yakobo akaachwa peke yake na mtu mmoja akashikana naye mweleka mpaka mapambazuko.
Emesịa, Jekọb lọghachiri nọdụ naanị ya. Mgbe ahụ, otu nwoke bịara gbaso ya mgba. Ha abụọ gbagidere mgba a tutu chi ebido ịbọ.
25 Yule mtu alipoona kuwa hawezi kumshinda, aligusa kiungio cha nyonga ya Yakobo kwa hiyo nyonga yake ikateguka wakati alipokuwa akishikana mweleka na yule mtu.
Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọ pụghị imeri Jekọb na mgba ahụ, o tiri Jekọb aka nʼọkpụ, mee ka ọkpụ ya hịkwapụ site nʼọnọdụ ya.
26 Ndipo yule mtu akasema, “Niache niende, kwa kuwa ni mapambazuko.” Lakini Yakobo akajibu, “Sitakuacha uende usiponibariki.”
Mgbe nke a mesịrị, nwoke ahụ gwara Jekọb sị ya: “Hapụ m aka ka m laa, nʼihi na chi ebidola ịbọ.” Ma Jekọb zara sị ya, “Ọ bụ naanị mgbe ị gọziri m ka m ga-ahapụ gị ka ị laa.”
27 Yule mtu akamuuliza, “Jina lako nani?” Akajibu, “Yakobo.”
Mgbe ahụ nwoke ahụ jụrụ Jekọb ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Aha m bụ Jekọb.”
28 Ndipo yule mtu akasema, “Jina lako halitakuwa tena Yakobo, bali Israeli, kwa sababu umeshindana na Mungu na watu pia, nawe umeshinda.”
Nwoke ahụ zara sị ya, “Aha gị agaghị abụkwa Jekọb, kama ọ ga-abụ Izrel, nʼihi na gị na Chineke na ndị mmadụ gbara mgba, ị mmeri.”
29 Yakobo akasema, “Tafadhali niambie jina lako.” Lakini akajibu, “Kwa nini kuniuliza Jina langu?” Ndipo akambariki huko.
Jekọb sịrị, “Biko gwa m aha gị.” Ma ọ zaghachiri, “Gịnị mere ị ji ajụ aha m?” Mgbe ahụ, ọ gọziri ya nʼebe ahụ.
30 Kwa hiyo Yakobo akapaita mahali pale Penieli, akasema, “Ni kwa sababu nimemwona Mungu uso kwa uso na bado maisha yangu yameokoka.”
Jekọb kpọrọ aha ebe ahụ Peniel, nʼihi na ọ sịrị, “Ahụla m Chineke ihu na ihu, ma e chebere ndụ m.”
31 Jua lilikuwa linachomoza Yakobo alipoondoka Penueli, naye alikuwa akichechemea kwa sababu ya nyonga yake.
Anyanwụ awaala mgbe Jekọb si Peniel gafee. Ma nʼihi ihe mere ya nʼọkpụ, ọ naghị agazikwa ije.
32 Kwa hiyo mpaka leo Waisraeli hawali mshipa ulioungana na kiungio cha nyonga, kwa sababu kiungio cha nyonga ya Yakobo kiliteguliwa karibu na mshipa huo.
Ọ bụ ihe a mere ụmụ Izrel adịghị eri akwara anụ jikọtara ukwu anụ na ọkpụ ya ruo taa. Nʼihi na ihe ahụ mere Jekọb metụtara akwara ukwu ya.