< Ezekieli 45 >
1 “‘Mtakapogawa nchi kuwa urithi, mtaitoa sehemu ya nchi kwa Bwana kuwa eneo takatifu, urefu wake dhiraa 25,000, upana wake dhiraa 20,000 eneo hili lote litakuwa takatifu.
“‘Mgbe unu ga-eke ala ahụ dịka ihe nketa, unu ga-ebu ụzọ nye Onyenwe anyị otu oke nʼime ya ka ọ bụrụ oke dị nsọ nke ala ahụ. Ogologo ya ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita iri na otu. Ihe dị nsọ ka ala ahụ niile ga-abụ gbaa gburugburu.
2 Katika hiyo, itakuwepo sehemu mraba ambayo ni mahali patakatifu kila upande dhiraa 500 ikiwa imezungukwa na eneo la wazi lenye upana wa dhiraa hamsini.
Site nʼala, otu akụkụ dị narị mita abụọ na iri itoolu na otu, na iri sentimita asaa na ise, ga-abụ maka ebe nsọ. A ga-ahapụ ala dị iri mita abụọ na itoolu gburugburu ya.
3 Katika eneo takatifu, pima sehemu yenye urefu wa dhiraa 25,000 na upana wa dhiraa 10,000. Ndani ya hilo eneo kutakuwa mahali patakatifu, Patakatifu pa Patakatifu.
Site nʼoke ebe ahụ dị nsọ, tụpụta oke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, obosara ya kilomita ise na ọkara. Ọ bụ nʼime ya ka ebe nsọ, ya bụ Ebe ahụ Kachasị Nsọ ga-adị.
4 Itakuwa sehemu takatifu ya nchi kwa ajili ya makuhani, wale wanaohudumu ndani ya mahali patakatifu na ambao hukaribia ili kuhudumu mbele za Bwana. Patakuwa mahali pa nyumba zao pamoja na sehemu kwa ajili ya mahali patakatifu.
Ọ ga-abụ oke ala ndị nchụaja, ndị na-eje ozi nʼebe nsọ, na ndị na-abịa nso ije ozi nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-abụkwa ebe ụlọ obibi ha ga-adị, bụrụkwa ebe dị nsọ maka ebe nsọ ahụ.
5 Eneo la urefu wa dhiraa 25,000 na upana wa dhiraa 10,000 litakuwa la Walawi wale wanaotumika hekaluni, kama milki yao kwa ajili ya miji ya kuishi.
Ala ọzọ dị ya nʼakụkụ, nke ga-adị kilomita iri na atọ nʼogologo, kilomita ise na ọkara nʼobosara ya, ga-abụ ebe obibi ndị Livayị, ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwuu ahụ.
6 “‘Utatoa mji kama mali yao wenye upana wa dhiraa 5,000 na urefu wa dhiraa 25,000, karibu na sehemu takatifu, itakuwa mali ya nyumba yote ya Israeli.
“‘Nʼakụkụ obodo nsọ ka a ga-ekewapụta ala nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dịkwa kilomita abụọ na ọkara, nke a ga-abụ nke ndị Izrel.
7 “‘Mkuu anayetawala atakuwa na lile eneo linalopakana na lile eneo lililowekwa wakfu upande huu na upande huu na eneo la mji. Eneo la mji litaenea upande wa magharibi kuanzia upande wa magharibi na upande wa mashariki kuanzia upande wa mashariki, likiendelea kwa urefu kutoka magharibi hadi mpaka wa mashariki sambamba na mojawapo ya sehemu za makabila.
“‘A ga-ewepụta ala pụrụ iche maka nwa eze. Ala a ga-adị nʼakụkụ abụọ nke ala nsọ ahụ, na obodo ahụ. Ala a ga-agbatịrị site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ebe oke ya dị ruo nʼosimiri Mediterenịa. Ọ ga-esitekwa nʼoke ala ya nʼọwụwa anyanwụ gbatịrị ruo nʼebe ebo Izrel nwere ala ha. Nʼụzọ dị otu a, ala a ga-aha ka ala ebo Izrel ketara.
8 Nchi hii itakuwa milki yake katika Israeli. Nao wakuu wangu hawataonea tena watu wangu bali watairuhusu nyumba ya Israeli kuimiliki nchi kulingana na makabila yao.
Ala a ga-abụrụ ya ihe nketa nʼIzrel. Ndịisi m agaghị emegbu ndị m ọzọ, ma ha ga-ahapụ ndị Izrel ka ha keta ala ndị a dịka ebo niile ha si dị.
9 “‘Hili ndilo Bwana Mwenyezi asemalo: Yatosha, enyi wakuu wa Israeli! Acheni mbali ukatili wenu na uonevu wenu mkafanye lile lililo haki na sawa. Acheni kuwatoza watu wangu isivyo haki, asema Bwana Mwenyezi.
“‘Nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: O zuolara unu, unu ụmụ ndị eze Izrel. Kwụsịnụ ịpụnara ndị m ihe ha nwere nʼike, kpeenụ ikpe ziri ezi na-emekwa ihe kwesiri ekwesi. Kwụsịnụ ịchụpụ ndị m site nʼihe ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
10 Tumieni mizani sahihi na vipimo sahihi vya efa na bathi.
Ka ihe ọtụtụ unu ji ere ahịa unu bụrụ ezigbo efa na ezigbo baf nke a na-ejighị aghụghọ kpụọ.
11 Efa na bathi viwe sawa, bathi iwe sehemu ya kumi ya homeri na efa iwe sehemu ya kumi ya homeri, homeri itakuwa ndicho kiwango cha kukubalika kwa vyote viwili.
Ka ihe ọtụtụ homa bụrụ ihe unu ga-eji na-atụ ihe niile, ma mmanụ, ma ọka. Ihe ọtụtụ ndị ọzọ unu ga-enwe ga-abụ efa, nke bụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke homa, maka ịtụ ihe dịka ọka. Nke ọzọ bụ baf, nke bụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke homa, maka ịtụ ihe dịka mmanụ.
12 Shekeli moja itakuwa gera ishirini. Shekeli ishirini, jumlisha na shekeli ishirini na tano, jumlisha na shekeli kumi na tano zitakuwa mina moja.
Ihe ọtụtụ a ga-eji mata ịdị arọ nke ihe ọbụla ga-abụ shekel. Ihe a ga-eji gbanwere shekel a bụ iri gera abụọ naanị. Iri shekel isii ka a ga-ejikwa gbanwere otu mina.
13 “‘Hili ndilo toleo maalum mtakalotoa: moja ya sita ya efa kutoka kila homeri ya ngano na moja ya sita ya efa kutoka kila homeri ya shayiri.
“‘Nke a bụ onyinye pụrụ iche unu ga-enye: otu ụzọ nʼụzọ isii nke efa, site nʼotu homa nke ọka wiiti unu. Unu ga-enyekwa otu ụzọ nʼụzọ isii nke efa site nʼotu homa ọka balị unu.
14 Sehemu ya mafuta iliyoamriwa, yaliyopimwa kwa bathi, ni sehemu ya kumi ya bathi kutoka kila kori moja (ambayo ina bathi kumi au homeri moja.)
Dịka e nyere ya nʼiwu, unu ga-eji ihe ọtụtụ baf, weta mmanụ oliv bụ otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼotu kọ ọbụla (kọ na-erita baf iri, nʼihi na baf iri, bụ ọtụtụ otu homa).
15 Pia kondoo mmoja atachukuliwa kutoka kwenye kila kundi la kondoo mia mbili kutoka kwenye malisho yaliyonyeshewa vizuri ya Israeli. Hivi vitatumika kwa ajili ya sadaka ya nafaka, sadaka ya kuteketezwa na sadaka za amani ili kufanya upatanisho kwa ajili ya watu, asema Bwana Mwenyezi.
Ọzọkwa, otu atụrụ nke sitere nʼigwe atụrụ dị narị atụrụ abụọ, nke si nʼebe ịta nri nke Izrel a gbara mmiri nke ọma ka unu ga-eweta. A ga-eji ndị a chụọ aja mkpụrụ ọka, na aja nsure ọkụ, na aja udo, maka ikpuchiri ndị wetara ha mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
16 Watu wote wa nchi wataungana pamoja na mkuu anayetawala Israeli ili kutoa hii sadaka maalum.
Ndị niile nke nʼala ahụ ga-eso nwa eze Izrel bute onyinye ndị a.
17 Huu utakuwa ndio wajibu wa mkuu anayetawala kutoa sadaka ya kuteketezwa, sadaka ya nafaka na sadaka ya kinywaji kwenye sikukuu, Mwezi Mwandamo na Sabato, kwenye sikukuu zote zilizoamriwa za nyumba ya Israeli. Atatoa sadaka za dhambi, sadaka za nafaka, sadaka za kuteketezwa na sadaka za amani ili kufanya upatanisho kwa ajili ya nyumba ya Israeli.
Nwa eze ahụ ka ọ dịrị iweta ihe eji achụ aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka, aja ihe ọṅụṅụ niile, na nke Ọnwa ọhụrụ nakwa nke ụbọchị izuike niile, nʼoge mmemme niile nke ndị Izrel. Ọ ga-ewetakwa ihe eji achụ aja mmehie, aja mkpụrụ ọka, aja nsure ọkụ, aja udo maka ikpuchiri ụmụ Izrel mmehie ha.
18 “‘Hili ndilo Bwana Mwenyezi asemalo: Katika mwezi wa kwanza, siku ya kwanza ya huo mwezi utamchukua fahali mchanga asiye na dosari na kutakasa mahali patakatifu.
“‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ ọbụla, unu ga-ewere nwa oke ehi nke na-enweghị ntụpọ, chụọ aja ido ụlọnsọ m nsọ.
19 Kuhani itampasa achukue sehemu ya hiyo damu ya sadaka ya dhambi na kuipaka kwenye miimo ya Hekalu, kwenye pembe nne za juu za ukingo wa hayo madhabahu na juu ya miimo ya lango la ukumbi wa ndani.
Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara nke aja mmehie ahụ tee ya nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ m, na nʼakụkụ anọ nke ọnụ ebe ịchụ aja, na nʼahụ ibo nke ọnụ ụzọ ogige ime.
20 Itakupasa kufanya vivyo hivyo katika siku ya saba ya mwezi huo kwa ajili ya mtu yeyote ambaye hutenda dhambi bila kukusudia au bila kujua, hivyo utafanya upatanisho kwa ajili ya Hekalu.
Unu ga-emekwa otu ihe ahụ nʼabalị asaa nke ọnwa ahụ nʼihi onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, maka ikpuchi mmehie metụtara ụlọnsọ m.
21 “‘Katika mwezi wa kwanza siku ya kumi na nne utaadhimisha Pasaka. Sikukuu itaendelea kwa siku saba, wakati huo wa hizo siku saba mtakula mikate isiyotiwa chachu.
“‘Nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ, ka unu ga-edebe Mmemme Ngabiga. Ọ ga-abụ mmemme abalị asaa. Nʼụbọchị ndị a, naanị achịcha nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ka unu ga-eri.
22 Katika siku hiyo mkuu anayetawala atatoa fahali kuwa sadaka ya dhambi kwa ajili yake mwenyewe na kwa ajili ya watu wote wa nchi.
Nʼụbọchị ahụ, onyeisi ga-eweta otu nwa oke ehi maka aja mmehie nke onwe ya, na maka mmehie mmadụ niile nke ala ahụ.
23 Kila siku wakati wa hizo siku saba za sikukuu atatoa mafahali saba na kondoo dume saba wasio na dosari kuwa sadaka ya kuteketezwa kwa Bwana na beberu kwa ajili ya sadaka ya dhambi.
Nʼụbọchị asaa nke mmemme ahụ, kwa ụbọchị, ọ ga-eweta oke ehi asaa na ebule asaa, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, dịka ihe ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. Ọ ga-enyekwa nwa mkpi kwa ụbọchị maka aja mmehie.
24 Pia atatoa sadaka ya nafaka efa moja kwa kila fahali na efa moja kwa kila kondoo dume, pamoja na hini moja ya mafuta kwa kila efa.
Ọ ga-ewetakwa nʼihi onyinye ịnata ihuọma, narị lita ọka anọ na iri itoolu, nke bụ otu ọtụtụ otu oke ehi, otu ọtụtụ otu ebule. Tinyere lita mmanụ oliv atọ na ụma asatọ. Lita mmanụ atọ na ụma asatọ dịkwara otu efaf ọka.
25 “‘Wakati wa hizo siku saba za sikukuu, ambayo huanza katika mwezi wa saba kwenye siku ya kumi na tano, mkuu anayetawala atatoa mahitaji yale yale kwa ajili ya sadaka za dhambi, sadaka za kuteketezwa, sadaka za nafaka na mafuta.
“‘Nʼoge mmemme ụbọchị asaa ahụ, nke ga-ebido nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, ọ ga-ewetakwa ihe a ga-eji chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na mmanụ.