< Ezekieli 19 >

1 “Wewe fanya maombolezo kuhusu wakuu wa Israeli
“Ma gị onwe gị, bụọrọnụ ndịisi Izrel abụ akwa a,
2 na useme: “‘Tazama jinsi gani mama yako alivyokuwa simba jike miongoni mwa simba! Alilala katikati ya wana simba na kulisha watoto wake.
ma kwuo, “‘Ụdị nne Ọdụm gịnị ka nne gị bụ nʼetiti ụmụ ọdụm. Ọ dinara nʼetiti ha, na-azụ ụmụ ya.
3 Alimlea mmoja wa watoto wake, naye akawa simba mwenye nguvu. Akajifunza kurarua mawindo naye akala watu.
Ọ zụlitere otu nʼime ụmụ ya nke ghọrọ nwa ọdụm siri ike. Ọ mụtakwara ka e si adọrisi anụ ọhịa, ghọọ ọdụm na-eri mmadụ.
4 Mataifa wakasikia habari zake, naye akanaswa katika shimo lao. Wakamwongoza kwa ndoana mpaka nchi ya Misri.
Mba niile nụrụ maka ihe banyere ya, mee ka ọ danye nʼolulu ha gwuru. Ha ji nko koro ya, duru ya gaa nʼala Ijipt.
5 “‘Mama yake alipongoja na kuona tumaini lake halitimiziki, nayo matarajio yake yametoweka, akamchukua mwanawe mwingine na kumfanya simba mwenye nguvu.
“‘Mgbe ọ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe ọzọ o nwere ike ime banyere ọnọdụ ahụ, matakwa na olileanya ya abụrụla ihe efu, ọ họpụtara nwa ya ọzọ kuziere ya otu ọ ga-esi bụrụ ọdụm dị ike.
6 Alizungukazunguka miongoni mwa simba, kwa kuwa sasa alikuwa simba mwenye nguvu. Akajifunza kurarua mawindo naye akala watu.
Ọ ghọrọ onyeisi ụmụ ọdụm niile, nʼihi na ọ bụ ọdụm siri ike, ọ mụtakwara ka e si ejide anụ ọhịa, ya onwe ya ghọkwara ọdụm na-eri mmadụ.
7 Akabomoa ngome zao na kuiharibu miji yao. Nchi na wote waliokuwa ndani yake wakatiwa hofu kwa kunguruma kwake.
O tikpọrọ ebe ha niile e wusiri ike meekwa obodo ha niile mkpọmkpọ ebe. Ala ahụ na ndị niile nọ nʼime ya, mara jijiji site nʼoke egwu nʼihi olu ịgbọ ụja ya.
8 Kisha mataifa wakaja dhidi yake kutoka sehemu zilizomzunguka. Wakatanda nyavu zao kwa ajili yake, naye akanaswa katika shimo lao.
Mgbe ahụ, ndị agha nke mba niile dị iche iche pụtara gbaa ya gburugburu. Ha sitere nʼakụkụ niile nwude ya nʼọnya olulu ha siiri ya.
9 Kwa kutumia ndoana wakamvutia kwenye tundu na kumleta mpaka kwa mfalme wa Babeli. Wakamtia gerezani, hivyo kunguruma kwake hakukusikika tena katika milima ya Israeli.
Ha tinyere ya nko nʼimi, were dọkpuo ya nʼụlọ igwe a kpara akpa, bute ya nʼihu eze Babilọn. E mere ka o biri na mba ọzọ dịka ohu, ka a ghara ịnụ ụda olu ya ọzọ nʼugwu niile nke Izrel.
10 “‘Mama yako alikuwa kama mzabibu katika shamba lako la mizabibu uliopandwa kando ya maji, ukiwa unazaa sana na wenye matawi mengi kwa sababu ya wingi wa maji.
“‘Nne gị dịka osisi vaịnị nʼogige vaịnị a kụrụ nʼakụkụ mmiri, nke nwere ọtụtụ alaka, nke na-amịkwa mkpụrụ nʼihi mmiri ọ na-enweta.
11 Matawi yake yalikuwa na nguvu, yaliyofaa kuwa fimbo ya enzi ya mtawala. Ulikuwa mrefu kupita miti mingine katikati ya matawi manene; ulionekana kwa urahisi kwa ajili ya urefu wake na wingi wa matawi yake.
Alaka ya niile siri ike, ha topụtara ghọọ mkpara eze. O topụrụ etopụ, tokarịa alaka ndị ọzọ elu. Nke a mere e ji na-ahụ ya anya site nʼebe dị anya.
12 Lakini ulingʼolewa kwa hasira kali na kutupwa chini. Upepo wa mashariki uliufanya usinyae, matunda yake yakapukutika, matawi yake yenye nguvu yakanyauka na moto ukayateketeza.
Ma e ji oke iwe hopu ya tụpụ ya nʼala. Oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ mere ka akwụkwọ ya kpọnwụsịa, meekwa ka mkpụrụ ya daa. Alaka ya ndị ahụ dị ike kpọnwụsịrị, ọkụ rechapụkwara ha niile.
13 Sasa umepandwa jangwani katika nchi kame na ya kiu.
Ugbu a, akụọla ya nʼime ọzara ebe kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị.
14 Moto ulienea kuanzia katika mmojawapo ya matawi yake makubwa na kuteketeza matunda yake. Hakuna tawi lenye nguvu lililobaki juu yake lifaalo kuwa fimbo ya enzi ya mtawala.’ Hili ndilo ombolezo, na litumike kama ombolezo.”
Ọkụ esitela nʼogwe ya rechapụ alaka ya na mkpụrụ ya niile. Ọ dịkwaghị alaka siri ike fọdụrụ nke dịkwa mma ịbụ mkpara eze.’ Abụ a bụ abụ akwa, nke e kwesiri ịbụ mgbe ịkwa akwa.”

< Ezekieli 19 >