< Kutoka 9 >
1 Ndipo Bwana akamwambia Mose, “Nenda kwa Farao ukamwambie, ‘Hili ndilo Bwana, Mungu wa Waebrania asemalo: “Waachie watu wangu waende ili wapate kuniabudu.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Jekwuru Fero sị ya. ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.”
2 Kama ukikataa kuwaachia waende, nawe ukiendelea kuwashikilia,
Ọ bụrụ na ị jụ, ma gaa nʼihu igbochi ha,
3 mkono wa Bwana utaleta pigo baya kwa mifugo yako, juu ya farasi wako, punda, ngamia, ngʼombe wako, kondoo na mbuzi.
aka Onyenwe anyị ga-ewebata oke ọrịa na-efe efe nke ga-abịakwasị igwe anụ ụlọ unu niile dị nʼubi. Ya bụ, ịnyịnya unu, na ịnyịnya ibu unu, na ịnyịnya kamel unu, na ehi unu, na atụrụ unu na ewu unu.
4 Lakini Bwana ataweka tofauti kati ya mifugo ya Israeli na ile ya Misri, kwamba hakuna mnyama wa Mwisraeli atakayekufa.’”
Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti anụ ụlọ ndị Ijipt na nke ndị Izrel. Nʼihi ya, o nweghị anụ ụlọ ọbụla si nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel ga-anwụ.’”
5 Bwana akaweka wakati na kusema, “Kesho Bwana atalitenda hili katika nchi.”
Onyenwe anyị ekwuola oge nke a ga-amalite sị, “Echi ka Onyenwe anyị ga-eme ihe dị otu a nʼala a.”
6 Siku iliyofuata Bwana akalitenda: Mifugo yote ya Wamisri ikafa, lakini hakuna hata mnyama mmoja wa wana wa Israeli aliyekufa.
Nʼụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe anụ ụlọ niile dị nʼIjipt nwụrụ. Ma ọ dịghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ.
7 Farao akatuma watu kuchunguza, nao wakakuta kuwa hakuna hata mnyama mmoja wa Waisraeli aliyekufa. Lakini moyo wa Farao haukukubali kuwaachia watu waende.
Mgbe ahụ Fero zipụrụ ndị mmadụ ndị gara chọpụta na o nweghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. Ma ọ bụladị mgbe ọ chọpụtara na nke a bụ eziokwu, ọ gbanweghị obi ya, ọ nọgidere jụ ikwe ka ndị Izrel laa.
8 Kisha Bwana akamwambia Mose na Aroni, “Chukueni majivu ya tanuru, naye Mose ayarushe angani mbele ya Farao.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị, “Sitenụ nʼekwu e ji esi nri kporo ntụ nke Mosis ga-awụli elu nʼihu Fero.
9 Yatakuwa vumbi jepesi juu ya nchi yote ya Misri, pia yatatokea majipu yenye kufura juu ya watu na wanyama katika nchi yote.”
Ntụ ahụ ga-efesasị, dịka uzuzu nʼala Ijipt niile. Ọ ga-ebute etuto nke ga-aghọ ọnya nʼahụ ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ dị iche iche dị nʼala ahụ niile.”
10 Basi wakachukua majivu kwenye tanuru na kusimama mbele ya Farao. Mose akayarusha hewani, nayo majipu yenye kufura yakatokea miilini mwa watu na wanyama.
Mosis na Erọn kpooro ntụ gaa guzo nʼihu Fero. Mgbe Fero nọ na-ele anya Mosis wụliri ntụ ahụ elu. Ọ ghọrọ etuto, nke gbawara ghọọ ọnya nʼahụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ niile.
11 Waganga hawakuweza kusimama mbele ya Mose kwa sababu ya majipu yale yaliyokuwa miilini mwao na juu ya miili ya Wamisri wote.
Ndị majiki Ijipt enweghị ike iguzo nʼihu Mosis, nʼihi etuto ndị jupụtara ha nʼahụ dịka ọ dị nʼahụ ndị Ijipt ndị ọzọ.
12 Lakini Bwana akaufanya moyo wa Farao kuwa mgumu, naye hakuwasikiliza Mose na Aroni, sawasawa kama vile Bwana alivyokuwa amemwambia Mose.
Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike. Ọ jụrụ ige Mosis na Erọn ntị dịka Onyenwe anyị gwara Mosis na ọ ga-eme.
13 Kisha Bwana akamwambia Mose, “Amka mapema asubuhi, usimame mbele ya Farao, umwambie, ‘Hili ndilo asemalo Bwana, Mungu wa Waebrania: Waachie watu wangu waende, ili kwamba waweze kuniabudu,
Onyenwe anyị gwara Mosis ọzọ sị, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi gaa gwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.
14 au wakati huu nitaleta mapigo yangu yenye nguvu dhidi yako, maafisa wako na watu wako, ili upate kujua kuwa hakuna mwingine kama Mimi katika dunia yote.
Ma ọ bụghị ya, nʼoge a, aga m ezite ọrịa ọjọọ niile nke na-efe efe, ka ha bịakwasị gị, na ndị na-ejere gị ozi, na ndị Ijipt niile. Nke a ga-eme ka unu ghọta na ọ dịghị Onye ọzọ dịka m nʼelu ụwa niile.
15 Kwa kuwa mpaka sasa ningelikuwa nimenyoosha mkono wangu na kukupiga wewe na watu wako kwa pigo ambalo lingekufutilia mbali juu ya nchi.
Nʼihi na tupu oge a, agaara m esetipụ aka m, jiri ajọ ọrịa tie gị na ndị gị niile nke ga-egbuchapụ unu site nʼelu ụwa.
16 Lakini nimekuinua wewe kwa kusudi hili hasa, ili nipate kukuonyesha uwezo wangu, na ili Jina langu lipate kutangazwa duniani yote.
Ma ọ bụ nʼihi nke a ka m ji guzobe gị, ka m gosipụta ike m nʼebe ịnọ, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.
17 Bado unaendelea kujiinua juu ya watu wangu, wala hutaki kuwaachia waende.
Ma ị nọ na-ebuli onwe gị elu megide ndị m, jụ na ha agaghị ala.
18 Kwa hiyo, kesho wakati kama huu nitaleta mvua mbaya sana ya mawe ambayo haijapata kunyesha katika nchi ya Misri, tangu siku ilipoumbwa mpaka leo.
Ya mere, nʼoge dịka oge a echi, aga m ezipu oke ifufe nke ya na akụmmiri igwe so nʼala Ijipt niile. Ụdị ifufe a adịbeghị mbụ nʼala Ijipt, malite nʼoge a tọrọ ntọala ya rute ugbu a.
19 Sasa toa amri urudishe wanyama wote watoke malishoni na chochote ambacho kipo mashambani waje mpaka mahali pa usalama, kwa sababu mvua ya mawe itanyesha juu ya kila mtu na kila mnyama ambaye hajaletwa ndani ambao bado wako nje mashambani, nao watakufa.’”
Ya mere, nye iwu ka a gaa ngwangwa nʼubi unu webata anụ ụlọ unu na ihe ndị ọzọ unu nwere nʼebe a ga-echebe ha, nʼihi na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-egbu mmadụ na anụ ụlọ ọbụla a hapụrụ nʼezi.’”
20 Wale maafisa wa Farao ambao waliliogopa neno la Bwana wakafanya haraka kuwaleta watumwa wao na mifugo yao ndani.
Ụfọdụ ndị na-ejere Fero ozi, ndị na-atụ okwu Onyenwe anyị egwu mere ngwangwa gaa dulata anụ ụlọ ha, na ndị ohu ha.
21 Lakini wale waliopuuza neno la Bwana wakawaacha watumwa wao na mifugo yao shambani.
Ma ndị ahụ na-enweghị nrube isi nye okwu Onyenwe anyị hapụrụ ndị ohu ha nakwa anụ ụlọ ha nʼọhịa.
22 Ndipo Bwana akamwambia Mose, “Nyoosha mkono wako kuelekea angani ili kwamba mvua ya mawe inyeshe juu ya Misri yote, juu ya watu, wanyama na juu ya kila kitu kiotacho katika mashamba ya Misri.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis, “Setịpụ aka gị nʼeluigwe. Nke a ga-eme ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so malite izokwasị ala Ijipt niile, na ụmụ mmadụ, na anụmanụ, na ihe niile a kụrụ nʼubi nʼIjipt.”
23 Mose alipoinyoosha fimbo yake kuelekea angani, Bwana akatuma ngurumo na mvua ya mawe, umeme wa radi ulimulika hadi nchi. Kwa hiyo Bwana akaifanya mvua ya mawe kunyesha juu ya nchi ya Misri,
Mgbe Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼihu eluigwe, Onyenwe anyị zidatara egbe eluigwe na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so. Amụma egbe eluigwe chakwara nʼala. Ya mere, Onyenwe anyị zidatara oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so nʼala Ijipt.
24 mvua ya mawe ikanyesha na radi ikamulika pote. Ikawa dhoruba ya kutisha ambayo haijakuwako katika nchi ya Misri, tangu nchi hiyo iwe taifa.
Mkpụrụ mmiri dara, amụma gbukwara nʼihu nakwa nʼazụ. Nʼezie, ọ bụ oke ifufe dị njọ, ụdị nke a na-ahụtụbeghị nʼala Ijipt kemgbe ọ ghọrọ nnukwu mba.
25 Mvua ya mawe ikaharibu kila kitu katika nchi ya Misri kilichokuwa katika mashamba, watu na wanyama, ikaharibu kila kitu kinachoota mashambani na kuvunja kila mti.
Mkpụrụ mmiri ahụ tigburu ihe niile dị nʼọhịa, ma mmadụ ma anụmanụ niile dị nʼala Ijipt. O feturu ihe niile na-epu nʼubi, ma ahịhịa niile dị nʼosisi.
26 Mahali pekee ambapo mvua ya mawe haikunyesha ni nchi ya Gosheni, ambako Waisraeli waliishi.
Ma akụkụ ebe mkpụrụ mmiri ndị a na-erughị bụ naanị Goshen, ebe ụmụ Izrel bi.
27 Ndipo Farao akawaita Mose na Aroni akawaambia, “Wakati huu nimetenda dhambi. Bwana ni mwenye haki, mimi na watu wangu ni wakosaji.
Mgbe ahụ Fero ziri ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. O kwupụtara nʼihu ha sị, “Nʼoge a, emehiela m. Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, mụ na ndị m bụ ndị mejọrọ.
28 Mwombeni Bwana, kwa kuwa tumepata ngurumo na mvua za mawe za kututosha. Nitawaachia mwondoke; hamtahitaji kungoja zaidi.”
Kpee ekpere rịọọ Onyenwe anyị nʼihi na oke mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe a ezuola. Aga m ekwe ka unu gaa, unu agaghị atụfukwa mgbe.”
29 Mose akamjibu, “Nitakapokuwa nimetoka nje ya mji, nitanyoosha mikono yangu juu kumwomba Bwana. Ngurumo zitakoma na hapatakuwepo mvua ya mawe tena, ili upate kujua kuwa, nchi ni mali ya Bwana.
Mosis gwara Fero sị ya, “Mgbe m si nʼobodo a pụọ, aga m esetipụ aka m nʼebe Onyenwe anyị nọ, egbe eluigwe a, na ifufe a nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-akwụsịkwa. Site na nke a, ị ga-amata na ụwa niile bụ nke Onyenwe anyị.
30 Lakini ninajua kuwa wewe na maafisa wako bado hammwogopi Bwana Mungu.”
Ma amaara m na gị onwe gị na ndị na-ejere gị ozi adịghị atụ Onyenwe anyị Chineke egwu.”
31 (Kitani na shayiri viliharibiwa, kwa kuwa shayiri ilikuwa na masuke, na kitani ilikuwa katika kutoa maua.
Oke ifufe ahụ nke ya na mkpụrụ mmiri so mebiri ihe a kụrụ nʼubi, dịka flakisi na ọka balị. Nʼihi na nʼoge a, ọka balị emenyela isi, flakisi etojuokwala maa ifuru.
32 Hata hivyo, ngano na jamii nyingine ya ngano hazikuharibiwa kwa sababu zilikuwa hazijakomaa bado.)
Ma ifufe na mmiri ukwu ahụ emebighị ọka wiiti na spelti, nʼihi na ha achabeghị.
33 Kisha Mose akaondoka kwa Farao akaenda nje ya mji. Mose akanyoosha mikono yake kuelekea kwa Bwana, ngurumo na mvua ya mawe vikakoma, mvua haikuendelea tena kunyesha nchini.
Mosis hapụrụ Fero si nʼobodo ahụ pụọ. Ọ gbasapụrụ aka ya abụọ nʼihu Onyenwe anyị, egbe eluigwe na mkpụrụ mmiri ahụ kwụsịrị. Mmiri ozuzo kwụsịkwara izo nʼala ahụ.
34 Farao alipoona kwamba mvua ya mawe na ngurumo zimekoma, akafanya dhambi tena. Yeye na maafisa wake wakafanya mioyo yao kuwa migumu.
Mgbe Fero hụrụ na mmiri ozuzo na mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe akwụsịla, o mehiere ọzọ. Ya na ndị na-ejere ya ozi gara nʼihu nyịchie obi ha.
35 Kwa hiyo moyo wa Farao ukawa mgumu, wala hakuwaachia Waisraeli waende, kama vile Bwana alivyokuwa amesema kupitia Mose.
Ya mere, Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ jụrụ ikwere ka ụmụ Izrel pụọ, dịka Onyenwe anyị gwararịị Mosis.