< Kutoka 36 >

1 Kwa hiyo Bezaleli, Oholiabu na kila mtu Bwana aliyempa ustadi na uwezo wa kujua jinsi ya kufanya kazi zote za kujenga mahali patakatifu wataifanya hiyo kazi kama vile Bwana alivyoagiza.”
Ya mere, Bezalel na Oholiab na ndị ǹka niile Onyenwe anyị nyere ike na nghọta ịmata otu ha ga-esi rụọ ọrụ iwu ebe nsọ ahụ ga-arụ ọrụ ahụ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
2 Ndipo Mose akawaita Bezaleli na Oholiabu na kila mtu mwenye ustadi ambaye Bwana alikuwa amempa uwezo na mwenye kupenda kuja na kufanya kazi.
Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Bezalel na Oholiab na ndị ǹka ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ike na nghọta, ndị wepụtara obi ha ịbịa ịrụ ọrụ ahụ.
3 Wakapokea kutoka kwa Mose sadaka zote ambazo Waisraeli walikuwa wameleta ili kuifanya kazi ya ujenzi wa Mahali Patakatifu. Nao watu wakaendelea kuleta sadaka za hiari kila asubuhi.
Ha si nʼaka Mosis nara onyinye ndị ahụ niile ụmụ Izrel wetara maka ịrụ ọrụ ebe nsọ ahụ. Ndị mmadụ nọkwa na-eweta onyinye afọ ofufu ha ụtụtụ niile.
4 Ikafika wakati mafundi wote wenye ujuzi waliokuwa wakiifanya kazi yote ya mahali patakatifu wakasimamisha kazi zao,
Nʼihi ya, ndị ọrụ ǹka niile nọ na-arụ ọrụ nʼebe nsọ ahụ hapụrụ ọrụ ha na-arụ,
5 wakaja na kumwambia Mose, “Watu wanaleta vitu vingi kuliko tunavyohitaji kwa ajili ya kazi hii ambayo Bwana ameagiza ifanyike.”
bịakwute Mosis, sị ya, “Lee, onyinye ndị mmadụ na-eweta adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ịrụ ọrụ a Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”
6 Ndipo Mose akatoa agizo, nao wakapeleka neno hili katika kambi yote: “Mtu yeyote mwanaume au mwanamke asilete tena kitu chochote kwa ajili ya sadaka ya mahali patakatifu.” Hivyo watu wakazuiliwa kuleta zaidi,
Mgbe ahụ, Mosis nyere iwu, ha zisara ozi ahụ nʼọmụma ụlọ ikwu niile sị, “Ka nwoke maọbụ nwanyị ọbụla gharakwa inwe ihe ọbụla nke ọ ga-eweta dịka onyinye maka ọrụ ebe nsọ a.” Nʼihi nke a, ndị mmadụ kwụsịrị iweta ihe ọzọ.
7 kwa sababu walivyokuwa navyo tayari vilitosha na kuzidi kuifanya kazi yote.
Nʼihi na onyinye e wetara adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ọrụ ahụ.
8 Watu wote wenye ustadi miongoni mwa wafanyakazi wote wakatengeneza maskani kwa mapazia kumi ya kitani iliyosokotwa vizuri, na nyuzi za rangi ya buluu, za zambarau, na za rangi nyekundu, naye fundi stadi akatirizi makerubi kwenye mapazia hayo.
Ndị niile mara ǹka nʼetiti ndị ọrụ ahụ ji ezi ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie wuo ụlọ nzute ahụ. Onye ọka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ha.
9 Mapazia yote yalitoshana kwa ukubwa: kila moja lilikuwa na urefu wa dhiraa ishirini na nane, na upana wa dhiraa nne
Akwa mgbochi ndị a ha nʼotu. Ịdị ogologo ha nʼotu nʼotu bụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ha bụ otu mita na sentimita asatọ.
10 Wakayaunganisha mapazia matano pamoja, pia wakafanya vivyo hivyo kwa hayo mengine matano.
E jikọtara akwa mgbochi ise nʼotu, jikọtakwa akwa ise nke ọzọ nʼotu.
11 Kisha wakatengeneza vitanzi vya kitambaa cha buluu kwenye upindo wa pazia la mwisho la fungu la kwanza, pia wakafanya vivyo hivyo na pazia la fungu la mwisho.
Ha ji akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka emekwara menyekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ.
12 Wakatengeneza pia vitanzi hamsini katika pazia mmoja, na vitanzi vingine hamsini kwenye pazia la mwisho la fungu hilo lingine, nazo vitanzi vyote vikaelekeana.
Ha dụnyere iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ, mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu.
13 Kisha wakatengeneza vifungo hamsini vya dhahabu, na wakavitumia kufunga na kuunganisha zile fungu mbili za mapazia pamoja ili maskani ipate kuwa kitu kimoja.
Emesịa, ha ji iri nko ọlaedo ise jikọta ụzọ akwa mgbochi abụọ ndị a, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ ghọọ otu.
14 Wakatengeneza mapazia kumi na moja ya singa za mbuzi kwa ajili ya kufunika maskani.
Ha ji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ.
15 Mapazia hayo kumi na moja yalikuwa na kipimo kimoja, yaani urefu wa dhiraa thelathini, na upana wa dhiraa nne.
Akwa mgbochi iri na otu ndị a ha nʼotu. Ọ ga-abụ mita iri na atọ na ọkara nʼogologo, ebe obosara ya bụ otu mita na iri sentimita asatọ.
16 Wakaunganisha mapazia matano kuwa fungu moja, na hayo mengine sita kuwa fungu lingine.
Ha dụkọtara ise nʼime akwa mgbochi ahụ, debe ya iche. Dụkọtakwa isii nke fọdụrụ debekwa ya iche.
17 Kisha wakatengeneza vitanzi hamsini kwenye upindo wa pazia la mwisho la fungu moja, na vivyo hivyo kwenye upindo wa pazia la mwisho la fungu hilo lingine.
Mgbe ahụ, ha dụnyekwara iri anya nko ise nʼelu ọnụ otu akwa mgbochi ndị ahụ. Mekwaa otu ihe ahụ nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ e debere iche.
18 Wakatengeneza vifungo hamsini vya shaba ili kukaza hema pamoja kuwa kitu kimoja.
Ha mekwara iri nko bronz ise, iji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu.
19 Kisha wakatengeneza kifuniko cha hema kwa ngozi za kondoo dume zilizotiwa rangi nyekundu, na juu yake kifuniko cha ngozi za pomboo.
Mgbe ahụ, ha ji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ịkpụkwasị nʼelu ya.
20 Wakatengeneza mihimili ya kusimamisha ya mti wa mshita kwa ajili ya maskani.
Ha meere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ.
21 Kila mhimili ulikuwa na urefu wa dhiraa kumi, na upana wa dhiraa moja na nusu,
Mbudo ibo ọ bụla dị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara,
22 zikiwa na ndimi mbili zilizokuwa sambamba kila mmoja na mwingine. Wakatengeneza mihimili yote ya maskani jinsi hii.
nwee ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ha rụrụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a.
23 Wakatengeneza mihimili ishirini kwa ajili ya upande wa kusini wa maskani,
Ha rụrụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ,
24 na wakatengeneza vitako arobaini vya fedha vya kuweka chini ya hiyo mihimili, vitako viwili kwa kila mhimili, kimoja chini ya kila ulimi.
ma mekwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ.
25 Kwa upande wa kaskazini wa maskani wakatengeneza mihimili ishirini
Nʼakụkụ nke ọzọ bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ha rụkwara iri mbudo ibo abụọ,
26 na vitako arobaini vya fedha, viwili chini ya kila mhimili.
rụkwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ, ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
27 Wakatengeneza mihimili sita kwa mwisho ulio mbali, yaani upande wa magharibi wa maskani,
Nʼebe isi isi nsọtụ ya bụ akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute, ha rụrụ mbudo ibo isii.
28 na mihimili miwili ikatengenezwa kwa ajili ya pembe za maskani za upande uliokuwa mbali.
Mbudo ibo abụọ ka e mere maka nkuku niile nke nsọtụ ụlọ nzute ahụ,
29 Katika pembe hizi mbili mihimili yake ilikuwa miwili kuanzia chini mpaka juu, na ikaingizwa kwenye pete moja; mihimili ya pembe hizi mbili ilifanana.
Nʼisi nkuku abụọ ndị a, mbudo ibo ndị a nọ iche iche site nʼokpuru ruo nʼelu ya; ma e jikọrọ ha ọnụ nʼime otu mgbaaka. Emere ka ha abụọ yie ibe ya.
30 Kwa hiyo kulikuwa na mihimili minane, na vitako kumi na sita vya fedha, viwili chini ya kila mhimili.
Ha niile dị mbudo ibo asatọ na ụkwụ ọlaọcha dị iri na isii, ya bụ ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
31 Wakatengeneza pia mataruma kwa mti wa mshita: matano kwa ajili ya mihimili ya upande mmoja wa maskani,
Ha ji osisi akashia mekwaa osisi ntụbichi, ise maka mbudo ibo ndị dị nʼotu akụkụ nke ụlọ nzute ahụ,
32 matano kwa ajili ya mihimili ya upande mwingine, na matano kwa ajili mihimili ya upande wa magharibi, mwisho kabisa mwa maskani.
ise nke ọzọ maka ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ, ise nke ọzọ maka mbudo ibo dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼebe ndịda ndịda nke ụlọ nzute ahụ
33 Wakatengeneza taruma la katikati, likapenya katikati ya mihimili kutoka mwisho mmoja hadi mwisho mwingine.
Ha mere osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ka ọ gabiga site nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ.
34 Wakaifunika hiyo mihimili kwa dhahabu, na wakatengeneza pete za dhahabu za kushikilia hayo mataruma. Pia wakayafunika hayo mataruma kwa dhahabu.
Ha ji ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile. Kpụkwaa mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta mkpọrọ osisi ahụ niile. Ha ji ọlaedo machiekwa mkpọrọ osisi ndị ahụ niile.
35 Wakatengeneza pazia la nyuzi za rangi ya buluu, za zambarau, na za rangi nyekundu na kitani safi iliyosokotwa vizuri, naye fundi stadi akatirizi makerubi kwenye hilo pazia.
Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee akwa mgbochi. Onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.
36 Wakatengeneza nguzo nne za mti wa mshita kwa ajili yake na kuzifunika kwa dhahabu. Wakatengeneza kulabu za dhahabu kwa ajili ya nguzo hizo, na kusubu vitako vinne vya fedha.
Ha mere ogidi osisi akashia anọ maka ya were ọlaedo machie ha. Ha meere ha anya nko; wukwara ha ụkwụ ọlaọcha anọ.
37 Kwa ajili ya ingilio la hema wakatengeneza pazia la nyuzi za rangi ya buluu, za zambarau, na za rangi nyekundu na kitani safi iliyosokotwa vizuri, kazi ya mtarizi.
Ha mere akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ikwu ahụ, nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie, na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
38 Pia wakatengeneza nguzo tano zenye kulabu. Wakafunika ncha za juu za hizo nguzo pamoja na tepe zake kwa dhahabu, na pia wakatengeneza vitako vyake vitano vya shaba.
Ha rụrụ ogidi ise ya na anya nko ha. Ha ji ọlaedo machie isi ogidi ahụ na ihe mkpọrọ ha, were bronz rụọ ụkwụ ise ha.

< Kutoka 36 >