< Kutoka 18 >

1 Basi Yethro, kuhani wa Midiani, baba mkwe wa Mose, akawa amesikia kila kitu Mungu alichomfanyia Mose na watu wake wa Israeli, pia jinsi Bwana alivyowatoa Israeli Misri.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jetro, nna nwunye Mosis, onye bụkwa onye nchụaja Midia, nụrụ banyere ihe niile Chineke meere Mosis na Izrel ndị nke ya, na ụzọ Onyenwe anyị si napụta Izrel site nʼaka ndị Ijipt.
2 Baada ya Mose kumrudisha mkewe Sipora, Yethro baba mkwe wake alimpokea
Jetro ọgọ nwoke Mosis kpọọrọ Zipọra, nwunye Mosis, mgbe Mosis chụlara ya
3 pamoja na wanawe wawili. Jina la mmoja aliitwa Gershomu, kwa kuwa Mose alisema, “Nimekuwa mgeni katika nchi ya kigeni.”
na ụmụ ya ndị ikom abụọ. Aha nwa ya nke mbụ bụ Geshọm, nke pụtara, abụ m ọbịa na mba ọzọ.
4 Mwingine aliitwa Eliezeri, kwa kuwa alisema, “Mungu wa baba yangu alikuwa msaada wangu, akaniokoa kutoka upanga wa Farao.”
Aha nwa nwoke nke abụọ bụ Elieza, nke bụ, Onyenwe anyị bụ onye inyeaka m. Nʼihi na mgbe Mosis mụrụ Elieza o kwuru sị, “Chineke nna m bụ onye inyeaka m, nʼihi na ọ napụtara m site na mma agha Fero.”
5 Yethro, baba mkwe wa Mose, pamoja na wana wawili wa Mose na mkewe, wakamjia Mose huko jangwani, mahali alipokuwa amepiga kambi karibu na mlima wa Mungu.
Jetro, ọgọ nwoke Mosis, bịakwutere ha nʼime ọzara. O dutere ụmụ ndị ikom Mosis abụọ na nwunye Mosis. Nʼoge ahụ, Mosis na ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu Chineke.
6 Yethro alikuwa ametuma ujumbe kwake Mose, kusema, “Mimi Yethro baba mkwe wako ninakuja kwako pamoja na mke wako na wanao wawili.”
O ziri Mosis ozi sị, “Mụ bụ Jetro ọgọ gị nwoke bịakwutere gị, nwunye gị na ụmụ gị abụọ sokwa m.”
7 Kwa hiyo Mose akatoka kumlaki baba mkwe wake, akainama na kumbusu. Wakasalimiana, kisha wakaingia hemani.
Nʼihi ya, Mosis gara zute ọgọ ya nwoke, kpọọ isiala nye ọgọ ya, sutu ya ọnụ. Emesịa, ọ kpọbatara ha nʼime ụlọ ikwu ya. Jetro na ọgọ ya Mosis kwurịtara okwu, jụọ ihe banyere otu ihe si agara ibe ha.
8 Mose akamwambia baba mkwe wake kuhusu kila kitu Bwana alichomfanyia Farao na Wamisri kwa ajili ya Israeli, na pia kuhusu shida zote walizokutana nazo njiani na jinsi Bwana alivyowaokoa.
Mosis kọọrọ nna nwunye ya ihe niile Onyenwe anyị mere Fero na ndị Ijipt niile nʼihi ndị Izrel. Ọ kọkwaara ya banyere ihe ndakwasị niile dakwasịrị ha nʼime ọzara, na otu Onyenwe anyị si napụta ha.
9 Yethro akafurahishwa sana kusikia juu ya mambo yote mazuri Bwana aliyowatendea Waisraeli kuwaokoa kutoka mkono wa Wamisri.
Jetro soro Mosis ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu nʼihi ihe niile Onyenwe anyị meere ndị Izrel, na otu o siri napụta ha site nʼaka ndị Ijipt.
10 Yethro akasema, “Sifa na ziwe kwa Bwana, aliyekuokoa wewe kutoka mikononi mwa Wamisri na Farao, na aliyewaokoa watu kutoka mikononi mwa Wamisri.
Jetro kwuru sị, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ. Onye napụtara unu site nʼaka ndị Ijipt na site nʼaka Fero.
11 Sasa najua ya kuwa Bwana ni mkuu kuliko miungu mingine yote, kwa kuwa amewatendea hivi wale waliowatenda Israeli kwa ujeuri.”
Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị kachasị chi ndị ọzọ niile elu, nʼihi na ọ zọpụtara ndị ya site nʼaka ndị Ijipt ndị sitere na mpako ha meso Izrel mmeso.”
12 Kisha Yethro, baba mkwe wa Mose, akaleta sadaka ya kuteketezwa na dhabihu nyingine kwa Mungu, naye Aroni pamoja na wazee wote wa Israeli wakaja kula chakula pamoja na baba mkwe wa Mose mbele za Mungu.
Jetro, nna nwunye Mosis chụọrọ Chineke aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ. Emesịa, Erọn na ndị okenye Izrel bịara soro Mosis na ọgọ ya nwoke rie ihe nʼihu Chineke.
13 Siku iliyofuata, Mose akachukua nafasi yake kama hakimu wa watu, nao wakasimama kumzunguka kuanzia asubuhi hadi jioni.
Nʼụbọchị nke ọzọ ya, Mosis bịara nọdụ ala ikpere ndị mmadụ ikpe. Igwe mmadụ nọgidere Mosis site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị.
14 Baba mkwe wake alipoona yote Mose anayowafanyia watu, akasema, “Ni nini hiki unachowafanyia watu? Kwa nini wewe unakuwa mwamuzi wa watu hawa peke yako, wakati watu hawa wamesimama wakikuzunguka tangu asubuhi mpaka jioni?”
Ọgọ Mosis hụrụ ihe niile ọ na-emere ndị mmadụ, nke a mere na ọ jụrụ, “Gịnị bụ ihe nke a ị na-emere ndị a? Gịnị mere i ji nọdụ ala naanị gị, ndị a niile gbaa gị gburugburu malite nʼụtụtụ ruo nʼanyasị?”
15 Mose akamjibu, “Kwa sababu watu wananijia kutaka mapenzi ya Mungu.
Mosis zara nna nwunye ya sị, “Nʼihi na ha bịara ịjụta m ihe si nʼaka Chineke.
16 Kila wakiwa na shauri huletwa kwangu, nami huamua kati ya mtu na mwenzake na kuwajulisha juu ya amri na sheria za Mungu.”
Ọ bụrụ na esemokwu adịrị nʼetiti mmadụ ọbụla na ibe ya, ha na-abịakwute m, ka m kpebie ihe dị nʼetiti mmadụ na ibe ya. Ana m eme ka ha mata iwu na ụkpụrụ Chineke.”
17 Baba mkwe wa Mose akamjibu, “Unachofanya sio kizuri.
Mgbe Jetro, nna nwunye Mosis, nụrụ ihe ndị a niile, ọ sịrị Mosis, “Ihe ị na-eme adịghị mma.
18 Wewe pamoja na watu hawa wanaokujia mtajichosha bure. Kazi ni nzito sana kwako, huwezi kuibeba mwenyewe.
Ike ga-agwụ gị, gwụkwa igwe mmadụ ndị a. Ọrụ a ị na-arụ dị ukwuu karịa gị. Naanị gị agaghị ebuli ya.
19 Sasa nisikilize mimi, nitakupa shauri, naye Mungu na awe pamoja nawe. Yapasa wewe uwe mwakilishi wa watu mbele za Mungu na ulete mashauri yao kwake.
Ugbu a, gee m ntị. M ga-adụ gị ọdụ, ka Chineke nọnyekwara gị. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na ị bụ onye na-anọchi anya ndị a nʼihu Chineke. Nʼụzọ dị otu a, i nwere ike iweta nsogbu niile ha nwere nʼihu Chineke.
20 Uwafundishe amri na sheria, tena uwaonyeshe namna ya kuishi na kazi zinazowapasa wao kufanya.
Ihe ọzọ ị ga-eme bụ nke a: ị ga-akụziri ha iwu na ụkpụrụ Chineke, gosikwa ha ụzọ ha ga-esi bie ndụ, na ọrụ ha kwesiri ịrụ.
21 Lakini uchague watu wenye uwezo miongoni mwa watu wote, watu wanaomwogopa Mungu, watu waaminifu wanaochukia mali ya dhuluma, uwateuwe wawe maafisa juu ya maelfu, mamia, hamsini na makumi.
Ma site nʼetiti ndị a họpụta ndị ikom tozuru, ndị ikom na-atụ egwu Chineke, ndị kwesiri ntụkwasị obi na ndị kpọrọ uru nʼezighị ezi asị. Mee ha ndịisi na-achị imerime puku ndị mmadụ, ndịisi narị mmadụ, ndịisi iri mmadụ ise na ndịisi mmadụ iri.
22 Waweke wawe waamuzi wa watu kwa wakati wote, lakini waambie wakuletee kila shauri lililo gumu; yale yaliyo rahisi wayaamue wao wenyewe. Hii itafanya mzigo wako kuwa mwepesi, kwa sababu watashirikiana nawe.
Mee ka ha bụrụ ndị ikpe nye ndị mmadụ oge niile. Nye iwu ka ha na-ewetara gị okwu dịkarịsịrị ike, ma na-ekpe ikpe gbasara okwu dị mfe na ndị ọzọ niile dị iche iche. Nʼụzọ dị otu a, ndị ikpe ndị ahụ ga-enyere gị aka ime ka ibu arọ gị dị mfe.
23 Kama ukifanya hivi, na ikiwa Mungu ameagiza hivyo, utaweza kushinda uchovu, nao watu hawa wote watarudi nyumbani wameridhika.”
Ọ bụrụ na ị ga-eme ihe niile ndị a, ọ bụrụkwa na Chineke ekwenye, ị ga-enwe ike nagide nsogbu niile. Mmadụ niile ga-ewere udo na ọṅụ birikwa.”
24 Mose akamsikiliza baba mkwe wake na kufanya kila kitu alichosema.
Mosis gere ntị nʼihe niile nna nwunye ya gwara ya. O mekwara ihe niile o kwuru.
25 Mose akawachagua watu wenye uwezo kutoka Israeli yote, akawafanya kuwa viongozi wa watu, maafisa juu ya maelfu, mamia, hamsini na makumi.
O sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta ndị kwesiri ekwesi mee ka ha bụrụ ndịisi. Ụfọdụ ka o mere ndịisi na-elekọta imerime puku mmadụ, ụfọdụ na-achị narị mmadụ, ụfọdụ, iri mmadụ ise, ụfọdụ, mmadụ iri.
26 Wakatumika kama waamuzi wa watu kwa wakati wote. Mashauri magumu wakayaleta kwa Mose, lakini yale yaliyo rahisi wakayaamua wenyewe.
Ha jere ozi dịka ndị ikpe nye ndị mmadụ nʼoge niile. Ha na-ewetara Mosis okwu niile siri ike, ma ha onwe ha na-ekpe ikpe banyere okwu nke dịkarịsịrị nta.
27 Kisha Mose akaagana na Yethro baba mkwe wake, naye akarudi kwa nchi yake.
Mgbe ahụ, Mosis zilagara nna nwunye ya. Jetro laghachikwara nʼobodo nke aka ya.

< Kutoka 18 >