< 1 Nyakati 7 >

1 Wana wa Isakari walikuwa: Tola, Pua, Yashubu na Shimroni; wote ni wanne.
Isaka mụrụ ụmụ anọ: Tola, na Pua, na Jashub, na Shịmrọn.
2 Wana wa Tola walikuwa: Uzi, Refaya, Yerieli, Yahmai, Ibsamu na Shemueli waliokuwa viongozi wa jamaa zao. Wakati wa utawala wa Mfalme Daudi, wazao wa Tola walioorodheshwa kama wapiganaji katika ukoo wao walikuwa watu 22,600.
Ụmụ Tola ndị ghọrọ ndịisi ezi bụ ndị a: Uzi, na Refaya, na Jeriel, na Jamai, na Ibsam, na Samuel. Nʼoge Devid bụ eze, ọnụọgụgụ ndị agha sitere nʼetiti ha dị iri puku abụọ na abụọ, na narị isii.
3 Mwana wa Uzi alikuwa: Izrahia. Wana wa Izrahia walikuwa: Mikaeli, Obadia, Yoeli na Ishia. Wote hawa watano walikuwa wakuu wao.
Uzi mụrụ Izrahaya. Izrahaya amụta ndị a: Maikel, Ọbadaya, Juel na Ishaya. Ha niile bụkwa ndịisi ikwu ha.
4 Kulingana na ukoo wa jamaa zao, walikuwa na watu hodari wa vita wapatao 36,000, kwa sababu walikuwa na wanawake na watoto wengi.
Ndị bụ ndị agha nʼetiti ụmụ ụmụ ha nʼoge Devid bụ eze ruru iri puku atọ na isii, nʼihi na ha niile lụrụ ọtụtụ ndị inyom, mụọ ọtụtụ ụmụ.
5 Jamaa ya watu waliokuwa wapiganaji hodari kutoka koo zote za Isakari, kama ilivyoorodheshwa katika ukoo wao, jumla yao walikuwa 87,000.
Ụmụnne ha bụ ndị na-alụ agha bụ ndị agbụrụ Isaka dị iri puku asatọ na asaa nʼọnụọgụgụ, dịka e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
6 Wana watatu wa Benyamini walikuwa: Bela, Bekeri na Yediaeli.
Benjamin mụrụ ndị ikom atọ: Bela, Beka na Jediael,
7 Wana wa Bela walikuwa: Esboni, Uzi, Uzieli, Yeremothi na Iri; walikuwa viongozi wa jamaa zao; wote ni watano. Watu wapiganaji walioorodheshwa katika ukoo wao walikuwa 22,034.
Bela mụrụ ụmụ ise: Ezbon, Uzi, Uziel, Jerimot na Iri. Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị agha ha dị iri puku abụọ na abụọ na iri atọ na anọ. E dekwara aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
8 Wana wa Bekeri walikuwa: Zemira, Yoashi, Eliezeri, Elioenai, Omri, Yeremothi, Abiya, Anathothi na Alemethi. Hawa wote walikuwa wana wa Bekeri.
Ụmụ ndị ikom Beka mụrụ bụ Zemira, Joash, Elieza, Elioenai, Omri, Jeremot, Abija, Anatot na Alemet.
9 Orodha ya ukoo wao iliyoandikwa viongozi wa jamaa zao walikuwa wapiganaji 20,200.
Akwụkwọ ebe e dere usoro ọmụmụ ha depụtara aha ndịisi ezinaụlọ, na iri puku ndị agha abụọ na narị abụọ.
10 Mwana wa Yediaeli alikuwa: Bilhani. Wana wa Bilhani walikuwa: Yeushi, Benyamini, Ehudi, Kenaana, Zethani, Tarshishi na Ahishahari.
Jediael mụrụ otu nwa nwoke: aha ya bụ Bilhan. Ụmụ Bilhan bụ Jeush, Benjamin, Ehud, Kenaana, Zetan, Tashish na Ahishaha.
11 Hawa wana wote wa Yediaeli walikuwa viongozi wa jamaa zao. Kulikuwako wanaume wapiganaji 17,200 waliokuwa tayari kwenda vitani.
Ụmụ ndị ikom Jediael ndị a bụ ndịisi ezinaụlọ. E nwere nʼetiti ha ndị agha ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asaa na narị abụọ, ndị nọ na njikere ibu agha.
12 Washupimu na Wahupimu walikuwa wazao wa Iri. Wahushimu walikuwa wazao wa Aheri.
Ndị Shupim na ndị Hupim bụ ụmụ ụmụ Er ebe ndị Hushim bụ ụmụ ụmụ Aha.
13 Wana wa Naftali walikuwa: Yahzieli, Guni, Yeseri na Shalumu; hao walikuwa wazao wa Bilha.
Ụmụ Naftalị mụtara bụ Jaziel, Guni, Jeza na Shalum bụ ụmụ Bilha.
14 Wana wa Manase walikuwa: Asirieli alikuwa mzao wake kutokana na suria wake wa Kiaramu. Huyu suria akamzaa Makiri baba wa Gileadi.
Ụmụ Manase: Asriel, onye iko ya nwanyị bụ onye Aram mụtara, na Makia. Makia bụ nna Gilead.
15 Makiri akatwaa mke kutoka miongoni mwa Wahupimu na Washupimu. Jina la dada yake aliitwa Maaka. Mwana wa pili wa Makiri aliitwa Selofehadi, ambaye alikuwa na wasichana tu.
Makia sitere nʼetiti ndị Hupim na Shupim lụọ nwunye. Aha nwanne ya nwanyị bụ Maaka. Otu onye ọzọ si nʼagbụrụ Manase bụ Zelofehad, onye mụtara naanị ụmụ ndị inyom.
16 Maaka mkewe Makiri akamzaa mwana aliyemwita Pereshi. Jina la nduguye lilikuwa Shereshi. Wana wa Pereshi walikuwa Ulamu na Rakemu.
Maaka nwunye Makia mụtara otu nwa nwoke ọ gụrụ Peresh. Aha nwanne ya bụ Sheresh, onye mụtara Ụlam na Rakem.
17 Mwana wa Ulamu alikuwa: Bedani. Hawa ndio waliokuwa wana wa Gileadi mwana wa Makiri, mwana wa Manase.
Nwa nwoke Ụlam mụtara bụ Bedan. Ndị a bụ ụmụ Gilead, nwa nwa Makia, nwa Manase.
18 Dada yake aliyeitwa Hamolekethi aliwazaa Ish-Hodi, Abiezeri na Mahla.
Hamoleket, nwanne nwanyị Makia mụrụ Ishod, Abieza na Mahla.
19 Wana wa Shemida walikuwa: Ahiani, Shekemu, Liki na Aniamu.
Shemida mụrụ ụmụ ikom ndị a: Ahian, Shekem, Liiki na Aniam.
20 Wana wa Efraimu walikuwa: Shuthela, ambaye alimzaa Beredi, Beredi akamzaa Tahathi, Tahathi akazaa Eleada, Eleada akamzaa Tahathi,
Ụmụ Ifrem bụ Shutela, Bered, Tahat, Eleada, Tahat
21 Tahathi akamzaa Zabadi, na Zabadi akamzaa Shuthela. Ezeri na Eleadi waliuawa na wenyeji wa Gathi walipokuwa wamekwenda huko kuwanyangʼanya mifugo yao.
na Zabad nwa ya, na Shutela nwa ya. Eza na Elead bụ ndị gara ịchịkọrọ anụ ụlọ ndị Gat, ndị ikom nwe obodo ahụ jidere ha gbuo ha nʼebe ahụ.
22 Baba yao Efraimu akawaombolezea kwa siku nyingi, na jamaa zake wakaja kumfariji.
Ifrem nna ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ọnwụ ha, ma ụmụnna ya kasịrị ya obi.
23 Kisha akakutana kimwili na mke wake tena, naye akachukua mimba, akamzalia mwana. Akamwita Beria, kwa sababu ya misiba iliyoipata nyumba yake.
Mgbe nwunye ya mụrụ nwa nwoke ọzọ, ọ kpọrọ aha ya Beriya, nke pụtara, Ihe ndaba ọjọọ, nʼihi ọnwụ Elead na Eza.
24 Beria alikuwa na binti jina lake Sheera. Huyu ndiye aliijenga miji ya Beth-Horoni ya Juu na Beth-Horoni ya Chini, pamoja na Uzen-Sheera.
Aha nwa Ifrem nke nwanyị bụ Sheera. Sheera bụ onye wuru akụkụ ugwu na ndịda Bet-Horon, wuokwa Uzen-Sheera.
25 Beria akamzaa pia Refa, naye Refa akamzaa Reshefu, Reshefu akamzaa Tela, Tela akamzaa Tahani,
Ndị a bụkwa ụmụ Ifrem: Refa, nna Reshef, onye bụ nna Tela. Tela bụ nna Tahan,
26 Tahani akamzaa Ladani, Ladani akamzaa Amihudi, Amihudi akamzaa Elishama,
onye bụ nna Ladan, Ladan bụ nna Amihud, onye bụ nna Elishama.
27 Elishama akamzaa Nuni, Nuni akamzaa Yoshua.
Elishama bụ nna Nun, onye bụ nna Joshua.
28 Nchi zao na makazi yao yalijumuisha Betheli na vijiji vilivyouzunguka, Naarani ilikuwa upande wa mashariki, Gezeri pamoja na vijiji vyake upande wa magharibi, pia Shekemu na vijiji vyake hadi kufikia Aya na vijiji vyake.
Betel na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ya bụ Naaran, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na Gaza na obodo nta ya, ndị dị nʼọdịda anyanwụ, na Shekem, na obodo ndị ọzọ, tutu ruo Aya, na obodo nta ya niile, so nʼala ha.
29 Katika mipaka ya Manase walikuwepo Beth-Shani, Taanaki, Megido na Dori pamoja na vijiji vyake. Wana wa Yosefu mwana wa Israeli waliishi katika miji hii.
Ụmụ Manase, nwa Josef, nwa nwa Izrel, bikwa nʼobodo ndị a dị nʼoke ala ha: Bet-Shan, na Teanak, na Megido, na Doa, tinyere obodo nta ha niile.
30 Wana wa Asheri walikuwa: Imna, Ishva, Ishvi na Beria. Dada yao alikuwa Sera.
Asha mụrụ ndị a: Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwa ya nwanyị bụ Sera.
31 Wana wa Beria walikuwa: Heberi na Malkieli, aliyekuwa baba yake Birzaithi.
Beriya amụta ndị a: Heba na Malkiel, onye bụ nna Biazait.
32 Heberi akawazaa Yafleti, Shomeri na Hothamu, na Shua dada yao.
Heba bụ onye mụrụ Jaflet, Shoma na Hotam. Nwanne ha nwanyị bụ Shua.
33 Wana wa Yafleti walikuwa: Pasaki, Bimhali na Ashvathi. Hawa walikuwa wana wa Yafleti.
Ụmụ Jaflet mụrụ bụ Pasak, Bimhal na Ashvat. Ndị a bụ ụmụ Jaflet.
34 Wana wa Shemeri walikuwa: Ahi, Roga, Yehuba na Aramu.
Shoma amụọ Ahi, Roga, Huba na Aram.
35 Wana wa Helemu ndugu yake walikuwa: Sofa, Imna, Sheleshi na Amali.
Nwanne ya nwoke Helem mụrụ Zofa, Imana, Shelesh na Amal.
36 Wana wa Sofa walikuwa: Sua, Harneferi, Shuali, Beri, Imra,
Zofa amụta ndị a: Sua, Hanefa, Shual, Beri, Imra,
37 Bezeri, Hodu, Shama, Shilsha, Ithrani na Beera.
Beza, Hod, Shama, Shilsha, Itran na Beera.
38 Wana wa Yetheri walikuwa: Yefune, Pispa na Ara.
Jeta mụtara Jefune, Pispa na Ara.
39 Wana wa Ula walikuwa: Ara, Hanieli na Risia.
Ụla amụta Ara, Haniel na Rizia.
40 Hawa wote ndio waliokuwa wazao wa Asheri, viongozi wa jamaa zao, watu bora, mashujaa walio hodari na viongozi maarufu. Idadi ya watu waliokuwa tayari kwa vita, kama ilivyoorodheshwa katika ukoo wao, walikuwa 26,000.
Ụmụ ụmụ Asha ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị a sara anya na mmiri họpụta, ndị bụ dimkpa nʼagha, ndị ndu a ma ama. Ọnụọgụgụ ndị ha tozuru ije agha dị puku iri abụọ na isii, ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.

< 1 Nyakati 7 >