< 1 Reyes 14 >

1 En aquel tiempo Abías, el hijo de Jeroboam, se enfermó.
Nʼoge a, Abija nwa Jeroboam nọ nʼọrịa nke dị ukwuu.
2 Y Jeroboam dijo a su mujer: Levántate ahora, disfrázate para que no reconozcan que eres la esposa de Jeroboam, y ve a Silo; mira, Ahías está ahí, el profeta que dijo que yo sería rey sobre este pueblo.
Nʼihi ya, Jeroboam sịrị nwunye ya, “Gaa, jikwaa onwe gị nʼụzọ mmadụ na-enweghị ike ịmata na ị bụ nwunye Jeroboam. Ị ga-ejekwa Shaịlo, Ahija onye amụma nọ nʼebe ahụ, bụ nwoke ahụ gwara m okwu na m ga-abụ eze ndị nke a.
3 Y llévate diez tortas de pan y tortas secas y una olla de miel, y ve a él: él te dirá lo que será del niño.
Chịrịkwa ogbe achịcha iri, na achịcha nta ole na ole, na otu karama mmanụ aṅụ, jekwuru ya. Ọ ga-agwa gị ihe ga-eme banyere nwantakịrị a.”
4 Así lo hizo la esposa de Jeroboam, se levantó, fue a Silo y fue a la casa de Ahías. Ahora Ahías no podía ver, porque era muy viejo.
Nwunye Jeroboam mere ihe o kwuru, o biliri jee nʼụlọ Ahija na Shaịlo. Ahija bụ agadi nwoke nʼoge a. Ọ naghị ahụkwa ụzọ nʼihi nka ọ kara.
5 Y él Señor había dicho a Ahías: La esposa de Jeroboam vendrá a recibir noticias tuyas sobre su hijo, que está enfermo; Dale tal y cual respuesta; porque ella se hará parecer otra mujer.
Ma Onyenwe anyị agwalarị Ahija okwu sị ya, “Nwunye Jeroboam na-abịa ịjụta ase nʼaka gị banyere nwa ya nwoke ahụ na-adịghị ike, ọsịsa dị otu a ka i ganye ya. Mgbe ọ ga-abịa ịhụ gị ọ ga-eme onwe ya dịka ọ bụghị nwunye Jeroboam.”
6 Entonces Ahías, oyendo el ruido de sus pasos entrando por la puerta, dijo: Entra, oh mujer de Jeroboam; ¿Por qué te haces pasar por otra? porque yo soy enviado a ti con amargas noticias.
Mgbe Ahija nụrụ ụda nzọ ụkwụ ya ka ọ na-abata nʼọnụ ụzọ, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Bata, nwunye Jeroboam. Gịnị mere i ji jie ejiji dịka onye ọzọ? Enwere m akụkọ ọjọọ m ga-akọrọ gị
7 Ve y dile a Jeroboam: Estas son las palabras del Señor, el Dios de Israel: Aunque te saqué de entre la gente, levantándote para que fueras un gobernante sobre mi pueblo Israel.
Ga gwa Jeroboam sị ya, Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Esi m nʼetiti ndị m welie gị elu, mee gị ka ị bụrụ onye ga-achị ndị m, bụ Izrel.
8 Y quité el reino por la fuerza de la semilla de David y te lo di a ti, pero tu no has sido como mi siervo David, quien cumplió mis órdenes y fue sincero conmigo con todo su corazón, todo lo que hizo era justo ante mis ojos.
Adọwapụrụ m alaeze Izrel site nʼụlọ Devid nye gị ya, ma ị geghị ntị nʼiwu m, maọbụ debe ha dịka ohu m Devid debere ihe niile m nyere ya nʼiwu. Onye echiche obi ya na ihe na-atọ obi ya ụtọ mgbe niile bụ idebe iwu m, na ime ihe ziri ezi nʼanya m.
9 Pero has hecho el mal más que ningún otro antes que tú, y has creado para ti otros dioses e imágenes de metal que me han llevado a la ira y me han dado la espalda.
Ma ihe ọjọọ i mere adịla ukwuu karịa nke ndị niile bu gị ụzọ bụrụ eze mere. Ị kpụọlara onwe gị chi ndị ọzọ, chi ndị e ji ọla kpụọ, si otu a kpasuo m iwe, gbakụta m azụ gị.
10 Entonces enviaré el mal en la línea de Jeroboam, separando de su familia a todos los hijos varones, aquellos que están encerrados y los que salen libres en Israel; la familia de Jeroboam será barrida como un hombre que quita los desperdicios hasta que se acabe.
“‘Nʼihi ihe ndị a, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ezinaụlọ Jeroboam. Aga m ekpochapụkwa ụmụ ndị ikom gị niile, ma ndị ohu, ma ndị nwe onwe ha nọ nʼala Izrel. Aga m ekpochapụkwa ụlọ Jeroboam dịka mmadụ si ekpochapụ nsị anụ, ruo mgbe e kpochapụrụ ha niile.
11 Los de la familia de Jeroboam que mueran en la ciudad se convertirán en alimento para los perros; y aquellos a quienes la muerte viene en campo abierto, serán alimento para las aves del aire; porque el Señor lo ha dicho.
Nkịta ga-eri ozu ndị nke Jeroboam ndị nwụrụ nʼime obodo, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha. Onyenwe anyị ekwuola ya.’
12 ¡Arriba, entonces! vuelve a tu casa; y en la hora en que tus pies entren en la ciudad, se producirá la muerte del niño.
“Ma gị onwe gị, Laa nʼụlọ gị. Mgbe ị na-azọbanye ụkwụ gị nʼobodo, nwokorobịa ahụ ga-anwụ.
13 Y todo Israel pondrá su cuerpo en reposo, llorando por él, porque solo él de la familia de Jeroboam será puesto en su lugar de reposo en la tierra; Porque de toda la familia de Jeroboam, en él, solo el Señor, el Dios de Israel, ha visto algo bueno.
Ndị Izrel niile ga-akwa akwa nʼihi ya lie ya. Ọ bụ naanị ya bụ onye a ga-eli eli, nʼihi na nʼime ezinaụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị nʼime nwokorobịa a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel chọtara ihe dị mma.
14 Y el Señor levantará un rey sobre Israel, que enviará destrucción sobre la familia de Jeroboam en aquel día;
“Ma Onyenwe anyị ga-emekwa ka eze ọzọ bilie nʼIzrel, onye ga-ekpochapụ ezinaụlọ Jeroboam niile. O bidola taa, e, ma ugbu a kwa!
15 Y hasta ahora, la mano del Señor ha descendido sobre Israel, sacudiéndola como una hierba en el agua; y, arrancando a Israel de esta buena tierra, que dio a sus padres, los enviará de este modo al otro lado del río; porque se han hecho imágenes, moviendo al Señor a la ira.
Onyenwe anyị ga-eti Izrel ihe, mee ka ọ maa jijiji dịka osisi achara nke ikuku na-ebugharị nʼime mmiri. Ọ ga-ehopu Izrel site nʼezi ala o nyere nna nna ha, fesaa ha nʼofe osimiri Yufretis, nʼihi na ha akpasuola iwe Onyenwe anyị site nʼiguzobe ogidi ofufe Ashera.
16 Y él entregará a Israel por los pecados que Jeroboam cometió e hizo que Israel cometiera.
Ọ ga-agbakụta Izrel azụ nʼihi mmehie Jeroboam mere, ma meekwa ka Izrel niile soro ya mehie.”
17 Entonces la mujer de Jeroboam se levantó, se fue y se fue a Tirsa; y cuando llegó a la puerta de la casa, la muerte llegó al niño.
Mgbe ahụ, nwunye Jeroboam biliri laghachi Tịaza. Ma nwokorobịa ahụ nwụrụ mgbe ọ na-azọbata ụkwụ ya nʼọnụ ụzọ ụlọ ha.
18 Y todo Israel puso su cuerpo en reposo, llorando sobre él, como él Señor lo había dicho por su siervo el profeta Ahías.
Ha liri ya, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, dịka okwu Onyenwe anyị si dị, nke o kwuru site nʼọnụ Ahija, onye amụma.
19 Ahora, el resto de los hechos de Jeroboam, cómo hizo la guerra y cómo se convirtió en rey, están registrados en el libro de las crónicas de los reyes de Israel.
Ihe niile ọzọ Jeroboam mere, na ihe niile banyere ibu agha ya niile, na ọtụtụ ihe ọzọ dị iche iche banyere ọchịchị ya, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere.
20 Y Jeroboam fue rey por veintidós años, y fue puesto a descansar con sus padres, y su hijo Nadab fue rey en su lugar.
Jeroboam chịrị Izrel iri afọ abụọ na abụọ. O sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, nwa ya Nadab ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
21 Y Roboam, hijo de Salomón, era rey en Judá. Roboam tenía cuarenta y un años cuando se convirtió en rey, y fue rey durante diecisiete años en Jerusalén, la ciudad que el Señor había hecho suya de todas las tribus de Israel, para poner su nombre allí; El nombre de su madre era Naama, una mujer amonita.
Nʼoge a, Rehoboam nwa Solomọn, bụ eze Juda. Ọ gbara iri afọ anọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na asaa na Jerusalem, bụ obodo ahụ Onyenwe anyị họọrọ site nʼetiti ebo niile nke Izrel, bụ ebe ọ ga-akpọkwasị Aha ya. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn.
22 Y Judá hizo lo malo ante los ojos del Señor, y lo irritó más que a sus antepasados por sus pecados.
Mgbe ahụ, ndị Juda mehiekwara megide Onyenwe anyị. Ha sitere nʼọtụtụ mmehie ha mere, nke karịrị mmehie nke ndị nna nna ha ochie mere, kpasuo ekworo ya.
23 Hicieron lugares altos, columnas de piedras y columnas de madera en cada colina alta y debajo de cada árbol verde;
Ha wukwara nye onwe ha ebe ịchụ aja na ogidi arụsị nʼelu ugwu niile, na ogidi chi Ashera, na nʼokpuru osisi ọbụla akwụkwọ ndụ dị nʼelu ya.
24 Y más que esto, hubo aquellos en la tierra que fueron utilizados con fines sexuales en la adoración de los dioses, cometiendo los mismos crímenes repugnantes que las naciones que el Señor había enviado ante los hijos de Israel.
E nwere ndị ikom akwụna nʼala ahụ, ndị nọ nʼụlọ arụsị ha dị iche iche. Ndị mmadụ mere ụdị ihe arụ ahụ nke ndị mba niile ndị ahụ na-eme, bụ mba ndị ahụ Onyenwe anyị sitere nʼihu ndị Izrel chụpụ.
25 En el quinto año del rey Roboam, Sisac, rey de Egipto, subió contra Jerusalén;
Nʼafọ nke ise, nke ọchịchị eze Rehoboam, Shishak, eze Ijipt, busoro Jerusalem agha.
26 Y quitó todas las riquezas acumuladas de la casa del Señor y de la casa del rey, y todos los escudos de oro que Salomón había hecho.
O bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo niile ndị ahụ Solomọn kpụrụ.
27 Entonces, en su lugar, el rey Roboam tenía otras fundas hechas de bronce, y las puso a cargo de los capitanes de los hombres armados que estaban apostados en la puerta de la casa del rey.
Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya.
28 Y cada vez que el rey entraba en la casa del Señor, los hombres armados los llevaban y luego los llevaban a ponerlos en el cuarto de guardia.
Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị nche na-ebu ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche.
29 Los demás hechos de Roboam y todo lo que hizo, ¿no están registrados en el libro de las crónicas de los reyes de Judá?
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda?
30 Y hubo guerra entre Roboam y Jeroboam todos sus días.
Agha dịgidere nʼetiti Rehoboam na Jeroboam ụbọchị niile nke ndụ ha.
31 Y Roboam murió y fue enterrado con sus padres en el pueblo de David; El nombre de su madre era Naama, una mujer amonita. Y Abiam su hijo se convirtió en rey en su lugar.
Rehoboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn. Abija nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

< 1 Reyes 14 >