< Proverbios 15 >

1 LA blanda respuesta quita la ira: mas la palabra áspera hace subir el furor.
Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ; ma okwu ike na-akpali iwe.
2 La lengua de los sabios adornará la sabiduría: mas la boca de los necios hablará sandeces.
Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa, ma ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu enweghị uche.
3 Los ojos de Jehová están en todo lugar, mirando á los malos y á los buenos.
Onyenwe anyị na-ahụzu ihe niile, anya ya dịkwa nʼahụ ndị ọma na ndị ọjọọ.
4 La sana lengua es árbol de vida: mas la perversidad en ella es quebrantamiento de espíritu.
Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume; ma nkwutọ na-eweta ịda mba.
5 El necio menosprecia el consejo de su padre: mas el que guarda la corrección, vendrá á ser cuerdo.
Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu; ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche.
6 En la casa del justo hay gran provisión; empero turbación en las ganancias del impío.
Ụlọ ndị ezi omume na-ejupụta nʼọtụtụ akụ, ma akụ ndị na-emebi iwu na-ewetara ha nsogbu.
7 Los labios de los sabios esparcen sabiduría: mas no así el corazón de los necios.
Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma, ma obi ndị nzuzu ezighị ezi.
8 El sacrificio de los impíos es abominación á Jehová: mas la oración de los rectos es su gozo.
Onyenwe anyị na-akpọ aja ndị ajọ omume asị, ma ekpere ndị ndụ ha ziri ezi na-atọ ya ụtọ.
9 Abominación es á Jehová el camino del impío: mas él ama al que sigue justicia.
Onyenwe anyị kpọrọ ụzọ ndị na-emebi iwu asị, ma ndị na-achụso ezi omume ka ọ na-ahụ nʼanya.
10 La reconvención es molesta al que deja el camino: y el que aborreciere la corrección, morirá.
Oke ịdọ aka na ntị na-echere ndị na-ahapụ ụzọ. Onye kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ ọnwụ.
11 El infierno y la perdición están delante de Jehová: ¡cuánto más los corazones de los hombres! (Sheol h7585)
Onyenwe anyị mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ; ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ? (Sheol h7585)
12 El escarnecedor no ama al que le reprende; ni se allega á los sabios.
Ọ dịghị atọ onye na-akwa emo ụtọ ma a baara ya mba, ya mere ọ dịghị ejekwuru onye maara ihe.
13 El corazón alegre hermosea el rostro: mas por el dolor de corazón el espíritu se abate.
Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma. Ihu gbarụrụ agbarụ na-egosi obi nwere ihe mwute.
14 El corazón entendido busca la sabiduría: mas la boca de los necios pace necedad.
Obi nwere nghọta na-achọ ịmata ihe, ma ọnụ onye nzuzu na-azụ onwe ya nʼokwu na-abaghị uru.
15 Todos los días del afligido son trabajosos: mas el de corazón contento [tiene] un convite continuo.
Ndụ onye ogbenye jupụtara nnọọ na mgbalị, ma ndị nwere udo nʼobi na-eri oriri mgbe niile.
16 Mejor es lo poco con el temor de Jehová, que el gran tesoro donde hay turbación.
Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị, karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu.
17 Mejor es la comida de legumbres donde hay amor, que de buey engordado donde hay odio.
Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya, karịa ehi buru ibu a zụziri azụzi nke ịkpọ asị dị na ya.
18 El hombre iracundo mueve contiendas: mas el que tarde se enoja, apaciguará la rencilla.
Onye iwe ọkụ na-amalite ọgụ; ma onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ na-eme ka ịlụ ọgụ kwụsị.
19 El camino del perezoso es como seto de espinos: mas la vereda de los rectos [como] una calzada.
Eji ogwu gbochie ụzọ onye umengwụ, ma ụzọ onye omume ya ziri ezi bụ ụzọ dị larịị.
20 El hijo sabio alegra al padre: mas el hombre necio menosprecia á su madre.
Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ, ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.
21 La necedad es alegría al falto de entendimiento: mas el hombre entendido enderezará su proceder.
Onye na-enweghị uche na-aṅụrị ọṅụ nʼime amaghị ihe ya, ma onye nwere nghọta na-aga ije nʼụzọ ziri ezi.
22 Los pensamientos son frustrados donde no hay consejo; mas en la multitud de consejeros se afirman.
Nzube na-enweghị ndụmọdụ na-ama afọ nʼala, ma ndị ndụmọdụ dịrị ọtụtụ ọganihu ga-adị.
23 Alégrase el hombre con la respuesta de su boca: y la palabra á su tiempo, ¡cuán buena es!
Ọṅụ na-adị mgbe mmadụ natara ọsịsa dị mma, okwu e kwuru nʼoge o kwesiri dị mma.
24 El camino de la vida [es] hacia arriba al entendido, para apartarse del infierno abajo. (Sheol h7585)
Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche, iwezuga ha site na-ịgbada nʼala mmụọ dị nʼokpuru. (Sheol h7585)
25 Jehová asolará la casa de los soberbios: mas él afirmará el término de la viuda.
Onyenwe anyị na-adọtu ma na-adọrisi ụlọ nke onye mpako, ma oke ala nke nwanyị di ya nwụrụ ka ọ na-elekọta.
26 Abominación son á Jehová los pensamientos del malo: mas las expresiones de los limpios [son] limpias.
Echiche ọjọọ niile nke ndị na-emebi iwu ka Onyenwe anyị kpọrọ asị ma okwu ebere niile dị ọcha nʼanya ya.
27 Alborota su casa el codicioso: mas el que aborrece las dádivas vivirá.
Onye anya ukwu na-ewetara ezinaụlọ ya nsogbu. Ma onye kpọrọ iri ngarị asị ga-adị ndụ.
28 El corazón del justo piensa para responder: mas la boca de los impíos derrama malas cosas.
Obi onye ezi omume na-atule ọsịsa ya ma ọnụ nke onye ajọ omume na-asọpụta ihe ọjọọ dị iche iche.
29 Lejos está Jehová de los impíos: mas él oye la oración de los justos.
Onyenwe anyị anọghị ndị na-emebi iwu nso; ma ọ na-anụ ekpere ndị ezi omume.
30 La luz de los ojos alegra el corazón; y la buena fama engorda los huesos.
Ihu ọchị na-eweta obi ụtọ. Akụkọ ọma na-enyekwa ọkpụkpụ ndụ.
31 La oreja que escucha la corrección de vida, entre los sabios morará.
Onye na-ege ntị nye ịba mba nke na-enye ndụ ga-esoro ndị amamihe nọrọ.
32 El que tiene en poco la disciplina, menosprecia su alma: mas el que escucha la corrección, tiene entendimiento.
Onye jụrụ ịdọ aka na ntị kpọrọ onwe ya asị ma onye ọbụla naara ndụmọdụ nwere nghọta.
33 El temor de Jehová es enseñanza de sabiduría: y delante de la honra [está] la humildad.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị; onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.

< Proverbios 15 >