< Génesis 9 >

1 ʼElohim bendijo a Noé y a sus hijos, y les dijo: Sean fecundos y multiplíquense y llenen la tierra.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke gọziri Noa na ụmụ ya sị ha: “Mụọnụ, baanụ, jupụtanụ nʼụwa.
2 El temor y pavor de ustedes sea sobre todos los animales de la tierra, sobre todas las aves del cielo, sobre todo lo que se mueve en la tierra y sobre todos los peces del mar. En sus manos son entregados.
Egwu unu na ụjọ unu ga-adakwasị anụmanụ niile nke ụwa nke dị ndụ, na anụ ufe niile nke eluigwe, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, na azụ niile dị nʼosimiri. Ewerela m ha niile nyefee unu nʼaka.
3 Todo lo que se mueve y vive les servirá de alimento, y también la hierba verde. Se lo di todo.
Ihe ọbụla dị ndụ nke na-ejegharị ejegharị ga-abụ nri unu. Enyela m unu ihe niile ugbu a dịka m si nye unu ahịhịa ndụ niile.
4 Solo no comerán carne con su vida que es su sangre,
“Ma unu agaghị eri anụ ọbụla nke ọbara ndụ ya dị ya nʼahụ.
5 pues ciertamente demandaré la sangre de ustedes. La demandaré de mano de todo ser vivo. De mano del hombre y de cualquier hermano suyo demandaré la vida del hombre.
Ma gbasara ọbara ndụ unu, unu ga-asara ọnụ unu nʼihu m. Anụmanụ ọbụla ga-asara ọnụ ya nʼihu m. Mmadụ ọbụla kwa ga-asara ọnụ ya nʼihu m banyere ndụ mmadụ ibe ya.
6 El que derrame sangre de hombre, su sangre será derramada por los hombres, porque a imagen de ʼElohim hizo ʼEL al hombre.
“Onye ọbụla wufuru ọbara mmadụ, nʼaka mmadụ ka a ga-awụfu ọbara nke ya, nʼihi nʼoyiyi Chineke ka Chineke mere mmadụ.
7 Y ustedes, sean fructíferos y multiplíquense. Reprodúzcanse en la tierra y multiplíquense en ella.
Ma unu onwe unu, mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ ụwa, baakwanụ ụba nʼime ya.”
8 ʼElohim habló a Noé y a sus hijos que estaban con él:
Chineke gwara Noa na ụmụ ya sị,
9 Miren, Yo establezco mi Pacto con ustedes, y después de ustedes, con sus descendientes,
“Ugbu a, ana m ehiwe ọgbụgba ndụ nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti agbụrụ unu ndị ga-anọchi unu,
10 y con todo ser vivo que está con ustedes: aves, ganado y todos los animales terrestres que están con ustedes, todos los que salieron del arca, todos los animales de la tierra.
na nʼetiti ihe niile nwere ndụ nke unu na ha so, ụmụ anụ ufe, na ụmụ anụ ụlọ, na ụmụ anụ ọhịa niile, ndị ahụ niile so unu si nʼụgbọ mmiri pụta, bụ ihe niile nwere ndụ nʼụwa.
11 Estableceré, pues, mi Pacto con ustedes: Ya no será aniquilada alguna carne por las aguas del diluvio. Ya no habrá diluvio para destruir la tierra.
Ebe ọ bụ na m ehiwela ọgbụgba ndụ m nʼetiti mụ na unu, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri kpochapụ ihe niile e kere eke, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri bibie ụwa.”
12 Y ʼElohim dijo: Les doy esta señal del Pacto entre Yo y ustedes y todo ser viviente que está con ustedes, por generaciones perpetuas:
Chineke kwuru sị, “Nke a bụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ nke m na-etinye nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti ihe niile nwere ndụ so unu, ọgbụgba ndụ nke ga-adị nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu.
13 Pondré mi arco en las nubes y será la señal del Pacto entre Yo y la tierra.
Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa.
14 Pues sucederá que cuando Yo cubra la tierra con nubes, entonces aparecerá el arco en las nubes,
Mgbe ọbụla m zitere igwe ojii nʼụwa, ọ bụrụ na eke na egwurugwu apụta ìhè na mbara eluigwe,
15 y me acordaré de mi Pacto entre Yo y ustedes y todo ser viviente de toda carne. No habrá más aguas de diluvio para destruir a todo ser vivo.
aga m echeta ọgbụgba ndụ m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke. Ọ gaghị emekwa ọzọ na mmiri ga-aghọ uju mmiri ibibi ihe niile nwere ndụ.
16 Cuando el arco aparezca en las nubes, lo miraré para recordar el Pacto eterno entre ʼElohim y todo ser viviente de toda carne que está sobre la tierra.
Mgbe ọbụla eke na egwurugwu pụtara nʼigwe ojii, aga m ahụ ya cheta ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke dị nʼetiti Chineke na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke nọ nʼelu ụwa.”
17 Luego ʼElohim dijo a Noé: Esta es la señal del Pacto que establezco entre Yo y toda carne que hay sobre la tierra.
Chineke gwara Noa sị, “Nke a bụ ihe ama ọgbụgba ndụ ahụ m hiwere nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ nʼụwa.”
18 Los hijos de Noé que salieron del arca fueron Sem, Cam y Jafet (y Cam es el padre de Canaán).
Ụmụ ndị ikom Noa ndị si nʼụgbọ mmiri pụta bụ Shem, Ham na Jafet. (Ham bụ nna Kenan.)
19 Estos tres fueron los hijos de Noé, y de éstos fue poblada toda la tierra.
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ọ bụ site na ha ka ndị mmadụ niile gbasara nʼụwa niile si pụta.
20 Noé comenzó a labrar la tierra y plantó una viña.
Noa, onye ọrụ ubi, bidoro ịkụ ubi vaịnị a gbara ogige.
21 Bebió vino, se embriagó y se desnudó dentro de su tienda.
Mgbe ọ ṅụrụ mmanya si nʼubi a, ṅụbiga ya oke, ọ gbaara ọtọ dinaa ala nʼime ụlọ ikwu ya.
22 Cam, padre de Canaán, vio la desnudez de su padre y lo declaró afuera a sus dos hermanos.
Ham, nna Kenan, hụrụ ọtọ nna ya, gaa kọọrọ ụmụnne ya abụọ nọ nʼezi ihe ọ hụrụ.
23 Entonces Sem y Jafet tomaron la ropa y se la pusieron ambos sobre sus hombros. Caminaron hacia atrás y cubrieron la desnudez de su padre. Sus rostros estaban vueltos hacia atrás y no vieron la desnudez de su padre.
Ma Shem na Jafet weere akwa tụkwasị nʼubu ha, were azụ jere ije ruo nʼebe nna ha nọ, hapụ akwa ahụ ka ọ dakwasị nna ha kpuchikwaa ọtọ ya. Ma ha chepuru ihu nʼebe ọzọ mgbe ha na-eme nke a, nʼihi ya, ha elekwasịghị ọtọ nna ha anya.
24 Al despertar de su embriaguez, Noé supo lo que le hizo su hijo menor
Mgbe Noa si nʼụra mmanya ya bilie, chọpụta ihe nwa ya nwoke nke nta mere,
25 y dijo: Maldito sea Canaán. Será esclavo de los esclavos de sus hermanos.
o kwuru sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka Kenan bụ! Ohu ndị ohu, ka ọ ga-abụrụ ụmụnne ya.”
26 Luego dijo: Bendito sea Yavé, ʼElohim de Sem, Y sea Canaán su esclavo.
Ọ sịkwara, “Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke Shem. Ka Kenan bụrụ ohu Shem.
27 Ensanche ʼElohim a Jafet, Y viva en las tiendas de Sem Y sea Canaán su esclavo.
Ka Chineke mee ka ebe obibi Jafet saa mbara, ka Jafet biri nʼụlọ ikwu Shem, meekwa ka Kenan bụrụ ohu ya.”
28 Noé vivió 350 años después del diluvio.
Mgbe uju mmiri ahụ gabigachara, Noa biri ndụ narị afọ atọ na iri afọ ise ọzọ.
29 Los días de Noé fueron 950 años, y murió.
Ọnụọgụgụ afọ Noa niile mgbe ọ nwụrụ, bụ narị afọ itoolu na iri afọ ise.

< Génesis 9 >