< Salmos 23 >

1 Un salmo de David. Yahvé es mi pastor; No me faltará nada.
Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.
2 Me hace descansar en verdes praderas. Me conduce junto a aguas tranquilas.
Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,
3 Él restaura mi alma. Me guía por las sendas de la justicia por amor a su nombre.
ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya.
4 Aunque camine por el valle de la sombra de la muerte, No temeré ningún mal, porque tú estás conmigo. Tu vara y tu cayado, me reconfortan.
A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi.
5 Preparas una mesa ante mí en presencia de mis enemigos. Unges mi cabeza con aceite. Mi copa se llena.
Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke.
6 Ciertamente la bondad y el amor me seguirán todos los días de mi vida, y habitaré en la casa de Yahvé para siempre.
Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi.

< Salmos 23 >