< Job 31 >

1 “Hice un pacto con mis ojos; ¿cómo debería entonces mirar con lujuria a una mujer joven?
“Mụ na anya m gbara ndụ kpebie na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.
2 Porque lo que es la porción de Dios en lo alto, y la herencia del Todopoderoso en las alturas?
Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu; gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu?
3 ¿No es una calamidad para los injustos, y el desastre a los obreros de la iniquidad?
Ọ bụghị mbibi nye ndị ajọ omume, nhụju anya nye ndị na-eme ihe ọjọọ?
4 No ve mis caminos, y contar todos mis pasos?
Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile, gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ?
5 “Si he andado con falsedad, y mi pie se ha apresurado a engañar
“Ọ bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụgha maọbụ na ụkwụ m mere ngwangwa gbasoro ụzọ aghụghọ,
6 (que me pesen en una balanza uniforme, para que Dios conozca mi integridad);
ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m, ọ ga-amata na m bụ onye na-enweghị ịta ụta.
7 si mi paso se ha desviado del camino, si mi corazón caminara tras mis ojos, si alguna mancha se ha pegado a mis manos,
Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya, ọ bụrụ anya m na-edu obi m, ma ọ bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ,
8 entonces déjame sembrar, y que otro coma. Sí, que el producto de mi campo sea desarraigado.
ọ bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi, ka e hopuchakwa ihe niile m kụrụ nʼubi.
9 “Si mi corazón ha sido seducido por una mujer, y he esperado en la puerta de mi vecino,
“Ọ bụrụ na ọ gụọla obi m agụụ ijekwuru nwanyị ọzọ, maọbụ na m ezoola nʼọnụ ụzọ onye agbataobi m,
10 que muela para otro mi mujer, y otros se encorven sobre ella.
mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri, ka ndị ikom ọzọ dinaa ya.
11 Porque eso sería un crimen atroz. Sí, sería una iniquidad ser castigado por los jueces,
Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere, bụrụkwa mmehie kwesiri ka e kpee ya ikpe.
12 porque es un fuego que consume hasta la destrucción, y que me arrancaría de raíz todo mi aumento.
Ọ bụ ọkụ na-ere ruo nʼebe ịla nʼiyi; nke pụrụ ihopu ihe owuwe ubi m niile.
13 “Si he despreciado la causa de mi siervo o de mi sirvienta, cuando contendían conmigo,
“Ọ bụrụ na m jụrụ ikpe ikpe ziri ezi nye nwoke maọbụ nwanyị ọbụla na-ejere m ozi mgbe ha nwere mkpesa megide m,
14 ¿Qué haré entonces cuando Dios se levante? Cuando me visite, ¿qué le responderé?
gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m? Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ jụrụ m ajụjụ?
15 ¿Acaso no lo hizo el que me hizo en el vientre? ¿No se nos formó en el vientre materno?
Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha? Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị?
16 “Si he retenido a los pobres de su deseo, o han hecho fallar los ojos de la viuda,
“Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa, ma ọ bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi,
17 o haber comido mi bocado solo, y el huérfano no ha comido de ella
ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m, ma jụ inye ya ụmụ mgbei;
18 (no, desde mi juventud creció conmigo como con un padre, La he guiado desde el vientre de mi madre);
ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri, ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ.
19 si he visto a alguno perecer por falta de ropa, o que los necesitados no tenían cobertura;
Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa, maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe,
20 si su corazón no me ha bendecido, si no se ha calentado con el vellón de mi oveja;
ma obi ha agọzighị m nʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya.
21 si he levantado mi mano contra los huérfanos, porque vi mi ayuda en la puerta;
Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ, nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe,
22 entonces dejé caer mi hombro desde el omóplato, y que mi brazo se rompa desde el hueso.
mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ, ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya.
23 Porque la calamidad de Dios es un terror para mí. Por su majestad, no puedo hacer nada.
Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke, nʼihi egwu ebube ya, enweghị m ike ime ihe ndị a.
24 “Si he hecho del oro mi esperanza, y han dicho al oro fino: “Tú eres mi confianza”.
“Ọ bụrụ na ntụkwasị obi m dị nʼọlaedo, maọbụ na m sị ọlaedo a nụchara anụcha, ‘Ị bụ ebe ndabere m.’
25 Si me he alegrado porque mi riqueza era grande, y porque mi mano se había vuelto mucho;
Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi oke akụ m, ihe nnweta nke aka m ritere nʼuru,
26 si he visto el sol cuando brillaba, o la luna moviéndose con esplendor,
ọ bụrụ na m legidere anyanwụ anya nʼebube ya, maọbụ ọnwa nʼike nchawa ya,
27 y mi corazón ha sido seducido en secreto, y mi mano lanzó un beso de mi boca;
nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo, maọbụ aka m abụrụ ihe e weliri ife ha ofufe,
28 esto también sería una iniquidad que sería castigada por los jueces, porque habría negado al Dios que está arriba.
mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe, nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu.
29 “Si me he alegrado de la destrucción del que me odiaba, o me levanté cuando el mal lo encontró
“Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m maọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya,
30 (Ciertamente no he permitido que mi boca peque pidiendo su vida con una maldición);
ekwebeghị m ka ọnụ m mehie megide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ.
31 si los hombres de mi tienda no han dicho, ¿Quién puede encontrar a alguien que no se haya saciado con su carne?
Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị. ‘Onye ka ọ bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?’
32 (el extranjero no ha acampado en la calle, pero he abierto mis puertas al viajero);
Ma ọ dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama, nʼihi ụzọ m na-eghe oghe mgbe ọbụla nye ndị ije.
33 si como Adán he cubierto mis transgresiones, ocultando mi iniquidad en mi corazón,
Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ, site nʼizobe mmehie m nʼime obi m,
34 porque temía a la gran multitud, y el desprecio de las familias me aterrorizó, así que guardé silencio, y no salí de la puerta...
nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ, si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche, nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi.
35 ¡ojalá tuviera uno que me escuchara! ¡He aquí mi firma! ¡Que el Todopoderoso me responda! ¡Que el acusador escriba mi acusación!
(“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị! Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m, ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ.
36 Seguramente lo llevaría al hombro, y lo ataría a mí como una corona.
Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m, aga m eyinyekwa ya dịka okpueze.
37 Yo le declararía el número de mis pasos. Me acercaría a él como un príncipe.
Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile, aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.)
38 Si mi tierra grita contra mí, y sus surcos lloran juntos;
“Ọ bụrụ na ala m etie mkpu megide m, ọ bụrụ na olulu dị na ya ejupụta nʼanya mmiri,
39 si he comido sus frutos sin dinero, o han hecho que sus propietarios pierdan la vida,
ọ bụrụ na m eripịa ihe o mepụtara na-akwụghị ụgwọ, maọbụ mee ka mmụọ ndị bi nʼime ya daa mba,
40 deja que los cardoscrezcan en lugar del trigo, y stinkweed en lugar de cebada”. Las palabras de Job han terminado.
ka ogwu pupụta nʼọnọdụ ọka wiiti, ka ahịhịa na-esi isi ọjọọ pupụtakwa nʼọnọdụ ọka balị.” Okwu Job agwụla.

< Job 31 >