< Isaías 44 >

1 Pero escucha ahora, Jacob, mi siervo, e Israel, a quienes he elegido.
“Ma ugbu a, gee ntị gị Jekọb, bụ ohu m, geekwanụ ntị, unu ndị Izrel m họpụtara.
2 Esto es lo que hace el Señor que te hizo, y te formó desde el vientre materno, que te ayudará dice: “No tengas miedo, Jacobo, mi siervo; y tú, Jeshurun, a quien he elegido.
Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, bụ onye kere unu, onye kpụrụ unu nʼime nʼafọ, na onye ga-enyere unu aka: Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, atụkwala egwu gị Jeshurun, onye nke m họpụtara.
3 Porque derramaré agua sobre el sediento, y arroyos en la tierra seca. Derramaré mi Espíritu sobre tus descendientes, y mi bendición sobre tu descendencia;
Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri, mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ. Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m, meekwa ka ngọzị m dịrị ha.
4 y brotarán entre la hierba, como sauces junto a los cursos de agua.
Ha ga-etopụta etopụta dịka ahịhịa a gbara mmiri, e, dịka osisi pọpla nʼakụkụ iyi jupụtara na mmiri.
5 Uno dirá: “Yo soy de Yahvé”. Otro será llamado con el nombre de Jacob; y otro escribirá con su mano ‘a Yahvé’. y honrar el nombre de Israel”.
Ha ga-eji nganga sị, ‘Abụ m nke Onyenwe anyị,’ maọbụ ‘Abụ m nwa nwa Jekọb,’ ebe ndị ọzọ ga-edepụta nʼaka ha, ‘Nke Onyenwe anyị ka m bụ,’ ha ga-agụkwa onwe ha Izrel.
6 Esto es lo que Yahvé, el Rey de Israel, y su Redentor, Yahvé de los Ejércitos, dice: “Soy el primero y soy el último; y además de mí no hay Dios.
“Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, onye bụ Eze Izrel na Onye mgbapụta ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile: Mụ onwe bụ Mmalite na Ọgwụgwụ; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ewezuga m.
7 ¿Quién es como yo? Quién llamará, y lo declarará, y ponerlo en orden para mí, desde que establecí el pueblo antiguo? Que declaren las cosas que vienen, y eso sucederá.
Ọ bụkwa onye dị ka m? Ya kwupụta ya. Ya kwupụta ya, doo ya nʼusoro ka ntị nụrụ! Ya kwupụta ihe niile mere kemgbe m mere ka ndị m guzosie ike. Ya kwupụtakwa, ma dokwaa ha nʼusoro, ihe niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu.
8 No temas, ni tener miedo. ¿No te lo declaré hace tiempo? y se lo mostraron? Ustedes son mis testigos. ¿Existe un Dios aparte de mí? De hecho, no lo hay. No conozco ninguna otra Roca”.
Unu atụla egwu. Unu amakwala jijiji. Ọ bụ na m akọpụtaghị ihe ndị a ma kwupụta ha nʼoge gara aga. Unu onwe unu bụ ndị akaebe m. Ọ dị chi ọzọ dị ma e wezuga m? Mba! O nweghị Oke nkume ọzọ dị, nke m maara ihe banyere ya.”
9 Todo el que hace una imagen tallada es vano. Las cosas en las que se deleitan no serán de provecho. Sus propios testigos no ven, ni saben, que pueden ser decepcionados.
Ndị a niile na-apị arụsị bụ ndị nzuzu. Chi ndị ahụ niile ha na-agụ dị ka ihe ukwu bụkwa ihe na-enweghị isi. Ndị niile na-akpọ isiala nye chi ndị a bụ ndị kpuru ìsì, na ndị amamihe kọrọ, ndị ihere ga-emekwa.
10 Que ha creado un dios, o moldea una imagen que es rentable para nada?
Ọ baghị uru mmadụ ịkpụrụ onwe ya arụsị maọbụ chi a pịrị apị, nke na-apụghị inyere ya aka nʼụzọ ọbụla?
11 He aquí que todos sus compañeros se verán defraudados; y los obreros son simples hombres. Que se reúnan todos. Que se pongan de pie. Tendrán miedo. Se pondrán en evidencia juntos.
Lee ihere ga-eme ndị niile na-akpọ isiala nye ya. Ndị kpụrụ ha bụ naanị ndị mmadụ. Ka ha niile chịkọta onwe ha, guzo, nwee mkpebi ha, ha ga-anọ nʼọnọdụ nʼihere, na nʼoke egwu.
12 El herrero toma un hacha, trabaja en las brasas, lo hace con martillos, y lo trabaja con su fuerte brazo. Tiene hambre, y le fallan las fuerzas; no bebe agua, y es débil.
Ọkpụ ụzụ na-ewere ngwa ọrụ ya na-ahụ ya nʼime icheku ọkụ, ọ na-eji mkpirisi igwe onye ọka tipịa ya nʼụdịdị arụsị, ọ bụ ike nke ogwe aka ya ka o ji akpụ ụzụ. Agụ na-agụ ya, ike na-agwụsịkwa ya; ọ ṅụghị mmiri ọbụla, ọ na-adakwa mba.
13 El carpintero extiende una línea. Lo marca con un lápiz. Le da forma con planos. Lo marca con brújulas, y le da la forma de la figura de un hombre, con la belleza de un hombre, residir en una casa.
Onye ọka osisi na-esite nʼeriri ọtụtụ tụpụta osisi were pensụlụ kaa ya; ọ na-ewere ngwa ọrụ ya kpụchaa osisi ahụ, were ngwa ọrụ ịka akara, kaa ya akara. Ọ na-arụ ya dịka oyiyi mmadụ, oyiyi mmadụ nʼịma mma ya niile, maka ibi nʼime ụlọ arụsị.
14 Corta cedros para sí mismo, y toma el ciprés y el roble, y fortalece para sí uno entre los árboles del bosque. Planta un ciprés, y la lluvia la alimenta.
Ọ na-egbutu osisi sida dị iche iche, maọbụ osisi saipres ma ọ bụkwa osisi ook. Ọ na-ahapụ ya ka o too nʼetiti osisi dị iche iche nke oke ọhịa, maọbụ kụọ osisi fịa, nke mmiri ozuzo na-eme ka o too nke ọma.
15 Entonces será para un hombre que se queme; y toma un poco de ella y se calienta. Sí, lo quema y hornea el pan. Sí, hace un dios y lo adora; lo convierte en una imagen tallada, y cae ante ella.
Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere; ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ, ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha. Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya; ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya.
16 Quema una parte en el fuego. Con parte de ella, come carne. Asa un asado y queda satisfecho. Sí, se calienta y dice: “¡Ah! Estoy caliente. He visto el fuego”.
Ọkara nʼime osisi ndị a ka o ji emenwu ọkụ; nʼelu ya kwa ka ọ na-esi nri ya, ọ na-ahụnye anụ, were tajuo afọ ya. Nkụ ahụ ka o ji anya ọkụ na-asị, “Ahaa, ahụ ekpola m ọkụ; ahụla m ọkụ.”
17 El resto lo convierte en un dios, incluso su imagen grabada. Se inclina ante ella y la adora, y le reza, y dice: “¡Libérame, porque tú eres mi dios!”
Ihe fọdụrụ nʼime osisi ahụ ka ọ na-ewere kwaara onwe ya arụsị a pịrị apị; Ọ na-ada nʼala nʼihu ya, fee ya ofufe. Ọ na-ekpekwara ya ekpere na-asị, “Biko, Zọpụta m, nʼihi na chi m ka ị bụ!”
18 No lo saben, ni lo consideran, porque les ha cerrado los ojos, para que no puedan ver, y sus corazones, que no pueden entender.
Ha amaghị ihe ọbụla; ha adịghị aghọtakwa, nʼihi na-emechiela anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ, mechiekwa uche ha, ka ha ghara ịghọta.
19 Nadie piensa, ni hay conocimiento ni entendimiento para decir, “He quemado una parte en el fuego. Sí, también he horneado pan en sus brasas. He asado carne y la he comido. ¿Debo convertir el resto en una abominación? ¿Debo inclinarme ante un tronco de árbol?”
Ọ dịghị onye na-anọdụ chee echiche, ọ dịghịkwa onye nwere ihe ọmụma maọbụ nghọta ị sị, “Ụfọdụ nʼime osisi a ka m ji kwanye ọkụ, Ọ bụladị ghee achịcha nʼelu icheku ọkụ ya, ejikwa m ụfọdụ nʼime ya hụọ anụ m tara. M ga-esite na nke fọdụrụ mepụta ihe rụrụ arụ? Ọ bụ ogwe osisi ka m ga-akpọ isiala nye?”
20 Se alimenta de cenizas. Un corazón engañado lo ha desviado; y no puede entregar su alma, ni decir: “¿No hay una mentira en mi mano derecha?”
Onye na-adịghị eche ụdị echiche a bụ onye nzuzu, nke na-eji ntụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-azụ onwe ya. Ọ pụghị ịnapụta onwe ya, maọbụ jụọ onwe ya ajụjụ sị, “Ihe a m ji nʼaka m, nke m na-akpọ chi, ọ bụghị okwu ụgha ka ọ bụ?”
21 Recuerda estas cosas, Jacob e Israel, porque eres mi siervo. Yo te he formado. Eres mi sirviente. Israel, no serás olvidado por mí.
“Cheta ihe ndị a, gị Jekọb, nʼihi na gị bụ Izrel, ị bụ ohu m. Ọ bụ m kpụrụ gị, ị bụ ohu m; gị bụ Izrel, agaghị m echezọ gị.
22 He borrado, como una nube espesa, tus transgresiones, y, como una nube, tus pecados. Vuelve a mí, porque te he redimido.
Ehichapụla m njehie gị niile; dịka igwe ojii, hichapụkwa mmehie gị dịka igirigi ụtụtụ. Lọghachikwute m, nʼihi na akwụọla m ụgwọ ịgbapụta gị.”
23 ¡Cantad, cielos, porque Yahvé lo ha hecho! ¡Gritad, partes bajas de la tierra! Rompan a cantar, ustedes montañas, oh bosque, todos sus árboles, porque Yahvé ha redimido a Jacob, y se glorificará en Israel.
Bụọnụ abụ oke ọṅụ, unu eluigwe, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ya; tienụ oke mkpu, unu ụwa dị nʼala. Tienụ mkpu ọṅụ, unu ugwu niile, unu bụ oke ọhịa niile na osisi ọbụla nke dị nʼime gị, nʼihi na Onyenwe anyị agbapụtala Jekọb, na-egosikwa ebube ya nʼIzrel.
24 Yahvé, tu Redentor, y el que te formó desde el vientre materno dice: “Yo soy Yahvé, que hace todas las cosas; que es el único que extiende los cielos; que extienda la tierra por mí mismo;
“Otu a, Onyenwe anyị na-ekwu, Onye mgbapụta unu, onye ahụ kpụrụ unu nʼime afọ: Mụ onwe bụ Onyenwe anyị, Onye kere ihe niile, onye gbatipụrụ eluigwe, onye gbasara ụwa naanị mụ onwe m,
25 que frustra las señales de los mentirosos, y vuelve locos a los adivinos; que hace retroceder a los sabios, y hace que su conocimiento sea tonto;
onye na-emebi ihe ịrịbama niile nke ndị amụma ụgha na-emekwa ka ndị na-ajụta ase ghọọ ndị nzuzu, onye na-ekpu ihe ọmụmụ ndị maara ihe ihu nʼala tụgharịa ya, ha ghọọ ihe nzuzu,
26 que confirma la palabra de su siervo, y realiza el consejo de sus mensajeros; que dice de Jerusalén: “Estará habitada”. y de las ciudades de Judá: “Serán construidas”. y “levantaré sus despojos”.
onye na-eme ka okwu ndị ohu ya mezuo meekwa ka amụma ndị ozi ya buru mezuo, onye na-asị banyere Jerusalem, ‘A ga-ebikwa nʼime ya ọzọ,’ na-asịkwa banyere obodo niile nke Juda, ‘A ga-ewughachi ha,’ banyere mkpọmkpọ ebe ha niile, ‘Aga m ewulikwa ha.’
27 que dice a las profundidades: “Sécate”. y “secaré tus ríos”.
Onye ahụ na-asị, ogbu mmiri, ‘Takọrọ, aga m emekwa ka iyi ya niile takọrọsịa,’
28 que dice de Ciro: “Él es mi pastor y cumplirá todo lo que yo quiera”. incluso diciendo de Jerusalén, ‘Ella será construida;’ y del templo: “Se pondrán sus cimientos””.
Onye na-asị banyere Sairọs, ‘Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m, ọ ga-emezukwa ihe niile na-adị m mma; Ọ ga-asịkwa banyere Jerusalem, “Ka ewugharịa ya,” ma banyere ụlọnsọ, “Ka ehiwe ntọala ya.”’

< Isaías 44 >